A A A A A

Mmehie: [Gluttony]


1 KỌRINT 6:12
Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem.

1 KỌRINT 10:7
Unu aghọ-kwa-la ndi nēkpere arusi, dika ufọdu n'etiti ha ghọrọ; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi Israel nọduru ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú.

1 KỌRINT 15:32
Ọ buru na abumri onye nālu ọ̀gù megide anu-ọhia n'Efesọs dika madu si eme, ùrù gini baram? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.

DEUTERONOMI 21:20
ha gāsi kwa ndi-okenye obodo-ya, Nwa-ayi nka nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, ọ dighi-ege nti n'olu-ayi; ọ bu onye-nmefu, na onye nāṅubiga manya okè.

EZIKIEL 16:49
Le, nka bu ajọ omume nke Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi; npako, na afọ ojuju nri, na udo nke inọ-jū, diri ya na umu-ya ndinyom; ma o meghi ka aka nke onye ewedara n'ala na ob͕eye di ike.

JENESIS 3:6
Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie.

FILIPAI 3:19
ndi ọgwugwu-ha bu ila-n'iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n'ihere-ha, ndi nātukwasi uche n'ihe uwa.

ILU 23:2
Tukwasi kwa mma n'akpiri-gi, Ma ọ buru na onye nri-ya nātọ ya utọ ka i bu.

ILU 23:21
N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile: Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.

ILU 28:7
Onye nēdebe iwu bu nwa nāghọta ihe: Ma onye bu eyì ndi nēribiga ihe ókè nētiye nna-ya n'onọdu-ihere.

ABÙ ỌMA 119:70
Obi-ha bu nání abuba dika abuba; Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku.

ROM 13:14
Kama yikwasinu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, unu ebu-kwa-la uzọ nēchère aru, ime ihe ọjọ nāgu ya.

TAITỌS 1:12
Otù onye n'etiti ha, bú onye-amuma nke aka ha, siri, Ndi Krit bu ndi-ugha mb͕e dum, anu-ọhia jọrọ njọ, ndi afọ-nri nādighi-alu ọlu.

ILU 23:20-21
[20] Anọla n'etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè; N'etiti ndi nēribiga anu ókè:[21] N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile: Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.

1 KỌRINT 6:19-20
[19] Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;[20] n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.

ABÙ ỌMA 115:4-8
[4] Arusi nile ha bu ọla-ọcha na ọla-edo, Ọlu aka madu.[5] Ha nwere ọnu, ma ha adighi-ekwu okwu; Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;[6] Ha nwere nti abua, ma ha adighi-anu ihe; Ha nwere imi, ma ha adighi-anuta ísì;[7] Ha nwere aka-ha abua, ma ha adighi-ebitu ihe; Ha nwere ukwu-ha abua, ma ha adighi-eje ije; Ha adighi-ewere akpiri-ha me uṅara.[8] Ndi nēme ha gādi ka ha: E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.

ROM 14:13-17
[13] Ya mere ka ayi ghara ikperita ibe-ayi ikpé ọzọ: ma kama ya kpenu ikpé a, ka onye ọ bula ghara idebe ihe-isu-ngọngọ, ma-ọbu ọnyà, n'uzọ nwa-nna-ya.[14] Amataram, eme-kwa-ra ka m'kweye nime Onye-nwe-ayi Jisus, na ọ dighi ihe ruru árú site n'onwe-ya: ọ bu nání n'ebe ọ nọ, bú onye nāgu ihe ọ bula na ọ ruru árú, n'ebe onye ahu nọ ka ọ ruru árú.[15] N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya.[16] Ya mere unu ekwela ka ekwulu ezi ihe-unu:[17] n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ.

ABÙ ỌMA 78:26-31
[26] O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe: O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida.[27] O we me ka anu zokwasi ha dika ájá, Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù:[28] O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha, Buruburu ebe-obibi-ha nile.[29] Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku; Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru.[30] Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di, Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu,[31] Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha, We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba, Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala.

2 TIMỌTI 3:1-9
[1] Ma mara nka, na oge di oké egwu gābia na mb͕e ikpe-azu.[2] N'ihi na madu gābu ndi nāhu nání onwe-ha n'anya, ndi nāhu ego n'anya, ndi nānya isi, ndi-npako, ndi-nkwulu, ndi nēkweyeghi ndi muru ha, ndi nēnweghi ekele, ndi nādighi ọcha n'obi,[3] ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nādighi-ab͕a ndu, ndi nēbo ebubo ugha, ndi nādighi-ejide onwe-ha, ndi di ka anu-ọhia, ndi nādighi-ahu ezi ihe n'anya,[4] ndi nārara madu nye n'aka ndi-iro-ha, ndi-isi-ike, ndi afuliworo elu, ndi nāhu ihe-utọ n'anya kama ihu Chineke n'anya;[5] ndi nēnwe udi nke nsọpuru-Chineke, ma ha agọwo ike-ya: gi b͕akuta kwa ndia azu.[6] N'ihi na ha sitere na ndia, bú ndi nēb͕ebà nime ulo di iche iche, nādọta kwa ndinyom nēnweghi uche n'agha, bú ndi ekpokwasiworo ha nmehie, ndi agu ihe ọjọ di iche iche dufuworo,[7] ndi nāmu ihe mb͕e nile, ma ha apughi ibiaru imazu ezi-okwu mb͕e ọ bula.[8] Ma otù uzọ ahu Janis na Jambris guzogidere Moses, otú a ka ndia nēguzogide kwa ezi-okwu ahu; bú madu ndi mebiworo n'uche, ndi ajuru aju n'ihe bayere okwukwe-ayi.[9] Ma ha agaghi-aga n'iru kari: n'ihi na enweghi-uche-ha gāputasi ìhè nye madu nile, dika enweghi-uche nke ndi ahu putakwara.

