A A A A A

Mmehie: [Iyigharị oge]


1 KỌRINT 14:40
Ma ka eme ihe nile n'uzọ di nma n'anya, na n'usoro.

EKLISIASTIS 9:10
Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.

EKLISIASTIS 11:4
Onye nāriba ifufe ama agaghi-agha nkpuru; ọzọ, onye nēlekwasi igwe-oji anya agaghi-ewe ihe-ubi.

GALETIA 6:9
Ma ike agwula ayi n'obi n'ime ihe ọma: n'ihi na ayi gēweta ihe-ubi mb͕e oge-ya ruru, ma ayi adaghi #mbà.

HIBRU 12:11
Ozizí nile site n'inye ahuhu nādi ka ihe nādighi-eweta ọṅù n'oge di ub͕u a, kama nwuta: ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n'udo, bú nkpuru nke ezi omume.

HIBRU 10:12
ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, O we nọdu n'aka-nri Chineke mb͕e nile;

JEMES 4:17
Ya mere onye matara ime ihe ọma, ma ọ meghi ya, ọ buru onye ahu nmehie.

JỌN 9:4
Ayi aghaghi ilu ọlu Onye ziterem, mb͕e ubọchi fọduru: abali nābia, mb͕e ọ dighi onye ọ bula puru ilu ọlu.

LUK 12:35
Ka eke unu ihe-ọkiké n'úkwù, ka oriọna-unu nēnwu kwa;

LUK 12:40
Unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.

MATIU 6:33
Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.

FILIPAI 4:13
Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.

ILU 10:4
Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu: Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.

ILU 12:24-25
[24] Aka ndi di nkọ gāchi achi: Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè.[25] Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala; Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.

ILU 13:4
Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu: Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba.

ILU 14:23
Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya: Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ.

ILU 18:9
Ọzọ, onye di ume-ngwu n'ije-ozi-ya, Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi.

ILU 20:4
N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi; Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe.

ILU 21:17
Onye ihe kọrọ ka onye nāhu ọṅù n'anya gābu: Onye nāhu manya-vine na manu n'anya agaghi-abu ọgaranya.

ILU 27:1
Anyala isi bayere echi; N'ihi na i maghi ihe chi gābọ.

ROM 7:20-21
[20] Ma ọ buru na ihe m'nachọghi, ihe ahu ka m'nēme, ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie.[21] Ya mere ahurum iwu a, na ihe ọjọ dim nso n'ebe akam gēru, mu, bú onye nāchọ ime ihe ọma.

EFESỌS 5:15-17
[15] Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe;[16] nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ.[17] N'ihi nka unu aghọla ndi nēnweghi uche, kama ghọtanu ihe bu ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.

LUK 9:59-62
[59] O we si onye ọzọ, Som. Ma ọ siri, Onye-nwe-ayi, kwe ka m'buru uzọ je lìe nnam.[60] Ma Ọ siri ya, Rapu ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu; ma gi onwe-gi je zisa ozi ala-eze Chineke.[61] Onye ọzọ we si kwa, M'gēso Gi, Onye-nwe-ayi; ma kwe ka m'buru uzọ kele ndi nọ n'ulom ekele ikpe-azu.[62] Ma Jisus siri ya, Ọ dighi onye ọ bula nke nēle anya n'azu, mb͕e o tiyesiri aka-ya n'ọ́gù anu-ulo nādọkpughari, kwesiri ala-eze Chineke.

ILU 24:30-34
[30] N'akuku ubi onye-ume-ngwu ka m'gabigara, Na n'akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ;[31] Ma, le, o púchiri n'ogwu, Akuba kpuchiri iru-ya, Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya.[32] Mu onwem we hu, m'we tukwasi obim na ya: Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti.[33] Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala:[34] Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe; Ihe-ukọ-gi kwa, dika nwoke ji ọta.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006