EKLISIASTIS 6:10 |
Ὅ, τι ἔγεινεν, ἔλαβεν ἤδη τὸ ὄνομα αὐτοῦ, καὶ ἐγνωρίσθη ὅτι οὗτος εἶναι ἄνθρωπος· καὶ δὲν δύναται νὰ κριθῇ μετὰ τοῦ ἰσχυροτέρου αὑτοῦ. |
|
HABAKUK 2:3 |
N'ihi na ọhù ahu nādiru mb͕e akara àkà, ọ nēkusi-kwa-ra ọgwugwu-ya ume ike, ọ gaghi-ekwu kwa okwu-ugha: ọ buru na ọ la azu, chere ya; n'ihi na ọ ghaghi ibia, ọ gaghi-anọ ọdù. |
|
AISAIA 46:10 |
nēgosi ikpe-azu site na mbu, nēgosi kwa ihe nke anēmeghi eme site na mb͕e ochie; nāsi, Ndum-ọdum gēguzosi ike, ọ bu kwa ihe nile nke nātọm utọ ka M'gēme: |
|
AISAIA 55:11 |
otú a ka okwum di nke nēsi n'ọnum puta: ọ gaghi-alaghachikutem n'efu, ma ọ buru na o bughi uzọ mezu ihe tọrọm utọ, we ga nke-ọma n'ihe M'zigara ya. |
|
JEREMAIA 1:5 |
Tutu akpua m gi n'afọ amaram gi, ọ bu kwa tutu i si n'àkpà-nwa puta ka M'doro gi nsọ; ewerewom gi nye ka gi buru onye-amuma diri mba nile. |
|
JEREMAIA 17:10 |
Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di. |
|
JỌN 16:33 |
Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N'uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa. |
|
ỌNU-ỌGUGU 23:19 |
Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha; Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha: Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya? Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike? |
|
ILU 16:3 |
Turu ọlu-gi nile rue Jehova aru, Èchìchè-gi nile ewe guzosie ike. |
|
ILU 19:20-24 |
[20] Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti, Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.[21] Ọtutu èchìchè di n'obi madu; Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.[22] Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya: Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.[23] Egwu Jehova nēdubà na ndu: Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju; Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.[24] Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa, Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n'ọnu-ya. |
|
ABÙ ỌMA 37:37 |
Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo. |
|
ABÙ ỌMA 138:8 |
Jehova gēmezurum ihe nile: Jehova, ebere-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi; Arala aka n'ọlu nile nke aka-gi abua. |
|
NKPUGHE 20:12 |
M'we hu ndi nwuru anwu nile, ndi uku na ndi ntà, ka ha nēguzo n'iru oche-eze ahu; ewe saghe akwukwọ di iche iche: asaghe-kwa-ra akwukwọ ọzọ, nke bu akwukwọ nke ndu: ewe kpe ndi nwuru anwu ikpé site n'ihe nile edereri n'akwukwọ ahu di iche iche, dika ọlu nile ha si di. |
|
ROM 12:2 |
Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè. |
|
ROM 8:28-29 |
[28] Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di.[29] N'ihi na ndi O buru uzọ mara, O bu-kwa-ra uzọ ka ha àkà, ka ha na onyinyo nke Ọkpara-Ya nwekọ otù udi, ka O we buru onye ebu uzọ mu n'etiti ọtutu umu-nna: |
|
EFESỌS 2:8-9 |
[8] n'ihi na ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n'okwukwe; nka esiteghi kwa n'onwe-unu: ọ bu onyinye Chineke:[9] o siteghi n'ọlu, ka onye ọ bula we ghara inya isi. |
|
1 PITA 2:8-9 |
[8] na, Nkume isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà; n'ihi na ha nāsu ngọngọ n'okwu ahu, ebe ha nēkweyeghi ekweye: edo-kwa-ra ha ka ha me ihe a.[9] Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube: |
|
1 KỌRINT 2:7-9 |
[7] kama ihe ayi nēkwu bu amam-ihe Chineke n'ihe-omimi, bú amam-ihe nke ezobeworo, nke Chineke buru uzọ ka àkà mb͕e oge ndia akērughi, iwetara ayi otuto:[8] nke ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-isi oge a mara: n'ihi na asi na ha mara ya-ri, ha agaghi-akpọgidewori Onye-nwe ebube n'obe:[9] kama dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa, Nke nābàghi kwa n'obi madu, Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n'anya. |
|
JEREMAIA 29:11-14 |
[11] N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.[12] Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M'gēge kwa unu nti.[13] Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm.[14] M'gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēme kwa ka ndi-unu adọtara n'agha lata, M'gēsi kwa na mba nile, na n'ebe nile M'chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka unu lata n'ebe ahu nke M'mere ka unu si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ. |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |