ROM 8:28 |
Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di. |
|
JEREMAIA 29:11 |
N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi. |
|
FILIPAI 4:6-7 |
[6] Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ.[7] Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus. |
|
LUK 6:16 |
na Judas nwa Jemes, na Judas Iskariot, onye ghọrọ onye rara ya nye; |
|
ABÙ ỌMA 34:18 |
Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha. |
|
AISAIA 40:28-31 |
[28] Ì maghi? ì nughi? Chineke nke mb͕e ebighi-ebi ka Jehova, Onye kèworo nsọtu nile nke uwa, bu; Ọ dighi-ada #mbà, ike adighi-agwu kwa Ya; ọ dighi ngwuputa anēgwuputa nghọta-Ya.[29] Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba.[30] Ọbuná umu-ckoro nāda #mbà, ike nāgwu kwa ha, ọbuná umu-okorọbia nāsu ngọngọ da:[31] ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà. |
|
ILU 3:5 |
Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi: |
|
ABÙ ỌMA 42:11 |
Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'agēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem. |
|
KỌLỌSI 3:23-25 |
[23] ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bughi kwa madu;[24] ebe unu matara na ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihe-nnyeghachi-unu, bú ihe-nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist.[25] N'ihi na onye nēme ajọ omume gānaghachi ajọ omume ahu o mere: ile-madu-anya-n'iru adighi kwa. |
|
EKLISIASTIS 1:2 |
Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ihe nile bu ihe-efu. |
|
EKLISIASTIS 12:8 |
Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ha nile bu ihe-efu. |
|
HIBRU 11:6 |
ma asi na okwukwe adighi ọ bu ihe anāpughi ime, bú ime ihe gātọ Chineke ezi utọ: n'ihi na onye nābiakute Chineke aghaghi ikwe na Ọ di, na Ọ nēgosi kwa Onwe-ya Onye nēnyeghachi ndi nāchọ Ya ugwọ-ọlu. |
|
HIBRU 13:5 |
Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli. |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |