2 EZE 5:10 |
Elaisha we zigara ya onye-ozi, si, Je, sa aru ub͕ò asa nime Jọdan, anu-aru-gi gālaghachikute kwa gi, i gādi kwa ọcha. |
|
DEUTERONOMI 5:12 |
Debe ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu. |
|
ỌPUPU 22:30 |
Otú a ka i gēmere ehi-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi: ubọchi asa ka ya na nne-ya gānọ: n'ubọchi nke-asatọ i gēwere ya nyem. |
|
JỌN 6:35 |
Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula. |
|
MATIU 26:26 |
Mb͕e ha nēri ihe, Jisus we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya; O we nye ndi nēso uzọ-Ya, si, Naranu, rie; nka bu arum. |
|
ỌNU-ỌGUGU 4:7 |
N'elu table nke irum ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, tiye kwa n'elu ya afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko nile nke nwusi àjà-ihe-ọṅuṅu: achicha anētiye mb͕e dum gādi kwa n'elu ya: |
|
JOSHUA 6:3-4 |
[3] Unu gāb͕a obodo ahu buruburu, ndikom agha nile, nēje obodo ahu buruburu otù ub͕ò. Otú a ka i gēme ubọchi isi.[4] Ndi-nchu-aja asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e ahu: ma n'ubọchi nke-asa unu gāb͕a obodo ahu buruburu ub͕ù asa, ndi-nchu-aja gāfù kwa opì-ike asa ahu. |
|
JENESIS 2:1-3 |
[1] Ewe kesia elu-igwe na uwa, na usu-ha nile.[2] Chineke we jesia ozi-Ya n'ubọchi nke-asa, bú nke O jere; O we kwusi n'ubọchi nke-asa ahu n'ozi-Ya nile nke O jere.[3] Chineke we gọzie ubọchi nke-asa ahu, do kwa ya nsọ: n'ihi na ọ bu nime ya ka Ọ kwusiri n'ozi-Ya nile nke Chineke kereri ekè n'ije ya. |
|
JENESIS 9:12-16 |
[12] Chineke we si, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Mu onwem nāb͕a n'etiti Mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke diyere unu, rue ọb͕ọ nile ebighi-ebi:[13] eke na ogwurugwu m ka tinyeworo n'igwe-oji, ọ gāghọ kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na uwa.[14] Ọ gēru kwa, mb͕e M'nēme ka igwe-oji puta n'elu uwa, na agāhu eke-na-ogwurugwu ahu n'igwe-oji ahu,[15] M'we cheta ọb͕ub͕a-ndum, nke di n'etiti mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile; miri agaghi-aghọ kwa iju-miri ọzọ ibibi anu-aru nile.[16] Eke-na-ogwurugwu ahu gādi kwa n'igwe-oji; M'gāhu kwa ya anya, icheta ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi di n'etiti Chineke na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile nke di n'elu uwa. |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |