A A A A A

Ndụ: [Ndị inyom di ha nwụrụ]


JEMES 1:27
Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa.

ỌLU OZI 6:1
Ma na mb͕e ahu, mb͕e ndi nēso uzọ Jisus nāba uba, ndi-Ju nāsu asusu Grik malitere itamu megide ndi-Hibru, n'ihi na elefuru ndinyom-ha ndi di-ha nwuru anya n'ije-ozi, bú ikère ndi Kraist òkè, kwa-ubọchi.

1 TIMỌTI 5:3-16
[3] Nāsọpuru ndinyom di-ha nwuru, bú ndi nọ ezie n'ọnọdu ndinyom di-ha nwuru.[4] Ma ọ buru na nwanyi ọ bula di-ya nwuru nwere umu ma-ọbu umu umu, ka ha buru uzọ muta isọpuru Chineke n'aru ndi èzí-na-ulo nke aka ha, na inyeghachi ndi muru ha ihe: n'ihi na nka bu ihe anānara nke-ọma n'iru Chineke.[5] Ma nwanyi nke bu onye di-ya nwuru n'ezie, nke arapu-kwa-ra nání ya, ọ tukwasiwo obi-ya na Chineke, nānọgide kwa n'aririọ-ya na ekpere-ya abali na ehihie.[6] Ma nwanyi nke nādi ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-ya utọ, ọ nwuruwo mb͕e ọ nọ na ndu.[7] Nēnye kwa ihe ndia n'iwu, ka ha we buru ndi anādighi-akalu.[8] Ma ọ buru na onye ọ bula ebughi uzọ chère ndi nke aka ya ihe nākpa ha, ma nke kachasi ndi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gọnariwo okwukwe-ayi, jọkari kwa onye nēkweghi ekwe na njọ.[9] Ka aghara ide aha nwanyi ọ bula n'akwukwọ dika nwanyi di-ya nwuru nke akāb͕aghi ọgu arọ atọ, onye buworo nwunye nke otù di,[10] onye anāb͕ara ya ezi àmà n'ọlu ọma; ọ buru na ọ zùputawo umu, ọ buru na o lewo ndi-ọbìa anya nke-ọma, ọ buru na ọ sawo ukwu ndi nsọ, ọ buru na o b͕owo nkpà ndi anākpab͕u, ọ buru na o sosiwo ezi ọlu nile ọ bula ike.[11] Ma ju umu-ab͕ọghọ di-ha nwuru: n'ihi na mb͕e ọ bula ha nupuru isi n'okpuru Kraist-ayi, ha nāchọ ilu di;[12] ewe ma ha ikpé, n'ihi na ha juru okwukwe mbu ha.[13] Ma tukwasi ihe ndia ha nāmuta kwa ibu ndi nādighi-alu ọlu, nēje n'ulo di iche iche; ma ọ bughi nání na ha bu ndi nādighi-alu ọlu, kama ha bu kwa ndi nēkwu okwu nzuzu, buru kwa ndi nētiye aka n'ọlu nābughi nke aka ha, nēkwu okwu nēkwesighi ka ha kwu.[14] Ya mere anamezube ka umu-ab͕ọghọ ndi di-ha nwuru luru di, mu kwa umu, nāchi kwa èzí-na-ulo-ha, ghara kwa inye onye nēmegide ayi ihe o gēji kwutọ:[15] n'ihi na ufọdu ejehiewo uzọ so Setan ub͕u a.[16] Ọ buru na nwanyi ọ bula nke kwere ekwe nwere ndinyom di-ha nwuru, ya b͕o ha nkpà, ka aghara kwa ibob͕u nzukọ Kraist; ka o we b͕o ndi ahu nkpà, bú ndi nọ n'ezie n'ọnọdu ndinyom di-ha nwuru.

