LUK 6:38 |
nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa ókè, ka ha gēnye n'obi-unu. N'ihi na ihe unu ji tù ihe ka agēji tùkwara unu ọzọ. |
|
MATIU 5:4 |
Ngọzi nādiri ndi nēru újú: n'ihi na ndi ahu ka agākasì obi. |
|
FILIPAI 4:19 |
Ma Chinekem gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika àkù-Ya n'ebube si di, nime Kraist Jisus. |
|
ABÙ ỌMA 67:7 |
Chineke gāgọzi ayi; Nsọtu nile nke uwa gātu kwa egwu Ya. |
|
ỌNU-ỌGUGU 6:24-25 |
[24] Jehova gọzie gi, debe gi:[25] Jehova me iru-Ya ka ọ mukwasi gi, Jehova me-kwa-ra gi amara: |
|
FILIPAI 4:6-7 |
[6] Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ.[7] Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus. |
|
JEMES 1:17 |
Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta. |
|
JEREMAIA 17:7-8 |
[7] Onye agọziri agọzi ka nwoke ahu bu nke nātukwasi Jehova obi, onye Jehova bu ihe-ntukwasi-obi-ya.[8] Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku miri, ọ bu kwa n'akuku osimiri ka ọ nāwasa nkpọrọgwu-ya, ọ dighi-atu kwa egwu mb͕e okpom-ọku nābia, ma akwukwọ-ya gābu akwukwọ ndu; ọzọ, n'arọ nb͕ochi miri-ozuzo ọ gaghi-echeb͕u onwe-ya, ọ gaghi-apu kwa n'imì nkpuru. |
|
AISAIA 41:10 |
atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi. |
|
JỌN 1:16 |
N'ihi na site na njuputa-Ya ka ayi onwe-ayi nile natara, ọbuná amara nēsochi amara. |
|
JENESIS 22:16-17 |
[16] si, Ejim Onwem ṅu iyi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na n'ihi na i mewo ihe a, n'ihi na i b͕ochighi kwa nwa-gi nwoke, onye i nwere nání ya:[17] na n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, na dika ájá nke di n'usọ oké osimiri; nkpuru-gi gēnweta kwa ọnu-uzọ-ama nke ndiroya; |
|
JENESIS 27:28-29 |
[28] Ka Chineke nye gi ufọdu nime igirigi elu-igwe, Na ufọdu nime ebe di urù nke ala, Na ọka na manya-vine ọhu ri nne:[29] Ka ndi di iche iche fè gi, Ka mba di iche iche kpọ isi ala nye gi: Buru onye nwere ike n'aru umunne-gi, Ka umu nke nne-gi kpọ kwa isi ala nye gi: Ka onye ọ bula nke nābu gi ọnu buru onye anābu ọnu, Ka onye ọ bula nke nāgọzi gi buru kwa onye agọziri agọzi. |
|
ABÙ ỌMA 1:1-3 |
[1] Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu, Nke nēguzoghi kwa n'uzọ ndi nmehie, Nke nānọghi kwa n'ọnọdu ndi nākwa emò.[2] Kama n'iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di; Ọ bu kwa n'iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali.[3] Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma. |
|
ABÙ ỌMA 23:1-4 |
[1] Jehova bu onye nāzùm dika aturu; ó dighi ihe kọrọm.[2] N'ebe-ita-nri nke ahihia ndu ka O nēme ka m'makpu: N'akuku miri nke izu-ike ka Ọ nedum nwayo.[3] Ọ nēweghachi nkpuru-obim: Ọ nēdum n'uzọ nile nke ezi omume n'ihi aha-Ya.[4] Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, M'gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n'ihi na Gi onwe-gi nọyerem: Ndele-Gi na nkpa-n'aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi. |
|
2 SAMUEL 22:3-4 |
[3] Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam; Onye-nzọputam, I nāzọputam n'ihe-ike.[4] Onye-anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova, Ewe zọputam n'aka ndi-irom. |
|
1 JỌN 5:18 |
Ayi matara na onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-emehie; kama Onye ahu Nke amuru Ya site na Chineke nēdebe ya, ajọ onye ahu adighi-emetu kwa ya aka. |
|
ABÙ ỌMA 138:7 |
Ọ buru na ejeghariam n'etiti ahuhu, I gēme ka m'di ndu; I gēseti aka-Gi imegide iwe ndi-irom, Aka-nri-Gi gāzọputakwam. |
|
2 KỌRINT 9:8 |
Ma Chineke puru ime ka amara nile babigara unu ókè; ka unu we babiga ókè ilu ezi ọlu nile ọ bula, ebe unu nwezuru ihe nile nākpa unu n'uzọ ọ bula mb͕e nile: |
|
FILIPAI 4:7 |
Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus. |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |