A A A A A

Ihe ngosi mgbakọ na mwepu: [Nọmba 5]


NKPUGHE 13:5-18
[5] ewe nye ya ọnu nke nēkwu oké ihe n'ikwulu Chineke; ewe nye ya ike ime omume-ya ọgu ọnwa abua na abua.[6] O we saghe ọnu-ya ikwulu Chineke, ikwulu aha-Ya, na ulo-ikwū-Ya, bú ndi bi n'elu-igwe.[7] Ewe nye ya ike ibu agha megide ndi nsọ ahu, na imeri ha: enye-kwa-ra ya ike ichi ebo nile ọ bula na ndi nile ọ bula na asusu nile ọ bula na mba nile ọ bula isi.[8] Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa.[9] Ọ buru na onye ọ bula nwere nti, ya nu.[10] Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n'agha, ọ bu n'agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.[11] M'we hu anu-ọhia ọzọ ka ọ nēsi n'ala rigoputa; o nwe-kwa-ra mpi abua yiri nke Nwa-aturu ahu, ma ọ nēkwu okwu dika dragon ahu.[12] O we nāchi isi nile nke anu-ọhia mbu ahu n'iru ya. Ọ nēme kwa uwa na ndi bi nime ya ka ha kpọ isi ala nye anu-ọhia mbu ahu, nke emere ka ihe-otiti-ya nke nēweta ọnwu la.[13] ọ nēme kwa oké ihe-iriba-ama di iche iche, ka o we me ọbuná ọku ka o si n'elu-igwe ridata n'uwa n'iru madu nile.[14] O we nēduhie ndi bi n'elu uwa n'ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n'iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n'elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu.[15] Ewe nye ya ike inye ya ume, bú ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu, ka ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu we kwue okwu, me kwa ka eb͕ue ha, ka ha ra, bú ndi ọ bula nākpọghi isi ala nye ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu.[16] Ọ nēme kwa madu nile, ndi ntà na ndi uku, na ndi-ọgaranya na ndi-ob͕eye, na ndi nwere onwe-ha na ndi-orù, ka akà ha akàrà n'aka-nri-ha, ma-ọbu n'egedege-iru-ha;[17] ka onye ọ bula ghara kwa ipu izuta ahia ma-ọbu ire ihe, ma-ọbughi onye nwere akàrà ahu, bú aha nke anu-ọhia ahu ma-ọbu ọnu-ọgugu aha-ya.[18] N'ebe a ka amam-ihe di. Onye nwere uche, ya gua ọnu-ọgugu nke anu-ọhia ahu; n'ihi na ọ bu ọnu-ọgugu madu: ọnu-ọgugu-ya bu kwa nnù na ọgu iri na ọgu atọ na isi.

MATIU 19:9
Ma asim unu, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko: onye nke gālu nwanyi ahu mb͕e arapuworo ya nākwa kwa iko.

NKPUGHE 11:2-3
[2] Ma obí nke di n'èzí ulo nsọ ahu, rapu ya n'èzí, atù-kwa-la; n'ihi na ewerowo ya nye ndi mba ọzọ: ha gāzọda kwa obodo nsọ ahu ọgu ọnwa abua na abua.[3] M'gēnye kwa ndi-àmàm abua ike, ha gēbu kwa amuma nnù ubọchi atọ na ọgu atọ, eb͕okwasiwo kwa ha ákwà-nkpe.

MATIU 5:32
ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, ọ nēme nwanyi ahu ka ọ nọ n'ọnọdu onye akwara iko megide: onye ọ bula nke gālu kwa ya mb͕e arapusiri ya, ọ nākwa iko.

2 TIMỌTI 3:16
Ihe ọ bula edeworo n'akwukwọ nsọ bu ihe si n'obi Chineke puta, ọ ba-kwa-ra urù iji zí ihe, na iji tu madu nmehie-ha n'anya, na iji me ka uche madu guzozie, na iji zùputa nzùputa nke di n'ezi omume:

NKPUGHE 4:6-8
[6] ihe di kwa n'iru oche-eze ahu dika oké osimiri eji enyo me yiri crystal; ihe anọ nke di ndu nọ kwa n'etiti oche-eze ahu, nọ kwa oche-eze ahu gburugburu, ndi juputara n'anya anya n'iru na azu.[7] Ihe mbu ahu nke di ndu yiri ọdum, ihe nke-abua ahu nke di ndu yi-kwa-ra nwa-ehi, ihe nke-atọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra iru dika nke madu, ihe nke-anọ ahu nke di ndu yi-kwa-ra ugo nēfe efe.[8] Ihe anọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra nkù isi n'otù n'otù, ha juputa-kwa-ra n'anya anya gburugburu, ya na nime: ha adighi-ezu ike ehihie na abali, nāsi, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahu di, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye diri, Onye nādi kwa adi, Onye nābia kwa.

ỌNU-ỌGUGU 5:11-31
[11] Jehova we gwa Moses okwu, si[12] Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nwunye nwoke ọ bula gējehie, we mekpue ihe-nmekpu megide ya,[13] ya na nwoke ọzọ ewe dina ka ọ ra aru n'aru-ya, ewe zopu ihe ahu n'anya di-ya kpuchi kwa ya, nwayi ahu ewe rua árú, ma ọ dighi onye-àmà megide ya, ejideghi kwa nwayi ahu;[14] mọ ekworo ewe garue nwoke ahu aru, o we kwo nwunye-ya ekworo, nwayi ahu ewe rua áru: ma-ọbu mb͕e mọ ekworo gāgarue ya arú, o we kwo nwunye-ya ekworo, ma nwayi ahu arughi árú:[15] nwoke ahu gēme kwa ka nwunye-ya biakute onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa n'ihi nwunye-ya onyinye-ya iji biaru nso, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka barley; ọ gaghi-awukwasi ya manu, ọ gaghi-atukwasa ya frankincense; n'ihi na onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu, bú onyinye-inata-iruọma nke ihe-ncheta, nēme ka echeta ajọ omume.[16] Onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ biarue nso, guzo ya n'iru Jehova:[17] onye-nchu-àjà gēwere kwa miri nsọ n'iko ájá: ọ bu kwa ufọdu nime ájá nke di n'ala-ulo ebe-obibim ka onye-nchu-àjà gēwere, tiye ya nime miri ahu:[18] onye-nchu-àjà gēguzo kwa nwayi ahu n'iru Jehova, tọpu agiri-isi nwayi ahu, tiye onyinye-inata-iru-ọma nke ihe-ncheta n'ọbu-aka-ya abua, onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu: ma n'aka onye-nchu-àjà ka miri ilu ahu gādi nke nēweta ọbubu-ọnu:[19] onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ ṅua iyi, ọ gāsi nwayi ahu, Ọ buru na gi na nwoke edinaghi, ọ buru kwa na i jehieghi ime ihe ruru árú, mb͕e i nọ n'okpuru di-gi, gi pua na miri ilu a nke nēweta ọbubu-ọnu:[20] ma asi na gi onwe-gi ejehiewo, mb͕e i nọ n'okpuru di-gi, asi kwa na i rua árú, nwoke nābughi di-gi ewe ra aru n'aru-gi:[21] onye-nchu-àjà gēwere kwa iyi nke ọb͕ub͕a-iyi ahu me ka nwayi ahu ṅua iyi, onye-nchu-àjà gāsi nwayi ahu, Jehova gēme gi ka i buru ihe-ọb͕ub͕a-iyi ka i buru kwa ihe-oṅuṅu-iyi n'etiti ndi-gi, mb͕e Jehova nēme ka apata-ukwu-gi bua aru, me kwa ka afọ-gi za aza;[22] miri a nke nēweta ọbubu-ọnu gābà kwa na ngiri-afọ-gi, ime ka afọ-gi za aza, na ime ka apata-ukwu-gi bua aru: nwayi ahu gāsi kwa, Amen, Amen.[23] Onye-nchu-àjà gēde kwa ọb͕ub͕a-iyi ndia n'akwukwọ, o gēhichapu kwa ha nime miri ilu ahu:[24] ọ gēme kwa ka nwayi ahu ṅua miri ilu nke nēweta ọbubu-ọnu: miri ahu nke nēweta ọbubu-ọnu gābà kwa nime ya ighọ ihe-ilu.[25] Onye-nchu-àjà gānara kwa onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo n'aka nwayi ahu, fé onyinye-inata-iru-ọma ahu n'iru Jehova, weta ya nso ebe-ichu-àjà:[26] onye-nchu-àjà gēsi kwa n'onyinye-inata-iru-ọma ahu weju nweju-aka-ya, ka ọ buru ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, emesia ọ gēme ka nwayi ahu ṅua miri ahu.[27] Ma mb͕e ọ meworo ka ọ ṅua miri ahu, ọ gēru kwa ọ buru na ọ rua árú, mekpu ihe-nmekpu megide di-ya, na miri ahu nke nēweta ọbubu-ọnu gābà nime ya ighọ ihe-ilu, afọ-ya gāza kwa, apata-ukwu-ya gābu kwa aru: nwayi ahu gābu kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi n'etiti ndi-ya.[28] Ma ọ buru na nwayi ahu arughi árú, ma onye di ọcha ka ọ bu; ọ gāpu kwa ya, we turu ime.[29] Nka bu iwu ekworo, mb͕e nwayi nējehie, mb͕e ọ nọ n'okpuru di-ya, ọ we rua árú;[30] ma-ọbu mb͕e mọ ekworo gāgaru nwoke n'aru, ọ we kwo nwunye-ya ekworo; o gēguzo kwa nwayi ahu n'iru Jehova, onye-nchu-àjà gēme kwa ya iwu a nile.[31] Nwoke ahu gāpu kwa n'ajọ omume, ma nwayi gēbu ajọ omume-ya.

