A A A A A

Mmehie: [Anyaụfụ]


1 KỌRINT १३:४
Ihu-n'anya nwere ogologo-ntachi-obi, o nwe-kwa-ra obi-ọma; ihu-n'anya adighi-ekwo ekworo; ihu-n'anya adighi-anya isi, ọ dighi-afuli onwe-ya elu,

GALETIA 5:26
Ka ayi ghara ighọ ndi nāchọ otuto efu, nāchọrita ibe-ayi okwu, nākpọrita ibe-ayi asì.

JEMES 3:14-16
[14] Ma ọ buru na unu nwere ekworo di ilu na ikpa-iche-iche n'obi-unu, unu anyala isi, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha megide ezi-okwu.[15] Amam-ihe a abughi amam-ihe nke nēsi n'elu ridata, kama ọ bu nke uwa, buru kwa nke nkpuru-obi madu nāchi, buru kwa ihe ndi-mọ ọjọ nēzí.[16] N'ihi na ebe ekworo na ikpa-iche-iche di, n'ebe ahu ka ib͕a-aghara na omume nile ọ bula nke nādighi nma di.

ROM 1:29
ebe ha juputara n'ajọ omume nile, ajọ ọlu, anya-uku, obi ọjọ; juputa kwa n'ekworo, ob͕ub͕u-madu, esem-okwu, aghughọ, uche ọjọ; ndi-ntakwu,

1 PITA 2:1
Ya mere, tupunu ihe ọjọ nile, na aghughọ nile, na iru-abua, na ekworo, na nkwutọ nile di iche iche,

GALETIA 5:19-21
[19] Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko,[20] ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù,[21] ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.

TAITỌS 3:3
N'ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n'oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n'obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì.

1 TIMỌTI 6:4
afuliwo ya elu, ọ dighi ihe ọ mara, kama ọria bayere ajuju na esem-okwu n'ihi okwu efu nāria ya, nke ekworo, esem-okwu, nkwulu, ajọ èchìchè, nēsi nime ha nāputa,

JEMES 3:14-16
[14] Ma ọ buru na unu nwere ekworo di ilu na ikpa-iche-iche n'obi-unu, unu anyala isi, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha megide ezi-okwu.[15] Amam-ihe a abughi amam-ihe nke nēsi n'elu ridata, kama ọ bu nke uwa, buru kwa nke nkpuru-obi madu nāchi, buru kwa ihe ndi-mọ ọjọ nēzí.[16] N'ihi na ebe ekworo na ikpa-iche-iche di, n'ebe ahu ka ib͕a-aghara na omume nile ọ bula nke nādighi nma di.

1 PITA 2:1-2
[1] Ya mere, tupunu ihe ọjọ nile, na aghughọ nile, na iru-abua, na ekworo, na nkwutọ nile di iche iche,[2] dika umu amuru ọhu, ka agu miri-ara nke okwu Chineke, nke aghughọ nādighi ya, nāgusi unu ike, ka unu we were ya nētó etó rue nzọputa;

FILIPAI 1:15
Ọ bu ezie na ufọdu nēkwusa Kraist-ayi ọbuná n'ihi ekworo na esem-okwu; ma ufọdu nēkwusa kwa Ya n'ihi na ọ di ha ezi nma:

1 TIMỌTI 6:4-5
[4] afuliwo ya elu, ọ dighi ihe ọ mara, kama ọria bayere ajuju na esem-okwu n'ihi okwu efu nāria ya, nke ekworo, esem-okwu, nkwulu, ajọ èchìchè, nēsi nime ha nāputa,[5] bú iru-uka nke madu ndi mebiworo n'uche, ndi apunarawo-kwa-ra ha ezi-okwu, ebe ha nāgu na nsọpuru-Chineke bu uzọ irita urù.

ROM 1:28-32
[28] Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi;[29] ebe ha juputara n'ajọ omume nile, ajọ ọlu, anya-uku, obi ọjọ; juputa kwa n'ekworo, ob͕ub͕u-madu, esem-okwu, aghughọ, uche ọjọ; ndi-ntakwu,[30] ndi nēkwutọ madu, ndi nākpọ Chineke asì, ndi nēme madu ihe-ihere, ndi-npako, ndi nānya isi, ndi nāchọputa ihe ọjọ, ndi nēkweyeghi ndi muru ha,[31] Ndi nēnweghi nghọta, ndi nēmebi ọb͕ub͕a-ndu, ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nēnweghi obi-ebere:[32] madu ndi, ọ bu ezie na ha mazuru ihe Chineke guru n'ihe ziri ezi, na ndi nēme ihe di otú a kwesiri ọnwu, ma ọ bughi nání na ha nēme ha, kama ndi nēme ha di kwa ha ezi nma.

GALETIA 5:19-26
[19] Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko,[20] ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù,[21] ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.[22] Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi,[23] idi-nwayọ, imerū-ihe-n'ókè: ọ dighi iwu nēmegide ihe nile di otú a.[24] Ma ndi nke Kraist-ayi Jisus kpọgidere anu-aru-ha n'obe, ya na ọchichọ ọjọ nile na agu ihe ọjọ nile di ya.[25] Ọ buru na ayi di ndu site na Mọ Nsọ, ka ayi nāgazi kwa site na Mọ Nsọ.[26] Ka ayi ghara ighọ ndi nāchọ otuto efu, nāchọrita ibe-ayi okwu, nākpọrita ibe-ayi asì.

JEMES 3:14-15
[14] Ma ọ buru na unu nwere ekworo di ilu na ikpa-iche-iche n'obi-unu, unu anyala isi, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha megide ezi-okwu.[15] Amam-ihe a abughi amam-ihe nke nēsi n'elu ridata, kama ọ bu nke uwa, buru kwa nke nkpuru-obi madu nāchi, buru kwa ihe ndi-mọ ọjọ nēzí.

