A A A A A

Ihe omimi: [Nrọ]


1 SAMUEL 28:15
Samuel we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēkweghi ka m'nọdu ndu, ime ka m'rigota? Sọl we si, Anọm na nkpà nke-uku; ndi Filistia nēbusokwam agha, ma Chineke ewezugawo Onwe-ya n'arum, Ọ dighi-azakwam ọzọ, ma ọ bu n'aka ndi-amuma ma-ọbu na nrọ: m'we kpọ gi, ka i we me ka m'mara ihe m'gēme.

ỌLU OZI 2:17
Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru, M'gāwusa ufọdu nime Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu: Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù, Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ:

DANIEL 1:17
Ma umu-okoro anọ ndia, Chineke nyere ha ọmuma-ihe na uche n'akwukwọ na amam-ihe nile: Daniel ghọta-kwa-ra ọhù na nrọ nile.

EKLISIASTIS 5:7
N'ihi na n'ọtutu nrọ na ihe-efu ka ọtutu okwu di kwa: ma tua egwu Chineke.

JENESIS 20:3
Ma Chineke biakutere Abimelek na nrọ nke abali, si ya, Le, gi bu onye nwuru anwu, n'ihi nwayi ahu nke i kuruworo; n'ihi na nwayi ahu bu nwunye di luru.

JENESIS 40:8
Ha si ya, Nrọ ka ayi rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya. Josef we si ha, Ọ̀ bughi Chineke nwe akukọ-isi nrọ nile? biko, kọrọnu m.

JENESIS 42:9
Josef we cheta nrọ abua ahu nke ọ rọrọ bayere ha, ọ si ha, Ndi-nledo ka unu bu; ihu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo.

JEREMAIA 23:32
Le, Mu nēmegide ndi nēbu amuma nrọ ugha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha we ze ha, me ka ndim kpafue site n'okwu-ugha nile ha na n'obi-ha nādighi n'otù ebe: ma Mu onwem eziteghi ha, enyeghkwam ha iwu; ọ dighi kwa urù ha gābara ndi nka ma-ọli; ọ bu ihe si n'onu Jehova puta.

MATIU 2:13
Ma mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ, si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya b͕alaga n'Ijipt, nọ n'ebe ahu rue mb͕e ọ bula m'gāgwa gi: n'ihi na Herod gaje ichọ Nwatakiri ahu ka ọ la Ya n'iyì.

MATIU 2:19
Ma mb͕e Herod nwusiri, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ n'Ijipt,

ỌNU-ỌGUGU 12:6
Ọ we si Biko, nurunu okwum nile: ọ buru na onye-amuma di n'etiti unù, n'ọhu ka Mu, bú Jehova, gēme ka ọ maram, na nrọ ka M'gāgwa ya okwu.

ZEKARAIA 10:2
N'ihi na teraphim ekwuwo ajọ ihe, ndi nāju ase ahuwo ọhù ugha; ọ bu kwa nrọ ugha ka ha nēzi, n'efu ka ha nākasi madu obi: n'ihi nka ka ha buliworo ije dika ìgwè ewu na aturu, anēweda ha n'ala, n'ihi na ọ dighi onye-ọzùzù-aturu ha nwere.

JOEL ۲:۲۸
O gēru kwa ma emesia, na M'gāwusa Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, ndi-okenye-unu gārọ nrọ, umu-okorọbia-unu gāhu ọhù:

AISAIA 29:7-8
[7] Dika nrọ, bú ọhù nke abali, otú a ka ha gādi kwa, bú ìgwè mba nile ndi nēbuso Eriel agha, bú ndi nile nēbuso ya na ebe-ya ewusiri ike agha, nākpab͕u kwa ya.[8] Ọ gādi kwa ka mb͕e onye agu nāgu nārọ nrọ, ma, le, ọ nēri ihe; o we teta, ma nkpuru-obi-ya b͕ara aka: ma-ọbu dika mb͕e onye akpiri nākpọ nku nārọ nrọ, ma, le, ọ nāṅu miri; ọ we teta, ma, le, ọ dawo #mbà, nkpuru-obi-ya nāchọsi kwa ihe ike: otú a ka ìgwè mba nile gādi, ndi nēbuso ugwu Zaion agha.

DANIEL 7:1-3
[1] N'arọ mbu nke Belshaza, bú eze Babilon, Daniel huru nrọ na ọhù di iche iche nke isi-ya n'elu ihe-ndina-ya: mb͕e ahu nrọ ahu ka o dere n'akwukwọ, ọ bu isi ihe n'ihe nile ọ huru ka o kwuru.[2] Daniel zara, si, Anọm nāhu n'ọhùm n'abali, ma, le, ifufe anọ nke elu-igwe nēfekwasi oké osimiri uku si-ike.[3] Anu anọ nke di uku we nēsi n'oké osimiri rigoputa, ha di iche otù n'ibe-ya.

DEUTERONOMI 13:1-3
[1] Mb͕e onye-amuma ma-ọbu ọrọ-nrọ gēbili n'etiti gi, nye gi ihe-iriba-ama ma-ọbu ihe-ebube,[2] ihe-iriba-ama ahu ma-ọbu ihe-ebube ahu we me, nke ọ gwara gi okwu bayere ya, si, Ka ayi jeso chi ọzọ n'azu, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha), ka ayi fè kwa ha òfùfè;[3] egela nti okwu onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, nānwà unu, ima ma unu nēwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile hu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya.

JENESIS 41:25-27
[25] Josef we si Fero, Nrọ, Fero, otù ka ọ bu: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka O gosiworo Fero.[26] Ezi ehi asa ahu, arọ asa ka ha bu; ezi oko ọka asa ahu, arọ asa ka ha bu kwa: nrọ ahu, otù ka ọ bu.[27] Ehi asa ahu nke tara aru, nke jọ-kwa-ra njọ, nke nārigoputa n'azu ha, arọ̄ asa ka ha bu, ha na oko ọka asa ahu nke di efù, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọrọ; ha gābu arọ asa nke oké unwu.

MATIU 1:20-23
[20] Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ.[21] Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n'ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha.[22] Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si,[23] Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.

JENESIS 41:8-12
[8] O rue, n'ututu, na mọ-ya b͕asasiri; o we ziga kpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile nke Ijipt, na ndi-ya nile mara ihe: Fero we kọrọ ha nrọ-ya; ma ọ dighi onye nākọrọ Fero isi-ha.[9] Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu we gwa Fero okwu, si, Nmehiem nile ka mu onwem nēhota ta:[10] Fero were iwe n'aru ndi-orù-ya, tinye m n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-isi ndi-ob͕ū, mu na onye-isi ndi osi ite:[11] ayi we rọ nrọ n'otù abali, mu na ya; onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, otú a ka ayi rọrọ.[12] Ma ayi na otù okorọbia nọ n'ebe ahu, bú onye-Hibru, orù onye-isi nke ndi-ob͕ū nwere; ayi we kọrọ ya, ọ we kọrọ ayi isi nrọ-ayi; onye ọ bula n'etiti ayi dika nrọ-ya si di ka ọ kọrọ isi nrọ nye.

JOB 33:14-18
[14] N'ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu, E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama.[15] Na nrọ, bú ọhù nke abali, Mb͕e oké ura nādakwasi madu, N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina;[16] Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu, Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,[17] Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya, Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;[18] Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù, Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006