ỌNU-ỌGUGU 11:18-34
[18] Gi si kwa ndi Israel, Do onwe-unu nsọ bayere echi, unu gēri kwa anu: n'ihi na unu akwawo ákwá na nti Jehova, si, Ònye gēme ka ayi rie anu? n'ihi na ọ diri ayi nma n'Ijipt: Jehova gēnye kwa unu anu, unu gēri kwa.[19] Ọ bughi otù ubọchi ka unu gēri anu, ọ bughi ubọchi abua, ọ bughi ubọchi ise, ọ bughi ubọchi iri, ọ bughi orú ubọchi;[20] rue otù ọnwa zuru ezù, rue mb͕e o gēsi n'imi-unu puta, ọ we ghọrọ unu ihe-isọ-oyi: n'ihi na unu ajuwo Jehova Nke nọ n'etiti unu, unu we kwa ákwá n'iru Ya, si, N'ìhi gini kwa ka ayi siworo n'Ijipt puta?[21] Moses we si, Orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na orú nnù uzọ iri-na-ise ndi ji ukwu eje ka ndi ahu di, bú ndi mu onwem nọ n'etiti ha: ma Gi onwe-gi asiwo, Anu ka M'gēnye ha, ka ha we rie otù ọnwa zuru ezù.[22] Ọ̀ bu ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi ka agēb͕uru ha, ka o we zue ha? ọ̀ bu azù nile nke oké osimiri ka agāchikọtara ha, ka o we zue ha?[23] Jehova we si Moses, Aka Jehova, ọ̀ ghọwo nkpunkpu aka? ub͕u a ka i gāhu ma okwum gērere gi ma-ọbu na ọ gaghi-ere.[24] Moses we pua, gwa ndi Israel okwu nile nke Jehova: o we chikọta ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye nke ndi Israel, guzo ha buruburu Ulo-ikwū ahu.[25] Jehova we ridata n'igwe-oji ahu, gwa ya okwu, nara ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasiri ya, tiyekwasi n'ọgu ndi-okenye atọ na iri ahu: o rue, mb͕e Mọ ahu bekwasiri ha, na ha buru amuma, ma ha emeghi ya ọzọ.[26] Ma ndikom abua fọduru n'ọmuma-ulo-ikwū, aha nke otù onye nime ha bu Eldad, aha nke ibe-ya bu Midad: Mọ ahu we bekwasi ha; ha onwe-ha di kwa n'etiti ndi edere aha-ha n'akwukwọ, ma ha apughi jerue Ulo-ikwū ahu: ha we bū amuma n'ọmuma-ulo-ikwū.[27] Otù okorọbia we b͕a ọsọ, gosi Moses, si, Eldad na Midad nēbu amuma n'ọmuma-ulo-ikwū.[28] Joshua nwa Nun, onye nējere Moses ozi, bú otù onye nime ndikom-ya arọputaworo, we za, si, Onye-nwem Moses, b͕ochie ha.[29] Moses we si ya, Ọ̀ bu onye nēkwo ekworo ka i burum? ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi Jehova nile bu ndi-amuma ka Jehova we tiyekwasi ha Mọ-Ya![30] Moses, ya na ndi-okenye Israel, we chikọta onwe-ha n'ọmuma-ulo-ikwū.[31] Otù ifufe we si n'ebe Jehova nọ bulie ije, we keputa nnunu quail n'oké osimiri, rapu ha n'akuku ọmuma-ulo-ikwū, dika ije otù ubọchi n'otù akuku, na dika ije otù ubọchi n'akuku. nke-ọzọ, buruburu ọmuma-ulo-ikwū, na dika cubit abua n'elu iru ala.[32] Ndi Israel we bilie ubọchi ahu nile, na abali-ya nile, na echi-ya nile, chikọta nnunu quail ahu: onye nāchikọta ntà chikọtara homer iri: ha we were ha b͕asara onwe-ha n'ebe nile buruburu-ọmuma-ulo-ikwū[33] Mb͕e anu ahu nādi n'etiti ezé-ha ub͕u a, tutu atabie ya, iwe Jehova we di ọku megide ndi Israel, Jehova we were ihe-otiti riri nne nke-uku tie ndi Israel.[34] Ewe kpọ aha ebe ahu Kibrot-hataava: n'ihi na n'ebe ahu ka ha lìri ndi Israel ndi nāchọ ajọ ọchichọ.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006