A A A A A

Ihe omimi: [Refeyim na Bible]


DEUTERONOMI 1:28
Òle ebe ayi onwe-ayi nārigo? umu-nne-ayi emewo ka obi-ayi ghara idi ike, si, Ọ bu ndi di uku di kwa ogologo kari ayi, na obodo uku ewusiri ike rue elu-igwe; ọzọ kwa, umu Anakim ka ayi huru n'ebe ahu.

DEUTERONOMI 3:11
(N'ihi na nání Og, bú eze Beshan, ka arapuru site na ndi fọduru nke Refaim; le, ihe-ndina-ya bu ihe-ndina ígwè; ihe-ndina ahu, ọ̀ dighi na Raba nke umu Amon? cubit iteghete ka ogologo-ya di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, dika cubit nke nwoke si di.)

JENESIS 6:4
Nefilim nọ n'uwa na mb͕e ahu, ha nọ kwa ma emesia, mb͕e umu-ndikom nke Chineke nābakuru umu-ndinyom nke madu, mb͕e ha nāmukwara ha umu: ndi ahu bu ndi-dike ahu ndi nọri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi amara aha-ha.

AISAIA 40:22
Ọ bu Onye ahu Nke nānọdu n'elu buruburu uwa, ndi bi nime ya ewe di ka ogugu; Nke nēseti elu-igwe dika ákwà di nfe, we b͕asa ha dika ulo-ikwū ibi ebi:

JEMES 2:24
Unu ahuwo na anēsite n'ọlu gu madu n'onye ezi omume, adighi-esite kwa nání n'okwukwe.

JOSHUA 11:21
Joshua we bia na mb͕e ahu, bipu ndi Anak ahu n'ugwu, bú nime Hebron, na nime Debia, na n'Anab, na n'ugwu Juda nile, na n'ugwu Israel nile: ha na obodo nile ha ka Joshua wezugara ka ebibie ha.

JUD 1:6
Ndi-mọ-ozi ndi nēdebeghi ibu-isi nke aka ha, kama ha rapuru ebe-obibi nke aka ha, O debewo kwa ha n'ab͕u ebighi-ebi n'okpuru ọchichiri nye ikpé nke oké ubọchi ahu.

ỌNU-ỌGUGU 13:23-33
[23] Ha we biarue ndagwurugwu Eshkol, si n'ebe ahu b͕utu otù alaka na otù uyọkọ nkpuru-vine; ha we būru ya n'osisi eji ebu ihe n'etiti madu abua; ha weta-kwa-ra ufọdu nime nkpuru pomegranate na ufọdu nime nkpuru fig.[24] Akpọrọ ebe ahu ndagwurugwu Eshkol, n'ihi uyọkọ nke umu Israel si n'ebe ahu b͕utu.[25] Ha we si n'iledo ala ahu lata n'ọgwugwu ọgu ubọchi abua.[26] Ha we je biakute Moses, biakute kwa Eron, biakute kwa nzukọ nile nke umu Israel, rue ọzara Peran, rue Kedesh; we weghachiri ha na nzukọ Israel nile okwu, me kwa ka ha hu nkpuru ala ahu.[27] Ha we kọrọ ya akukọ, si Ayi bara n'ala ahu ebe i zigara ayi, ọzọ kwa, ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya ka ọ bu; nka bu kwa nkpuru-ya.[28] Otú ọ di, ndi bi n'ala ahu di ike, ewusi-kwa-ra obodo nile ha ike, ha di kwa uku ri nne: ọzọ kwa, umu Anak ka ayi huru n'ebe ahu.[29] Amalek bi n'ala Negeb; ndi Het na ndi Jebus na ndi-Amorait bi n'ugwu: ndi Kenean bi n'usọ oké osimiri, na n'akuku Jọdan.[30] Keleb we me ka ndi Israel b͕a nkiti n'ebe Moses nọ, ọ si, Ka ayi rigo nọ, nweta ya; n'ihi na ayi puru ime ya nke-ọma.[31] Ma ndikom ahu ndi soro ya rigo siri, Ayi apughi irigo imegide ndi ahu, n'ihi na ndi di ike ka ha bu kari ayi.[32] Ha we me ka akukọ ọjọ putara umu Israel bayere ala ahu nke ha ledoro, si, Ala ahu, nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala nke nēripia ndi bi ya ka ọ bu; ọzọ ndi nile ayi huru n'etiti ya bú ndikom toro ogologo.[33] N'ebe ahu ka ayi hu-kwa-ra ndi-Nefilim, bú umu Anak, ndi sitere na ndi-Nefilim: ayi we di n'anya onwe-ayi dika ogugu, ọ bu kwa otú a ka ayi di n'anya-ha.

ABÙ ỌMA 3:6
M'gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta, Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu.

NKPUGHE 17:8
Anu-ọhia ahu nke i huru diri, ọ dighi kwa ub͕u a; ọ gaje kwa isi n'abyss ahu rigoputa, na ila n'iyì. Ọ gēju kwa ndi bi n'elu uwa anya, bú ndi anēdeghi aha-ha n'akwukwọ nke ndu ahu site n'oge itọ ntọ-ala uwa, mb͕e ha nēle anu-ọhia ahu anya, na ọ diri, ọ dighi kwa ub͕u a, ọ gābia kwa.

