A A A A A

Ihe omimi: [Dragọn]


EZIKIEL 29:3
Kwue okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Fero, eze Ijipt, bú ogologo anu ahu nke nāmakpu n'etiti osimiri Nail-ya nile, nke siworo, Mu nwe Nail nkem, ọ bu kwa mu onwem mere ya n'onwem.

EZIKIEL 32:2
Nwa nke madu, buliere Fero, bú eze Ijipt, abù-ákwá, si ya, Nwa-ọdum nke mba nìle ka i yiworo: ma gi onwe-gi di ka ogologo anu n'oké osimiri nile; i we waputa n'osimiri-gi nile, ji ukwu-gi, b͕arua miri, zọrua osimiri nile ha.

AISAIA 27:1
N'ubọchi ahu Jehova gēwere mma-agha-Ya di arọ́ di uku di ike ji nmehie-ha leta leviathan, bú agwọ nāb͕a ọsọ, na leviathan, bú agwọ b͕agọrọ ab͕agọ; Ọ gēb͕u kwa ogologo anu ahu nke di n'oké osimiri.

AISAIA 51:9
Teta, teta, yiri ike dika uwe, gi ogwe-aka Jehova; teta, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, bú ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga. Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke kpọwasiworo Rehab, nke mapúworo ogologo anu-miri?

JOB 7:12
Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri, Na I nēdo ndi-nche ichem?

JOB 41:18-21
[18] Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu, Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.[19] N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa, Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha.[20] N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa, Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.[21] Iku-ume-ya nāmunye icheku, Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta.

ABÙ ỌMA 18:8
Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya, Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia: Afunwuru icheku site na ya.

ABÙ ỌMA 44:19
Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia, Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi.

ABÙ ỌMA 74:13
Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri: I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri.

NKPUGHE 1:7
Le, Ọ nābia, Ya na igwe-oji; anya nile ọ bula gāhuzu kwa Ya, ndi ahu gāhu kwa Ya, bú ndi mara Ya ube; ebo nile nke uwa gēti-kwa-ra ya aka n'obi. E, Amen.

NKPUGHE 11:7
Ma mb͕e ọ bula ha gāb͕azuwo àmà-ha, anu-ọhia ahu nke nēsi n'abyss ahu rigoputa gēbu agha megide ha, meri kwa ha, b͕u kwa ha.

DEUTERONOMI 32:33
Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu, Na ńsí di irè nke aju-ala.

NKPUGHE 13:8
Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa.

NKPUGHE 16:13
M'we hu ndi-mọ atọ nādighi ọcha, dika awọ̀, ka ha nēsi n'ọnu dragon ahu, si kwa n'ọnu anu-ọhia ahu, si kwa n'ọnu onye-amuma ugha ahu, puta:

ỌPUPU 7:10-12
[10] Moses na Eron we bakuru Fero, me otú a, dika Jehova nyere ha iwu: Eron we tuda nkpa-n'aka-ya n'iru Fero, na n'iru ndi-orù-ya, ọ we ghọ ogologo anu.[11] Fero we kpọ kwa ndi mara ihe, kpọ kwa ndi-mb͕asi: ha onwe-ha kwa, bú ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt, we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a.[12] Ha we tuda, nwoke ọ bula nkpa-n'aka-ya, ha we ghọ ogologo anu: ma nkpa-n'aka Eron lodara nkpa-n'aka-ha.

JOB 40:15-20
[15] Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya; Ọ nāta ahihia dika ehi.[16] Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya, Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.[17] Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar: Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya.[18] Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi; Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.[19] Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke: Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso.[20] N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya; Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú.

NKPUGHE 12:1-17
[1] Ewe hu oké ihe-iriba-ama n'elu-igwe; nwanyi nke egbokwasiworo ya anyanwu dika uwe, ọnwa di kwa n'okpuru ukwu-ya abua, ọ nēkpu kwa okpu-eze nke kpakpando iri na abua n'isi-ya;[2] ọ di kwa ime: o we tie nkpu, ebe ime nēme ya, anēmekpa kwa ya aru imuputa nwa.[3] Ewe hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe; ma le, oké dragon nke nācha ọku ọku, nke nwere isi asa na mpi iri, nēkpu kwa okpu-eze asa n'isi-ya.[4] Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n'ala: dragon ahu we guzo n'iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.[5] O we muputa Ọkpara, bú Nwa-nwoke, Onye gēji nkpa-n'aka ígwè zù mba nile dika aturu: ewe punara ya Nwa-ya ahu la n'ebe Chineke nọ, na n'ebe oche-eze-Ya di.[6] Nwanyi ahu we b͕alaga nime ọhia, ebe o nwere ọnọdu edoziworo site n'aka Chineke, ka ha we zùa ya n'ebe ahu nnù ubọchi atọ na ọgu atọ.[7] Agha we puta n'elu-igwe: Maikael na ndi-mọ-ozi-ya buru agha megide dragon ahu; dragon ahu na ndi-mọ-ozi-ya we bue agha;[8] ha enweghi kwa ike, ahughi kwa ọnọdu-ha ọzọ n'elu-igwe.[9] Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n'uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.[10] M'we nu oké olu ka ọ nādà n'elu-igwe, si, Ub͕u a ka ọ biaworo, bú nzọputa ahu, na ike ahu, na ala-eze Chineke-ayi, na ichi-isi nke Kraist-Ya: n'ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n'iru Chineke-ayi ehihie na abali.[11] Ndi ahu we merie ya n'ihi ọbara Nwa-aturu ahu, na n'ihi okwu àmà-ha; ha ahughi kwa ndu-ha n'anya rue ọnwu.[12] N'ihi nka, ka obi nātọ unu utọ, unu elu-igwe nile, na unu ndi bi nime ha. Ahuhu gādiri uwa na oké osimiri: n'ihi na ekwensu aridakuruwo unu, nēnwe oké ọnuma, ebe ọ matara na o nwere nání nwa oge.[13] Mb͕e dragon ahu huru na achudara ya-ri n'uwa, o we sob͕ue nwanyi ahu, bú nwanyi nke muputara Nwa-nwoke ahu.[14] Ewe nye nwanyi ahu nkù abua ahu nke oké ugo ahu, ka o we febà n'ọhia la n'ọnọdu-ya, ebe anāzù ya otù oge, na oge abua, na nkera otù oge, ka ọ pua n'iru agwọ ahu.[15] Agwọ ahu we b͕uputa miri n'ọnu-ya n'azu nwanyi ahu dika osimiri, ka o we me ka osimiri ahu bupu ya.[16] Ala we yere nwanyi ahu aka, ala we saghe ọnu-ya, loda osimiri ahu, nke dragon ahu b͕uputara n'ọnu-ya.[17] Dragon ahu we wesa nwanyi ahu iwe, we pua ibu agha megide nkpuru-ya fọduru, bú ndi nēdebe ihe nile Chineke nyere n'iwu, ndi nēnwe kwa àmà nke Jisus:

NKPUGHE 13:1-18
[1] o we guzọ n'ájá oké osimiri. M'we hu anu-ọhia ka ọ nēsi n'oké osimiri rigoputa, nēnwe mpi iri na isi asa, nēkpu kwa okpu-eze iri n'elu mpi-ya, nēnwe kwa aha ufọdu nke nkwulu Chineke n'elu isi-ya.[2] Anu-ọhia nke m'huru yi-kwa-ra agu, ukwu-ya di kwa ka ukwu bear, ọnu-ya di kwa ka ọnu ọdum: dragon ahu we nye ya ike-ya, na oche-eze-ya, na oké ichi-isi.[3] M'we hu otù n'etiti isi asa ya, dika agāsi na etib͕uru ya-ri ọ nwua; ewe me ka ihe-otiti-ya ahu nke nēweta ọnwu la: o we ju uwa dum anya, ha we so anu-ọhia ahu n'azu;[4] ha we kpọ isi ala nye dragon ahu, n'ihi na o nyere anu-ọhia ahu ichi-isi-ya; ha kpọ-kwa-ra isi ala nye anu-ọhia ahu, si, Ònye yiri anu-ọhia ahu? ònye pu-kwa-ra ibu agha megide ya?[5] ewe nye ya ọnu nke nēkwu oké ihe n'ikwulu Chineke; ewe nye ya ike ime omume-ya ọgu ọnwa abua na abua.[6] O we saghe ọnu-ya ikwulu Chineke, ikwulu aha-Ya, na ulo-ikwū-Ya, bú ndi bi n'elu-igwe.[7] Ewe nye ya ike ibu agha megide ndi nsọ ahu, na imeri ha: enye-kwa-ra ya ike ichi ebo nile ọ bula na ndi nile ọ bula na asusu nile ọ bula na mba nile ọ bula isi.[8] Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa.[9] Ọ buru na onye ọ bula nwere nti, ya nu.[10] Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n'agha, ọ bu n'agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.[11] M'we hu anu-ọhia ọzọ ka ọ nēsi n'ala rigoputa; o nwe-kwa-ra mpi abua yiri nke Nwa-aturu ahu, ma ọ nēkwu okwu dika dragon ahu.[12] O we nāchi isi nile nke anu-ọhia mbu ahu n'iru ya. Ọ nēme kwa uwa na ndi bi nime ya ka ha kpọ isi ala nye anu-ọhia mbu ahu, nke emere ka ihe-otiti-ya nke nēweta ọnwu la.[13] ọ nēme kwa oké ihe-iriba-ama di iche iche, ka o we me ọbuná ọku ka o si n'elu-igwe ridata n'uwa n'iru madu nile.[14] O we nēduhie ndi bi n'elu uwa n'ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n'iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n'elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu.[15] Ewe nye ya ike inye ya ume, bú ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu, ka ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu we kwue okwu, me kwa ka eb͕ue ha, ka ha ra, bú ndi ọ bula nākpọghi isi ala nye ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu.[16] Ọ nēme kwa madu nile, ndi ntà na ndi uku, na ndi-ọgaranya na ndi-ob͕eye, na ndi nwere onwe-ha na ndi-orù, ka akà ha akàrà n'aka-nri-ha, ma-ọbu n'egedege-iru-ha;[17] ka onye ọ bula ghara kwa ipu izuta ahia ma-ọbu ire ihe, ma-ọbughi onye nwere akàrà ahu, bú aha nke anu-ọhia ahu ma-ọbu ọnu-ọgugu aha-ya.[18] N'ebe a ka amam-ihe di. Onye nwere uche, ya gua ọnu-ọgugu nke anu-ọhia ahu; n'ihi na ọ bu ọnu-ọgugu madu: ọnu-ọgugu-ya bu kwa nnù na ọgu iri na ọgu atọ na isi.