1 EZE 7:23
O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n'otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di gburugburu gburugburu, cubit ise ka idi-elu-ya di: eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu.

DEUTERONOMI 6:4
Nuru, Israel; Jehova, bú Chineke-ayi, Jehova bu otù:

MALAKAI 3:10
Webatanu otù uzọ n'uzọ iri nile n'ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n'ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M'gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya.

ABÙ ỌMA 104:9
I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya; Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa.

JENESIS 6:12
Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n'ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n'elu uwa.

JENESIS 7:20
Cubit iri na ise ka miri ahu di ike site n'elu ugwu; ewe kpuchie ugwu nile.

JENESIS 8:5-9
[5] Miri we nēbilata mb͕e nile rue ọnwa nke-iri: n'ọnwa nke-iri ahu, n'ubọchi mbu nke ọnwa, ka ahuru elu ugwu.[6] O rue, mb͕e ọgu ubọchi abua gwusiri, na Noa meghere window nke ub͕ọ o mere:[7] o zipu ugolo ọma, nke púru nāpù nālata, rue mb͕e miri tasiri n'elu uwa.[8] Ọ we si n'ebe ọ nọ zipu nduru, ile ma miri esiwo n'elu ala taba;[9] ma nduru ahu ahughi ebe-izu-ike nye ọbu-ukwu-ya, ọ we laghachikute ya rue n'ub͕ọ, n'ihi na miri ahu di n'elu uwa nile: ọ we setipu aka-ya, were ya, me ka ọ bakute ya nime ub͕ọ.

JENESIS 9:11
M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ: agaghi-ebipu kwa anu-aru nile ọzọ site na miri nke iju-miri ahu; iju-miri agaghi-adi kwa ọzọ ibibi uwa.

JENESIS 1:31
Chineke we hu ihe nile ọ bula O mere, ma, le, ọ di nma nke-uku. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-isi.

JENESIS 3:15
iro ka M'gētiye kwa n'etiti gi na nwayi ahu, na n'etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n'isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n'ikiri-ukwu.

1 KỌRINT 10:13
Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.

ỌPUPU 20:13
Gi eb͕ula madu.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006