A A A A A

Mmehie: [Izu ohi]


1 KỌRINT 6:10
ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.

1 TIMỌTI 6:10
N'ihi na ihu ego n'anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche: nke ufọdu nāb͕asosi ike, ewe duhie ha n'okwukwe-ayi, ha were kwa ọtutu ihe-nb͕u dupue onwe-ha.

EFESỌS 4:28
Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa.

ỌPUPU 20:15
Gi ezula ori.

ỌPUPU 22:7
Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya ego ma-ọbu ihe idebe, ewe zue ya n'ulo nwoke ahu; ọ buru na achọta onye-ori ahu, ọ ghaghi ikwughachi okpukpu abua.

HOSEA 4:2
Ọ bu nání ọb͕ub͕a-iyi, na okwu-ugha, na ob͕ub͕u-madu, na izu-ori, na ikwa-iko; ha etipúwo etipú, iwusi-ọbara-madu emetuwo kwa iwusi-ọbara-madu.

JỌN 10:10
Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè.

LEVITIKỌS 19:11-13
[11] Unu ezula ori; unu aghọ-kwa-la aghughọ, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha, otù n'ebe ibe-ya nọ.[12] Unu ewe-kwa-la aham ṅu iyi n'okwu-ugha, we me ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.[13] Emeb͕ula madu-ibe-gi, anapu-kwa-la ya ihe n'ike: ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu agaghi-adigide n'aka-gi ogologo abali nile rue ututu.

LUK 19:8
Zakiọs we guzọ, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m'nwere ka m'gēnye ndi-ob͕eye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n'ebubo ugha, m'gēnyeghachi anọ anọ.

MAK 10:19
I matawo ihe nile enyere n'iwu, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Emeb͕ula madu, Sọpuru nna-gi na nne-gi.

MATIU 19:18
Ọ si Ya, Òle? Jisus we si, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha,

ILU 10:2
Àkù nke nmebi-iwu adighi-aba urù: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.

ILU 12:22
Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu: Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ.

ILU 20:17
Ọ nātọ madu utọ, bú nri okwu-ugha; Ma emesia nkpuru-ájá gēju ya ọnu.

ABÙ ỌMA 62:10
Unu atukwasila obi na nmeb͕u, Ọzọ, n'ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu: Mb͕e àkù nābakari uba, unu atukwasila ya obi.

ROM 13:7
Nākwughachinu madu nile ihe nile unu ji ha n'ugwọ: tunu ùtú nye onye unu ji ugwọ ùtú; tunu ùtú-ahia nye onye unu ji ugwọ ùtú-ahia; tuanu egwu onye unu ji ugwọ egwu; sọpurunu onye unu ji ugwọ nsọpuru.

ROM 13:9
N'ihi na okwu a, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Agu ihe ọjọ agula gi, ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di enyere n'iwu, achikọtara ya n'okwu a, bú, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.

LEVITIKỌS 6:2-4
[2] Mb͕e madu gēmehie, mekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ghọb͕u madu-ibe-ya n'ihe-ndebe, ma-ọbu n'ihe etiyere n'aka-ya, ma-ọbu n'ihe anapuru madu n'ike, ma-ọbu mb͕e ọ meb͕uworo madu-ibe-ya;[3] ma-ọbu mb͕e ọ hutaworo ihe furu efu, o we ghọ aghughọ nime ya, ṅu iyi n'ugha; n'otù nime ihe ndia nile nke madu nēme, nēmehie nime ha:[4] o gēru kwa, mb͕e ọ gēmehie, mb͕e ikpe mara ya, na ọ gēnyeghachi ihe ọ napuru madu n'ike, ma-ọbu ihe ọ nwetara na nmeb͕u, ma-ọbu ihe-ndebe enyere ya idebe, ma-ọbu ihe furu efu nke ọ huta-woro,

ỌPUPU 22:1-4
[1] Mb͕e onye ọ bula gēzu ehi ma-ọbu aturu, we b͕ue ya, ma-ọbu re ya; ehi ise ka ọ gākwughachi n'ọnọdu ehi ahu, ma-ọbu aturu anọ ka ọ gākwughachi n'ọnọdu aturu ahu.[2] Ọ buru na ahú onye-ori ka ọ nētipú ulo, ewe tib͕ue ya, o we nwua, ọ dighi ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya.[3] Ọ buru na anyanwu awakwasi ya, ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya: ọ ghaghi ikwu-ghachi; ọ buru na o nweghi ihe, agēre kwa ya n'ihi ori-ya.[4] Ọ buru na achọta ihe ahu n'aka-ya n'ezie, bú nke o zuru n'ori, ma ọ bu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu, ma-ọbu aturu, na ndu; ọ gākwughachi okpukpu abua.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006