NKPUGHE 20:1-15
[1] M'we hu mọ-ozi ka o nēsi n'elu-igwe ridata, nēji nkpisi-ugodi nke abyss ahu n'aka-ya, ya na oké nkpọrọ.[2] O we jide dragon ahu, bú agwọ ochie ahu, onye bu Ekwensu na Setan, o we ke ya ab͕u nnù arọ abua na ọgu iri,[3] we tubà ya nime abyss ahu, mechie ya, kà kwa ya akàrà n'elu ya, ka o we ghara iduhie mba nile ọzọ, rue mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi: mb͕e arọ ndia gasiri aghaghi itọpu ya nwa oge.[4] M'we hu oche-eze, ha we nọkwasi ha, we nye ha ikpé: m'we hu nkpuru-obi nke ndi ebipururi isi n'ihi àmà Jisus, na n'ihi okwu Chineke, ndi ahu nọ kwa, bú ndi nākpọghi isi ala nye anu-ọhia ahu, ma-ọbu ihe-oyiyi-ya, ndi nānataghi kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ha na n'aka-ha; ha we di ndu, so kwa Kraist buru eze nnù arọ abua na ọgu iri.[5] Ndi fọduru n'etiti ndi nwuru anwu adighi ndu rue mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi. Nka bu nbilite-n'ọnwu mbu.[6] Ngọzi nādiri ya, ọ di kwa nsọ, bú onye nwere òkè nime nbilite-n'ọnwu mbu ahu: ọnwu nke-abua ahu enweghi ike n'ebe ndia nọ; kama ha gābu ndi-nchu-àjà nke Chineke na nke Kraist, ha gēso kwa Ya buru eze nnù arọ abua na ọgu iri ahu.[7] Ma mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi, agātọpu Setan n'ulo-nkpọrọ-ya,[8] ọ gāputa kwa iduhie mba nile ndi di na nkuku anọ nke uwa, bú Gog na Megog, ime ka ha zukọ ibu agha ahu: ndi ọnu-ọgugu-ha ra ka ájá nke oké osimiri.[9] Ha we rigo n'obodobo uwa, nọgide ọmuma-ulo-ikwū ndi nsọ gburugburu, ya na obodo ahu nke ahuworo n'anya: ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ha.[10] Ekwensu ahu nke nēduhie ha, atubàra ya nime ọdọ ọku na brimstone, ebe anu-ọhia ahu na onye-amuma ugha ahu nọ kwa; agēmekpa kwa ha aru ehihie na abali rue mb͕e nile ebighi-ebi.[11] M'we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n'iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha.[12] M'we hu ndi nwuru anwu nile, ndi uku na ndi ntà, ka ha nēguzo n'iru oche-eze ahu; ewe saghe akwukwọ di iche iche: asaghe-kwa-ra akwukwọ ọzọ, nke bu akwukwọ nke ndu: ewe kpe ndi nwuru anwu ikpé site n'ihe nile edereri n'akwukwọ ahu di iche iche, dika ọlu nile ha si di.[13] Oké osimiri we nyeghachi ndi nwuru anwu di nime ya; ọnwu na Hedis nyeghachi-kwa-ra ndi nwuru anwu di nime ha: ewe kpe ha ikpé n'otù n'otù dika ọlu nile ha si di.[14] Ewe tubà ọnwu na Hedis nime ọdọ ọku ahu. Nka bu ọnwu nke-abua ahu, bú ọdọ ọku ahu.[15] Ọ buru kwa na ahughi onye ọ bula ka edereri aha-ya n'akwukwọ nke ndu ahu, ewe tubà ya n'ọdọ ọku ahu.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006