A A A A A

Ihe omimi: [Unicorns]


DANIEL 8:5
Ma mu onwem nọ nāchighari uchem, ma, le, otù nkpi siri n'Ọdida-anyanwu bia n'elu uwa nile, ma ọ dighi-emetu ala ma-ọli: nkpi ahu nwe-kwa-ra mpi juru anya n'olile n'etiti anya-ya abua.

ỌNU-ỌGUGU 23:22
Chineke nēme ka ha si n'ala Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere

ỌNU-ỌGUGU 24:8
Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere: O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya, Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha, Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.

ABÙ ỌMA 92:10
Ma I mewo ka mpim di elu dika mpi atu: Ejiwo manu ọhu wusam.

ZEKARAIA 9:14
Ọ bu kwa Jehova ka agāhu n'elu ha, àkú-Ya gāpu kwa dika àmùmà: Onye-nwe-ayi Jehova gāfù kwa opì-ike, je ije n'oké ifufe di iche iche nke Ndida.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006