ROM 6:23
N'ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.

EMOS 2:9-10
[9] Ma Mu onwem kpochapuru ndi-Amorait n'iru ha, onye idi-elu-ya di ka idi-elu osisi cedar, onye di ike ka ọ bu kwa, dika osisi oak; ma ekpochapurum nkpuru-ya n'elu na nkpọrọgwu-ya nile n'okpuru.[10] Ọ bu kwa Mu onwem mere ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, M'me-kwa-ra ka unu je ije n'ọzara ọgu arọ abua, ka unu we nweta ala ndi-Amorait.

DEUTERONOMI 2:10-21
[10] (Imim biri nime ya na mb͕e gara aga, ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak;[11] Refaim ka anāgu kwa ndia, dika ndi Anak; ma ndi Moab nākpọ ha Imim.[12] Ọ bu kwa na Sia ka ndi Hoa bi na mb͕e gara aga, ma umu Isọ napuru ha ala-ha; ha we kpochapu ha n'iru ha, bichie n'ọnọdu ha; dika umu Israel mere ala nke ihe-nnweta-ya, nke Jehova nyere ha.)[13] Ub͕u a, bilienu, gabiga miri-iyi Zered n'onwe-unu. Ayi we gabiga miri-iyi Zered.[14] Ubọchi nile nke ayi siri na Kedesh-banea je ije, rue mb͕e ayi gabigara miri-iyi Zered, di orú arọ na iri na asatọ; rue mb͕e ọb͕ọ nile nke ndikom agha si n'etiti ọmuma-ulo-ikwū gwusia, dika Jehova ṅuru ha iyi.[15] Ọzọ kwa, aka Jehova digidere ha, ikpochapu ha n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e emere ka ha gwusia.[16] Ọ we rue, mb͕e ndikom agha ahu nile nwupusiri n'etiti ndi Israel,[17] na Jehova gwaram okwu, si,[18] Gi onwe-gi nāgabiga ya, bu ókè-ala Moab, ta:[19] ma mb͕e i nābiaru nso ncherita-iru umu Amon, akpab͕ula ha, aluso-kwa-la ha ọ̀gù: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala umu Amon ka ọ buru ihe-nnweta: n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ibu ihe-nnweta.[20] (Ala Refaim ka agu-kwa-ra nke ahu: Refaim biri nime ya na mb͕e gara aga; ma ndi Amon nākpọ ha Zamzumim;[21] ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak; ma Jehova kpochapuru ha n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha:

JENESIS 6:1-4
[1] O rue, mb͕e madu malitere iba uba n'elu ala, mb͕e amukwara umu-ndinyóm nye ha,[2] na umu-ndikom nke Chineke huru umu-ndinyom nke madu na ha mara nma; ha we lutara onwe-ha ndinyom site na ndi nile ha rọputara.[3] Jehova we si, Mọm agaghi-achi achi nime madu rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na ya onwe-ya bu kwa anu-aru: ma ubọchi-ya nile gābu ọgu arọ isi.[4] Nefilim nọ n'uwa na mb͕e ahu, ha nọ kwa ma emesia, mb͕e umu-ndikom nke Chineke nābakuru umu-ndinyom nke madu, mb͕e ha nāmukwara ha umu: ndi ahu bu ndi-dike ahu ndi nọri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi amara aha-ha.

1 IHE EMERE 20:4-8
[4] O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha biliri na Gezea nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Sipai, nke sitere n'umu Rafa: ewe me ka ha ruru ala.[5] Agha we di ọzọ ebusoro ndi Filistia; Elhanam nwa Jaia we tib͕ue Lahmi, bú nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà.[6] Agha we di ọzọ na Gat, ma otù nwoke toro ogologo nọ n'ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ha nile di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa.[7] Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimea, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya.[8] Ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n'aka Devid, na site n'aka ndi-orù-ya.

2 SAMUEL 21:15-22
[15] Ma ndi Filistia nwere agha ọzọ ha nēbuso Israel; Devid we rida, ya na ndi-orù-ya, buso ndi Filistia agha; Devid we da #mbà.[16] Ishbi-benob, nke di n'etiti umu Rafa, onye ọtùtù ube-ya di ọgu shekel ọla iri-na-ise n'ọtùtù, ekewo-kwa-ra onye ahu ihe-agha ọhu, o we si na ya gētib͕u Devid.[17] Ma Abishai nwa Zeruaia yere ya aka, tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua. Mb͕e ahu ndikom Devid ṅuru ya iyi, si, I gaghi eso ayi pua ibu agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel.[18] O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha di kwa ọzọ na Gob nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Saf, nke di n'etiti umu Rafa.[19] Agha we di ọzọ na Gob ebusoro ndi Filistia; Elhanan nwa Jaare-oregim onye Bet-lehem we tib͕ue nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà.[20] Agha we di ọzọ na Gat, ma otú nwoke toro ogologo nọ n'ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ọnu-ọgugu-ha di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa.[21] Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimai, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya.[22] Madu anọ ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n'aka Devid, na site n'aka ndi-orù-ya.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006