ILU 14:30
Ndu nke anu-aru ka obi agwọrọ ọria-ya bu: Ma ire-ure nke ọkpukpu nile ka ekworo bu.

JOB 5:2
N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya, Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.

EKLISIASTIS 4:4
Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n'ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

ILU 3:31
Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo, Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile.

ILU 23:17
Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo: Kama n'egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile.

ILU 24:1
Ekwosola ndi ọjọ ekworo, Achọsi-kwa-la ike inọ n'etiti ha:

JOB 5:2-3
[2] N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya, Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.[3] Mu onwem ahuwo onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ọ nāb͕a ngbọrọgwu: M'we bua ebe-obibi-ya ọnu na mberede.

ILU 27:4
Ihe nēnweghi obi-ebere ka ọnuma bu, iju-miri ka iwe bu kwa; Ma ònye gēguzo n'iru ekworo?

1 KỌRINT 3:3
n'ihi na unu bu ndi anu-aru nāchi rue ub͕u a: n'ihi na ebe ekworo na esem-okwu di n'etiti unu, ùnu abughi ndi anu-aru nāchi, ndi nējeghari kwa dika madu?

ROM 13:13
Ka ayi nējeghari dika ọ kwesiri ayi, dika n'ehihie; ọ bughi n'ite-egwú na iṅubiga-manya-ókè, ọ bughi n'ikwa-iko na agu ikwa-iko, ọ bughi n'esem-okwu na ekworo.

MATIU 27:18
N'ihi na ọ matara na ha rara Ya-ri nye n'ihi ekworo.

ỌLU OZI 13:45
Ma mb͕e ndi-Ju huru ìgwè madu ahu, ha juputara n'ekworo, we nēkwugide ihe nile Pọl nēkwu, ha nēkwulu kwa ha.

ABÙ ỌMA 37:1
Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ, Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo.

ỌLU OZI 7:9
Nna uku ahu, ebe ha nēkwo Josef ekworo, ha we re ya ga n'Ijipt: ma Chineke nọyere ya,

MAK 15:10
N'ihi na ọ mara na ndi-isi-nchu-àjà rara Ya-ri nye n'ihi ekworo.

ỌLU OZI 17:5
Ma ndi-Ju, ebe ha nēkwo ekworo, ha kuru ajọ ndikom ufọdu nime ndi nēguzo n'efu n'ọma-ahia ka ha so ha, ha we kpọkọta ìgwè madu, me ka obodo ahu tua ùzù; ha we biakwasi ulo Jeson, chọ uzọ ikuputa ha n'iru ọra madu.

JEMES 4:5
Ma-ọbu ùnu nēchè na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu okwu n'efu? Àgu ayi nāgusi Mọ ahu ike n'uzọ ekworo, bú Mọ Nke O mere ka O biri nime ayi?

JENESIS 26:14
ọ we nwe ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu, na ihe-nnweta, bú igwè ehi, na ọtutu ndi-orù: ndi Filistia we nēkwo ya ekworo.

JỌN 8:32
unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n'orù.

ABÙ ỌMA 73:3
N'ihi na ekwosorom ndi nānya isi ekworo, Ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m'nāhu.

AISAIA 26:11
Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha.

EZIKIEL 35:11
n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M'gēme kwa dika iwe-gi si di, na dika ekworo-gi si di nke i kwoworo site n'asì i kpọrọ ha; Mgēme kwa ka amara Mu onwem n'etiti ha, mb͕e M'gēkpe gi ikpe.

ỌPUPU 20:17
Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n'ebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.

1 TIMỌTI 3:15
ma ọ buru na m'nānọ ọdù, ka i we mata otú anāghaghi ibi obi n'èzí-na-ulo Chineke, ebe ọ bu nzukọ nke Chineke di ndu, bú ide na ntọ-ala nke ezi-okwu.

ESTA 5:13
Ma ihe a nile adighi-ezurum, na mb͕e nile mu onwem nāhu Mọdekai, bú onye-Ju, ka ọ nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze.

GALETIA 5:1
Kraist mere ka ayi pua n'orù ka ayi we nwere onwe-ayi: ya mere nēguzosinu ike, unu ekwela ka ewere yoke nke bu ibu-orù jide unu ọzọ.

JUD 1:24
Ma Onye ahu nke puru iche unu nche ka unu ghara isu ngọngọ, na iguzo unu n'iru ebube-Ya nādighi ita uta n'oké obi-utọ,

ABÙ ỌMA 73:17-20
[17] Rue mb͕e m'nābà n'ebe nsọ nile nke Chineke, Ghọta ikpe-azu-ha.[18] N'ezie ọ bu n'ebe nile nālọ alọ ka I nēdo ha: I mewo ka ha darue ntikpọ.[19] Hà siri aṅa ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'otù ntabi-anya? Ha agwuwo gwusia site n'ihe-egwu di iche iche.[20] Dika nrọ mb͕e madu nēteta n'ura; Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya.

JENESIS 31:1
Ọ we nu okwu nile nke umu-ndikom Leban, si, Jekob achiriwo ihe nile nna-ayi nwere; o sitekwara n'ihe nna-ayi nwere kpata àkù a nile.

ỌNU-ỌGUGU 16:3
ha we kpọkọta onwe-ha imegide Moses na imegide Eron, si ha, O zuworo unu, n'ihi na nzukọ Israel nile, ha nile n'otù n'otù, di nsọ, ọ bu kwa n'etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bu kwa gini mere unu nēbuli onwe-unu kari nkpọkọta nke Jehova?

ABÙ ỌMA 106:16
Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006