1 TIMỌTI 5:9
Ka aghara ide aha nwanyi ọ bula n'akwukwọ dika nwanyi di-ya nwuru nke akāb͕aghi ọgu arọ atọ, onye buworo nwunye nke otù di,

1 TIMỌTI 5:3
Nāsọpuru ndinyom di-ha nwuru, bú ndi nọ ezie n'ọnọdu ndinyom di-ha nwuru.

1 TIMỌTI 5:16
Ọ buru na nwanyi ọ bula nke kwere ekwe nwere ndinyom di-ha nwuru, ya b͕o ha nkpà, ka aghara kwa ibob͕u nzukọ Kraist; ka o we b͕o ndi ahu nkpà, bú ndi nọ n'ezie n'ọnọdu ndinyom di-ha nwuru.

ỌLU OZI 9:39
Pita we bilie so ha je. Ma mb͕e ọ biaruru, ha duru ya rigo n'ime-ulo ahu di n'elu ulo: ndinyom nile ndi di-ha nwuru guzo-kwa-ra ya nso nākwa ákwá, nēgosi kwa uwe-ime na uwe ọzọ, ka ha ra, bú nke Dọkas nēme mb͕e ya na ha nọ.

ỌLU OZI 6:1-6
[1] Ma na mb͕e ahu, mb͕e ndi nēso uzọ Jisus nāba uba, ndi-Ju nāsu asusu Grik malitere itamu megide ndi-Hibru, n'ihi na elefuru ndinyom-ha ndi di-ha nwuru anya n'ije-ozi, bú ikère ndi Kraist òkè, kwa-ubọchi.[2] Ndi-ozi iri na abua ahu we kpọ ọra ndi nēso uzọ Jisus biakute ha, si, Ọ dighi utọ ka ayi rapu okwu Chineke, jere table ozi.[3] Kama, umu-nna-ayi, chọputanu n'etiti unu ndikom asa ndi ab͕ara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe, ndi ayi gēme ndi-isi n'ọlu a di nkpà.[4] Ma ayi onwe-ayi gānọgidesi ike n'ekpere-ayi, na n'ije ozi okwu Chineke.[5] Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n'okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju:[6] ndi ha guzoro n'iru ndi-ozi: mb͕e ha kpesiri ekpere, ha we bikwasi ha aka n'isi.

1 TIMỌTI 5:11-14
[11] Ma ju umu-ab͕ọghọ di-ha nwuru: n'ihi na mb͕e ọ bula ha nupuru isi n'okpuru Kraist-ayi, ha nāchọ ilu di;[12] ewe ma ha ikpé, n'ihi na ha juru okwukwe mbu ha.[13] Ma tukwasi ihe ndia ha nāmuta kwa ibu ndi nādighi-alu ọlu, nēje n'ulo di iche iche; ma ọ bughi nání na ha bu ndi nādighi-alu ọlu, kama ha bu kwa ndi nēkwu okwu nzuzu, buru kwa ndi nētiye aka n'ọlu nābughi nke aka ha, nēkwu okwu nēkwesighi ka ha kwu.[14] Ya mere anamezube ka umu-ab͕ọghọ ndi di-ha nwuru luru di, mu kwa umu, nāchi kwa èzí-na-ulo-ha, ghara kwa inye onye nēmegide ayi ihe o gēji kwutọ:

1 KỌRINT 7:8-9
[8] Ma asim ndi nānọghi n'ọnọdu di na nwunye na ndi di-ha nwuru, Ọ diri ha nma ma asi na ha nānọgide dika mu onwem nọ kwa.[9] Ma ọ buru na ha apughi ijide onwe-ha, ka ha luru: n'ihi na ilu di na nwunye ka ire ọku n'agu aru nma.

ABÙ ỌMA 68:5
Nna nke umu-nb͕ei, na onye-ikpe nke ndinyom di-ha nwuru, Ka Chineke bu n'ebe-obibi-Ya di nsọ.

DEUTERONOMI 14:29
onye Livai gābia kwa, (n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe), ya na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ha gēri kwa ihe, afọ gēju kwa ha; ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume nile nke aka-gi nke i nēme.

DEUTERONOMI 16:11-14
[11] i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'etiti gi, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.[12] I gēcheta kwa na ọ bu orù ka i buri n'Ijipt: i gēdebe kwa me kwa ukpuru ndia.[13] I gēmere onwe-gi ememe ulo-ntu ubọchi asa, mb͕e i chikọtasiri ihe sitere n'ebe-nzọcha-ọka-gi na n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi:[14] i gāṅuri kwa ọṅu n'ememe-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.

JEREMAIA 49:11
Rapu umu-nb͕ei-gi, Mu onwem gēdebe ha ndu; ka ndinyom-i di-ha nwuru tukwasim obi-ha.

MALAKAI 3:5
M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

DEUTERONOMI 14:28-29
[28] N'ọgwugwu arọ atọ i gēweputa otù uzọ n'uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n'otù arọ ahu, dọba kwa ya nime ọnu-uzọ-ama-gi nile:[29] onye Livai gābia kwa, (n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe), ya na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ha gēri kwa ihe, afọ gēju kwa ha; ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume nile nke aka-gi nke i nēme.

JOB 22:9
I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n'aka efu, Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei.

ABÙ-ÁKWÁ 5:3
Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna, Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.

ỌPUPU 22:22-24
[22] Nwayi ọ bula di-ya nwuru, ma-ọbu nwa-nb͕ei, unu ewedala ya n'ala.[23] Ọ buru na i weda ya n'ala ma-ọli, ọ we tikuem n'uzọ ọ bula n'ezie, aghaghm inu ntiku-ya;[24] iwem gādi ọku, M'gēwere kwa mma-agha b͕ue unu; nwunye-unu gāghọ ndinyom di-ha nwuru, umu-unu gāghọ kwa umu-nb͕ei.

AISAIA 10:1-2
[1] Ahuhu gādiri ndi nātọ ukpuru di iche iche nke ajọ ihe, na ndi-ode-akwukwọ nke deworo nmeb͕u n'akwukwọ:[2] iwezuga ndi nēnweghi ike n'ezi ikpé, na inapu ikpé ziri ezi nke ndi ewedara n'ala nke ndim, ka ndinyom di-ha nwuru we buru ihe ha kwatara n'agha, ka ha we luta kwa ihe umu-nb͕ei n'agha!

ỌPUPU 22:24
iwem gādi ọku, M'gēwere kwa mma-agha b͕ue unu; nwunye-unu gāghọ ndinyom di-ha nwuru, umu-unu gāghọ kwa umu-nb͕ei.

JEREMAIA 15:8
Ndinyom-ha di-ha nwuru ababigaworom uba ókè kari ájá nke oké osimiri nile: emewom ka onye nke nāpunara madu ihe biakute ha n'etiti-ehihie imegide nne nke umu-okorọbia: emewom ka nhuju-anya na obi-ọlulọ-miri dakwasi ya na mberede.

JOB 27:15
Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu, Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.

AISAIA 10:2
iwezuga ndi nēnweghi ike n'ezi ikpé, na inapu ikpé ziri ezi nke ndi ewedara n'ala nke ndim, ka ndinyom di-ha nwuru we buru ihe ha kwatara n'agha, ka ha we luta kwa ihe umu-nb͕ei n'agha!

JEREMAIA 18:21
N'ihi nka were umu-ha nye oké unwu, rara kwa ha nye n'aka mma-agha; ka ndinyom-ha ghọ kwa ndi b͕ara aka nwa na ndi di-ha nwuru; ka ndikom-ha ghọ kwa ndi ọnwu b͕uru, ka umu-okorọbia-ha ghọ ndi etib͕uru na mma-agha n'agha.

ABÙ ỌMA 78:64
Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha; Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.

ỌPUPU 22:22
Nwayi ọ bula di-ya nwuru, ma-ọbu nwa-nb͕ei, unu ewedala ya n'ala.

DEUTERONOMI 27:19
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ikpé nke ọbìa, na nke nwa-nb͕ei, na nke nwayi di-ya nwuru. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.

DEUTERONOMI 24:17
Ewezugala ikpé ọbìa, bú nwa-nb͕ei; ewere-kwa-la uwe nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe:

LUK 2:37
o we nọdu n'ọnọdu nwanyi di-ya nwuru rue ọgu arọ anọ na anọ), onye nāpughi n'ulo Chineke, ma o were obubu-ọnu na aririọ nēkpere Chineke abali na ehihie.

DEUTERONOMI 10:18
Ọ nēme ihe ekpere n'ikpe bayere nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru, Ọ nāhu kwa ọbìa n'anya, inye ya nri na uwe-nb͕okwasi.

AISAIA 1:17
mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.

ROM 7:3
Ya mere otú a, agākpọ ya nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche mb͕e di-ya nọ na ndu: ma ọ buru na di-ya nwuru, ọ puwo n'iwu nwere onwe-ya, nke nēme ya ka ọ ghara ibu nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche.

1 TIMỌTI 5:4
Ma ọ buru na nwanyi ọ bula di-ya nwuru nwere umu ma-ọbu umu umu, ka ha buru uzọ muta isọpuru Chineke n'aru ndi èzí-na-ulo nke aka ha, na inyeghachi ndi muru ha ihe: n'ihi na nka bu ihe anānara nke-ọma n'iru Chineke.

DEUTERONOMI 24:19-21
[19] Mb͕e i nēwe ihe-ubi n'ubi-gi, i we chezọ ùkwù ọka n'ubi, ejeghachila iweta ya: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume aka-gi nile.[20] Mb͕e i nētisisi nkpuru osisi olive gi, eletala alaka-ya ọzọ n'azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri.[21] Mb͕e i nāghọrọ nkpuru ubi-vine-gi, atutukọla nkpuru-ya fọduru n'azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri.

JOB 24:3
Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei, Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe.

EZIKIEL 22:7
Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n'etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi.

1 TIMỌTI 5:10
onye anāb͕ara ya ezi àmà n'ọlu ọma; ọ buru na ọ zùputawo umu, ọ buru na o lewo ndi-ọbìa anya nke-ọma, ọ buru na ọ sawo ukwu ndi nsọ, ọ buru na o b͕owo nkpà ndi anākpab͕u, ọ buru na o sosiwo ezi ọlu nile ọ bula ike.

ILU 15:25
Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu: Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.

ZEKARAIA 7:10
unu emeb͕u-kwa-la nwanyi di-ya nwuru, na nwa-nb͕ei, na ọbìa, na onye ewedara n'ala; unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide nwa-nne-ya.

MAK 12:42-43
[42] Otù nwayi, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, we bia, tubà ego ntà abua, nke mere otù farthing.[43] O we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si ha, N'ezie asim unu, Nwanyi a, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, ọ tubàra kari ndi nile nātubà nime ebe ùtú ahu:

JOB 29:13
Ngọzi nke onye nāla n'iyì nābiakwasim: M'nēme kwa obi nwayi di-ya nwuru ka o tie nkpu ọṅù.

DEUTERONOMI 24:19
Mb͕e i nēwe ihe-ubi n'ubi-gi, i we chezọ ùkwù ọka n'ubi, ejeghachila iweta ya: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume aka-gi nile.

DEUTERONOMI 26:12
Mb͕e i gēnyebìwori otù uzọ n'uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n'arọ nke-atọ, bú arọ nke inye otù uzọ n'uzọ iri, i gēnye kwa ya onye Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, ka ha we rie nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, afọ ewe ju ha;

1 TIMỌTI 5:5
Ma nwanyi nke bu onye di-ya nwuru n'ezie, nke arapu-kwa-ra nání ya, ọ tukwasiwo obi-ya na Chineke, nānọgide kwa n'aririọ-ya na ekpere-ya abali na ehihie.

JEREMAIA 7:6
ọ buru na unu adighi-emeb͕u ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwanyi di-ya nwuru, ọ buru kwa na unu adighi-awusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a, ọ buru kwa na unu adighi-ejeso chi ọzọ di iche iche ime onwe-unu ihe ọjọ:

ABÙ ỌMA 94:6
Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa, Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu.

ABÙ ỌMA 146:9
Jehova nēdebe ndi ala ọzọ; Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ; Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006