A A A A A

Ndụ: [Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị]


ILU 7:6-21
[6] N'ihi na na window nke ulom N'oghere-inara-ifufem ka m'lepuru anya;[7] M'we hu n'etiti ndi nēnweghi uche, M'mata n'etiti umu-ndikom, Otù nwa-okorọbia nke obi amam-ihe kọrọ,[8] Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu, Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije;[9] Na chi-ojiji, n'anyasi nke ubọchi, Nime nb͕achi nke abali na ọchichiri.[10] Ma, le, otù nwanyi zutere ya Yiri uwe nke nwanyi nākwa iko, ọ bu kwa onye echeworo obi-ya.[11] Onye nēme nkpọtu ka ọ bu, buru kwa onye nēwezuga onwe-ya; Ọ bughi n'ulo-ya ka ukwu-ya nānọ:[12] Ub͕u a n'èzí ka ọ nọ, ub͕u a ọ bu n'amá nile, Ọ bu kwa na nso nkuku nile ọ bula ka ọ nēche anwu.[13] Nwanyi ahu we jide ya aka, sutu kwa ya ọnu, Were iru ihere nādighi si ya:[14] Ihe àjà nile nke àjà-udo di n'akam; Ta ka m'kwughachiworo ihe nile m'kwere na nkwa.[15] N'ihi nka ka m'putara izute gi, Ichọsi iru-gi ike, m'we chọputa gi.[16] Ákwà-nb͕abá mara nma ka m'b͕abáworo n'ihe m'ji edina, Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt.[17] Ewerewom myrrh na aloes na cinnamon Fesa ihe-ndinam.[18] Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n'ikwa-iko rue ututu; Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n'ihu-n'anya nile.[19] N'ihi na dim anọghi n'ulo, O jewo ije di anya:[20] Ọ werewo akpa ego n'aka-ya; N'ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata.[21] O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n'ulo-ya, O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya.

EMOS ٣:٣
Màdu abua gāyikọta je ije, ma ọ buru na ha ezuteghi?

2 KỌRINT 6:14-18
[14] Unu na ndi nēkweghi ekwe ekekọtala onwe-unu, n'ihi na unu na ha di iche: n'ihi na òle nkekọ ezi omume na imebi-iwu nēkekọ? ma-ọbu òle nnwekọ ìhè na ọchichiri nēnwekọ?[15] Ọzọ, òle nnwekọ-otù-olu Kraist na Belial nēnwekọ? ma-ọbu òle òkè onye kwere ekwe na onye nēkweghi ekwe nēkerita?[16] Ọzọ, òle nkwekọ ulo nsọ nke Chineke na arusi nēkwekọ? n'ihi na ayi onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu; dika Chineke kwuru, si, M'gēbi nime ha, nējeghari kwa nime ha; M'gābu kwa Chineke nke ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nkem.[17] N'ihi nka Sinu n'etiti ha puta, guzo-kwa-nu iche, ka Onye-nwe-ayi kwuru, Unu emetu-kwa-la ihe nādighi ọcha aka; Mu onwem gākpọbata kwa unu,[18] Buru kwa unu Nna, Unu onwe-unu gābu-kwa-ram umu-ndikom na umu-ndinyom, ka Onye-nwe-ayi kwuru, Nke puru ime ihe nile.

EFESỌS 5:19
nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi;

FILIPAI 4:13
Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.

JEMES 4:4
Unu ndi nākwa iko, ùnu amataghi na ibu eyì nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyì nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke.

2 SAMUEL 12:1
Jehova we zìe Netan jekuru Devid. O we biakute ya, si ya, Ndikom abua di n'otù obodo; otù bu ọgaranya, nke-ọzọ bu ob͕eye.

1 EZE 9:1
O rue, mb͕e Solomon wubìri ulo Jehova, na ulo eze, na ihe nile nke di Solomon ezi nma n'obi nke tọrọ ya utọ ime,

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006