1 KỌRINT 10:13-14 |
[13] Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.[14] N'ihi nka, ndi m'huru n'anya, b͕anarinu ikpere-arusi. |
|
1 JỌN 2:16 |
N'ihi na ihe nile nke di n'uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esiteghi na Nna-ayi, kama o sitere n'uwa. |
|
1 KỌRINT 15:33 |
Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma. |
|
JEMES 4:7 |
Ya mere donu onwe-unu n'okpuru Chineke; ma guzogidenu ekwesu, ọ gāb͕apu kwa n'ebe unu nọ. |
|
1 KỌRINT 6:12 |
Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem. |
|
1 PITA 5:10 |
Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala. |
|
ABÙ ỌMA 50:15 |
Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u; M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram. |
|
ROM 5:3-5 |
[3] Ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi nime nkpab͕u-ayi nile: ebe ayi matara na nkpab͕u nāluta ntachi-obi;[4] ntachi-obi ahu nāluta kwa ọnwunwa; ọnwunwa ahu nāluta kwa olile-anya:[5] Olile-anya ahu emeghi kwa ka ihere me ayi; n'ihi na awusaworo ihu-n'anya nke Chineke n'obi-ayi site n'aka Mọ Nsọ Nke enyere ayi. |
|
1 KỌRINT 6:9-11 |
[9] Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,[10] ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.[11] Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi. |
|
TAITỌS 2:12 |
nādọ ayi aka na nti ka ayi we ju asọpurughi-Chineke na agu ihe ọjọ di n'uwa, we di ndu uche zuru okè na nke ezi omume na nke isọpuru-Chineke n'oge di ub͕u a; |
|
JEMES 1:2-3 |
[2] Guanu ya n'ọṅù nile, umu-nnam, mb͕e ọ bula unu dabàra n'ọwunwa di iche iche;[3] ebe unu mara na nnwaputa nke okwukwe-unu nāluputa ntachi-obi. |
|
HIBRU 4:15-16 |
[15] N'ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n'adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n'ihe nile n'otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi.[16] Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n'oge nkpà. |
|
JỌN 3:16-17 |
[16] N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.[17] N'ihi na Chineke eziteghi Ọkpara-Ya n'uwa ka O kpe uwa ikpé; kama ka ewe site n'aka-Ya zọputa uwa. |
|
FILIPAI 4:13 |
Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike. |
|
ABÙ ỌMA 95:8 |
Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba, Dika n'ubọchi Masa n'ọzara: |
|
MATIU 6:13 |
Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu. |
|
MATIU 26:41 |
Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike. |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |