A A A A A

Ndụ: [Akụnụba]


1 TIMỌTI 6:17-19
[17] Nēnye ndi bu ọgaranya n'oge di ub͕u a iwu, ka ha ghara itukwasi uche-ha n'ihe di elu, ghara kwa itukwasi obi n'ihe ahu anējighi aka, bú àkù, kama ka ha tukwasi obi na Chineke, Onye nēwere àkù-Ya nye ayi ihe nile ka ha buru ihe gātọ ayi utọ;[18] ka ha nēme ezi ihe, ka ha buru ọgaranya n'ọlu ọma nile, ka ha buru ndi kwadebeworo ime ka ndi ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha buru ndi kwere ka ndi ọzọ so ha nwekọ ihe;[19] ka ha kpadoro onwe-ha ntọ-ala ọma nye oge gaje ibia, ka ha we jide ndu ahu nke bu ndu n'ezie.

LUK 19:1-10
[1] O we ba na Jeriko nāgabiga kwa n'etiti ya.[2] Ma le, otù nwoke anākpọ aha-ya Zakiọs; onye ahu bu kwa onye-isi-ọna-utu, onye ahu bu kwa ọgaranya.[3] O we chọ uzọ ihu Jisus imata onye Ọ bu; ma ọ pughi n'ihi ìgwè madu, n'ihi na o toghi ogologo.[4] O we b͕a ọsọ ga n'iru, we rigo n'osisi sycomore ka ọ hu Ya anya: n'ihi na Ọ gaje igabiga n'uzọ ahu.[5] Mb͕e Jisus biaruru ebe ahu, O we le anya n'elu, si ya, Zakiọs, me ngwa, ridata; n'ihi na aghaghi m inọdu n'ulo-gi ta.[6] O we me ngwa, ridata, were kwa ọṅù kpọbata Ya.[7] Mb͕e ha huru ya, ha nile we nātamu, si, Ọ bàra inọ ọnọdu-abali n'ulo nwoke bu onye-nmehie.[8] Zakiọs we guzọ, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m'nwere ka m'gēnye ndi-ob͕eye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n'ebubo ugha, m'gēnyeghachi anọ anọ.[9] Jisus we si ya, Ta ka nzọputa biaruru ulo a, ebe ya onwe-ya bu kwa nwa Abraham.[10] N'ihi na Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu.

MAK 4:19
ma ncheb͕u nile nke oge a, na aghughọ nke àkù, na nbata nke agu ihe di iche iche ọzọ, nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.

LUK 18:18-30
[18] Otù onye-isi we jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi?[19] Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke.[20] I matawo ihe nile enyere n'iwu, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Sọpuru nna-gi na nne-gi.[21] Ma ọ siri, Ihe ndia nile ka m'ribara ama site n'okorọbia.[22] Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ya, Otù ihe fọdu-kwa-ra gi ime: re ihe nile, ka ha ra, bú nke i nwere, kenye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.[23] Ma mb͕e ọ nuru ihe ndia, o wutara ya nke-uku; n'ihi na ọ bu oké ọgaranya.[24] Ma ebe Jisus huru ya, Ọ si, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke![25] N'ihi na ọ dikariri kamel nfé isite n'anya àgìgá ba nime, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke.[26] Ma ndi nuru ya siri, Ònye kwa ka apuru izọputa?[27] Ma Ọ siri, Ihe anāpughi ime n'ebe madu nọ apuru ime n'ebe Chineke nọ.[28] Pita we si, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile nke aka ayi, we so Gi.[29] O we si ha, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu nwunye, ma-ọbu umu-nne, ma-ọbu ndi muru ya, ma-ọbu umu, n'ihi ala-eze Chineke,[30] nke nāgaghi-anata kari ọtutu ihe n'oge a, nata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia.

NKPUGHE 3:17
N'ihi na i nāsi, Abum ọgaranya. emewo ka m'buru ọgaranya, ọ dighi kwa ihe ọ bula nākpam; i mataghi kwa na gi onwe-gi bu onye ahu nāhuju anya na onye kwesiri ebere na onye dara ob͕eye na onye kpuru ìsì na onye nāb͕a ọtọ:

LUK 16:1-3
[1] O we si kwa ndi nēso uzọ-Ya, Otù ọgaranya di, nke nwere onye nāchi èzí-na-ulo-ya; onye a ka eboro n'iru ya na ọ nēmefu ihe o nwere.[2] Ọ we kpọ ya, si ya, Ọ̀ bu gini bu nka nke m'nānu bayere gi? kọrọm akukọ nke ọchichi-èzí-na-ulo-gi; n'ihi na i pughi ichi èzí-na-ulo ọzọ.[3] Onye ahu nke nāchi èzí-na-ulo we kwue n'onwe-ya, si, Gini ka m'gēme, n'ihi na onye-nwem nānapum ọchichi-èzí-na-ulo a? Enweghi m ike igwu ala; ihere iriọ aririọ nēmem.

MAK 12:43-44
[43] O we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si ha, N'ezie asim unu, Nwanyi a, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, ọ tubàra kari ndi nile nātubà nime ebe ùtú ahu:[44] n'ihi na ha nile sitere n'inwebiga-àkù-ókè-ha tubà; ma nwanyi ahu sitere n'ukọ-ya tubà ka ihe nile nke o nwere ra, bú ihe dum o ji biri.

LUK 19:1-27
[1] O we ba na Jeriko nāgabiga kwa n'etiti ya.[2] Ma le, otù nwoke anākpọ aha-ya Zakiọs; onye ahu bu kwa onye-isi-ọna-utu, onye ahu bu kwa ọgaranya.[3] O we chọ uzọ ihu Jisus imata onye Ọ bu; ma ọ pughi n'ihi ìgwè madu, n'ihi na o toghi ogologo.[4] O we b͕a ọsọ ga n'iru, we rigo n'osisi sycomore ka ọ hu Ya anya: n'ihi na Ọ gaje igabiga n'uzọ ahu.[5] Mb͕e Jisus biaruru ebe ahu, O we le anya n'elu, si ya, Zakiọs, me ngwa, ridata; n'ihi na aghaghi m inọdu n'ulo-gi ta.[6] O we me ngwa, ridata, were kwa ọṅù kpọbata Ya.[7] Mb͕e ha huru ya, ha nile we nātamu, si, Ọ bàra inọ ọnọdu-abali n'ulo nwoke bu onye-nmehie.[8] Zakiọs we guzọ, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m'nwere ka m'gēnye ndi-ob͕eye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n'ebubo ugha, m'gēnyeghachi anọ anọ.[9] Jisus we si ya, Ta ka nzọputa biaruru ulo a, ebe ya onwe-ya bu kwa nwa Abraham.[10] N'ihi na Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu.[11] Ma mb͕e ha nānu ihe ndia, Ọ tukwasi tu ilu, n'ihi na Ọ nọ Jerusalem nso, na n'ihi na ha nēchè na ala-eze Chineke gaje iputa ìhè ngwa ngwa.[12] Ya mere Ọ siri, Otù nwoke amazuru aha-ya gara ala di anya, inara ala-eze nye onwe-ya, na ilaghachi.[13] O we kpọ madu iri nime ndi-orù-ya, nye ha ọgu pound abua na iri, si ha, Zuanu ahia rue mb͕e m'gābia.[14] Ma ndi-obodo-ya kpọrọ ya asì, ha we zìe ndi-ozi ga n'azu ya, si, Ayi achọghi ka nwoke a buru eze-ayi.[15] O we rue, mb͕e ọ laghachiri ọzọ, mb͕e ọ natasiri ala-eze-ya, na ọ siri ka akpọ ndi-orù ahu, ndi ọ nyereri ego ahu, ka ha biakute ya, ka o we mara ihe ha zutarari n'ahia.[16] Onye mbu we bia n'iru ya, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù ọgu pound abua na iri.[17] Ọ we si ya, I mere nke-ọma, ezi orù: n'ihi na ahuru na i kwesiri ka atukwasi gi obi n'ihe dikarisiri ntà, gi buru onye nāchi obodo iri.[18] Nke-abua we bia, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù orú pound na ise.[19] O we si kwa nwoke a, Gi onwe-gi buru kwa onye-isi nke obodo ise.[20] Orù nke di iche we bia, si, Onye-nwe-ayi, le pound ise nke gi, nke m'debere n'ákwà:[21] n'ihi na aturum gi egwu, n'ihi na i bu onye aka ike: i nēweli ihe i nātọb͕ọghi, i nēwe kwa ihe n'ebe ikọghi.[22] Ọ si ya, M'gēsite n'ọnu nke gi kpe gi ikpé, ajọ orù. I mara na mu onwem bu onye aka ike, nēweli ihe m'nātọb͕ọghri, nēwe kwa ihe m'nāghaghri;[23] n'ihi gini kwa ka i nējighi were egom nye ndi nāb͕anwe ego, mu onwem gānara kwa ya na uma mb͕e m'biara?[24] O we si ndi guzoro nso, Napunu ya pound ise ahu, were ha nye onye nwere ọgu pound abua na iri ahu.[25] Ha we si ya, Onye-nwe-ayi, o nwere ọgu pound abua na iri.[26] Asim unu, na onye ọ bula nke nwere ka agēnye; ma onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.[27] Otú ọ di, ndi-irom ndia, ndi nāchọghi ka m'buru eze-ha, kuta ha n'ebe a, b͕ue ha n'irum.

LUK 18:22-23
[22] Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ya, Otù ihe fọdu-kwa-ra gi ime: re ihe nile, ka ha ra, bú nke i nwere, kenye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.[23] Ma mb͕e ọ nuru ihe ndia, o wutara ya nke-uku; n'ihi na ọ bu oké ọgaranya.

MAK 12:41-44
[41] O we nọdu n'ulo uku Chineke na ncherita-iru ebe anēdebe ùtú anātu, O we nēle otú ìgwè madu nātubà ego n'ebe ùtú ahu: ọtutu ndi bu ọgaranya nātubà kwa ri nne.[42] Otù nwayi, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, we bia, tubà ego ntà abua, nke mere otù farthing.[43] O we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si ha, N'ezie asim unu, Nwanyi a, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, ọ tubàra kari ndi nile nātubà nime ebe ùtú ahu:[44] n'ihi na ha nile sitere n'inwebiga-àkù-ókè-ha tubà; ma nwanyi ahu sitere n'ukọ-ya tubà ka ihe nile nke o nwere ra, bú ihe dum o ji biri.

MATIU 25:14-30
[14] N'ihi na ọ di ka mb͕e madu, mb͕e ọ gaje inọdu n'ala ndi ọzọ, ọ kpọrọ ndi-orù nke aka ya, rara ihe nile o nwere nye n'aka-ha.[15] Otù ka ọ nyere talent ise, nke-ọzọ talent abua, nke-ọzọ otù talent; o nye onye ọ bula dika ike nke aka ya ra; o we je inọdu n'ala ndi ọzọ.[16] Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ.[17] Otú ahu onye nara talent abua ahu rita-kwa-ra talent abua ọzọ.[18] Ma onye nara otù talent ahu jere gwu ala, zobe ego onye-nwe-ya.[19] Ma mb͕e ogologo oge gasiri onye-nwe ndi-orù ahu bia, ya na ha we piazi.[20] Onye ahu nke nara talent ise we biakute ya weta talent ise ọzọ, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent ise nyem n'aka: le, eritaram talent ise ọzọ n'urù.[21] Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi: i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi.[22] Onye nara talent abua ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent abua nyem n'aka: le, eritaram talent abua ọzọ n'urù.[23] Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi; i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi.[24] Onye narari otù talent ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, amaram i na i bu madu aka ike, nēwe ihe ubi n'ebe i nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe i nāfuchagh:[25] m'we tua egwu, we je zobe talent nke gi n'ala: le, i nwere nke gi.[26] Ma onye-nwe-ya zara, si ya, Ajọ orù nke di ume-ngwu, i matara na anamewe ihe ubi n'ebe m'nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe m'nāfuchaghi;[27] ya mere, ọ di gi nkpà iwere egom tiye n'aka ndi nāb͕anwe ego, mb͕e m'biara mu onwem gānaghachi kwa nkem, ya na uma.[28] Ya mere, napunu ya talent ahu, were kwa ya nye onye ahu nke nwere talent iri ahu.[29] N'ihi na onye ọ bula nke nwere ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma site n'aka onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.[30] Tupu-kwa-nu orù a nābaghi n'ihe n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

MATIU 13:22
Onye agha-kwa-ra n'etiti ogwu ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu; ma ncheb͕u nke oge a na aghughọ nke àkù nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.

ILU 13:22
Ezi madu nēme ka umu umu-ya keta ihe-ya; Ma ihe anākpakọbara onye ezi omume ka àkù onye-nmehie bu.

ILU 3:9-10
[9] Sọpuru Jehova site n'àkù-gi, Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile:[10] Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ, Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu.

ILU 10:4
Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu: Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.

ILU 18:11
Àkù ọgaranya bu obodo-ya siri ike, Ọ di kwa ka mb͕idi di elu nime ntughari-obi-ya nile.

HOSEA 12:8
Efraim we si, N'ezie aghọwom ọgaranya, achọtaworom onwem àkù: ihe nile m'nādọb͕u onwem n'ọlu inweta agaghi-achọtaram ajọ omume nke bu nmehie.

ZEKARAIA 14:14
Ọzọ, Juda gēbuso kwa Jerusalem agha; agēkpokọta kwa àkù mba nile di buruburu, bú ọla-edo na ọla-ọcha na uwe bara uba nke-uku.

EKLISIASTIS 5:19
Ọzọ, madu ọ bula nke Chineke nyeworo àkù na ihe-nkpakọta, onye O mewo-kwa-ra ka o nwe ike iri nime ya, na ibūru òkè-ya, na iṅuri ọṅu nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu; nka bu onyinye Chineke.

EKLISIASTIS 6:2
madu onye Chineke nēnye àkù na ihe-nkpakọta na nsọpuru, ọ dighi kwa ihe kọnariri nkpuru-obi-ya nime ihe nile nke ọ nāchọsi ike, ma Chineke adighi-eme ka o nwe ike iri nime ya, kama onye ala ọzọ nēri ya; nka bu ihe-efu, ọria ọjọ ka ọ bu kwa.

DEUTERONOMI 8:18
Ma i gēcheta Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi na Ya onwe-ya bu onye nēnye gi ike imeta àkù; ka Ọ we me ka ọb͕ub͕a-ndu-Ya guzosie ike, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha, otú ọ di ta.

ILU 10:22
Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya, Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.

ABÙ ỌMA 37:16-17
[16] Ihe ntà onye ezi omume nwere di nma Kari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu.[17] N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu: Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume.

ILU 15:16-17
[16] Ọ di nma inwe ihe ntà n'egwu Jehova, Kari inwe ọtutu àkù ma ọb͕ub͕a-aghara adi ya.[17] Ọ di nma, bú òkè ihe-oriri nke bu nání akwukwọ nri, ma ihu-n'anya di n'ebe ahu, Kari ehi azùru azù ib͕u eb͕u, ma ikpọ-asì adi ya.

DEUTERONOMI 8:17-18
[17] i we si n'obi-gi, Ikem na ume akam emetaworom àkù a.[18] Ma i gēcheta Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi na Ya onwe-ya bu onye nēnye gi ike imeta àkù; ka Ọ we me ka ọb͕ub͕a-ndu-Ya guzosie ike, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha, otú ọ di ta.

ILU 10:15
Àkù nke ọgaranya bu obodo-ya siri ike: Nbibi nke ndi nēnweghi ike bu ob͕eye ha bu.

ABÙ ỌMA 39:4-6
[4] Jehova, me ka m'mara ọgwugwum, Na ọtùtù ubọchim nile, ihe ọ bu; Ka m mara ka msi buru ihe nākwusi akwusi.[5] Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka; Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah[6] N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari: N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara: Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha.

EKLISIASTIS 5:8-17
[8] Ọ buru na i hu na anēmeb͕u ob͕eye, na anānapu kwa ikpé ziri ezi na ezi omume n'ike n'ala anāchi achi, ibobo anwula gi n'ihe ahu anēme: n'ihi na otù Onye Nke di elu kari onye di elu nāriba ama; ndi di elu di kwa n'elu ha.[9] Ọzọ, njubiga-ókè nke ala, ọra madu ka ọ diri: ọbuná eze ka ubi nēfè òfùfè.[10] Onye nāhu ego n'anya, ego agaghi-eju ya afọ; ọzọ, onye nāhu inwe ihe bara uba n'anya, ihe onwunwe agaghi-eju ya afọ: nka bu kwa ihe-efu.[11] Mb͕e ezi ihe nāba uba, ndi nēri ya abawo kwa uba: òle ngazi ọ nāgaziri onye-nwe-ya, ma-ọbughi iji anya-ya abua hu ya?[12] Ihe utọ ka ura nke onye nāla ọlu ubi bu, ma ọ bu ihe ntà ma-ọbu ihe riri nne ka o nēri: ma afọ-ojuju nke ọgaranya adighi-ekwe ya araru ura.[13] Ihe ọjọ nke nēb͕u di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, bú àkù nke onye-nwe-ya nēdebe imejọ onwe-ya:[14] àkù ahu we la n'iyì site na nweda-n'ala ọjọ; ọ buru kwa na ọ muwo nwa-nwoke, ọ dighi ihe ọ bula di ya n'aka.[15] Dika o siri n'afọ nne-ya puta, puta n'ọtọ, out a ka ogālaghachi di ka ila dika o siri bia, ma ọ dighi ihe ọ bula o gēburu site na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, nke ọ gēwere n'aka-ya la.[16] Nka bu kwa ihe ọjọ nēb͕u nb͕u, na n'ihe nile dika o siri bia, otú a ka ọ gāla: ọ̀ bu kwa ole ihe fọduru ya na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu inwe ifufe?[17] Ọzọ, n'ubọchi-ya nile ọ bu n'ọchichiri ka o nēri ihe, anākpasu kwa ya iwe ri nne, o nwe-kwa-ra ọria na iwe.

ABÙ ỌMA 49:10-20
[10] N'ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu, N'otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n'iyì, We rapuru ndi ọzọ àkù-ha.[11] Èchìchè-obi-ha bu, na ulo-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi, Ebe-obibi-ha rue ọb͕ọ nile; Ha ewerewo aha-ha kpọkwasi ala nile ha.[12] Ma madu adighi-anọgide na nsọpuru: O yiri anu nke emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.[13] Uzọ-ha nka buru ha nzuzu: Ma mb͕e ha gasiri okwu-ọnu-ha nātọ madu utọ. Selah[14] Dika ìgwè ewu na aturu, ọ bu ala-mọ ka edoworo ha nye; Ọnwu gābu onye nāzù ha dika aturu: Ndi ziri ezi gēnwe ike n'aru ha n'ututu; Udi-ha bu ihe ala-mọ gēme ka ọ ka nká, ka ebe-obibi ghara idiri ya.[15] Otú ọ di, Chineke gāb͕aputa nkpuru-obim n'aka ala-mọ: N'ihi na Ọ gēkurum la. Selah[16] Atula egwu mb͕e madu nēme ọgaranya, Mb͕e nsọpuru nke ulo-ya nāba uba:[17] N'ihi na mb͕e ọ nwuru ọ gaghi-ewere ihe ahu nile la; Nsọpuru-ya agaghi-arida so ya.[18] N'ihi na mb͕e ọ di ndu ọ nāgọzi nkpuru-obi-ya, Madu nēkele kwa gi mb͕e i nēmere onwe-gi ezi ihe.[19] Ọ gābakuru ọb͕ọ nna-ya-hà; Rue mb͕e ebighi-ebi ha agaghi-ahu ìhè.[20] Madu nke nọ na nsọpuru, ma ọ dighi-aghọta ihe, Yiri anu emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.

ABÙ ỌMA 52:7
Le, nwoke nke nādighi-eme Chineke ebe-ya siri ike; Kama ọ tukwasiri obi n'uba nke àkù-ya, Ọ di ike n'ọchichọ ọjọ ya.

EKLISIASTIS 5:10
Onye nāhu ego n'anya, ego agaghi-eju ya afọ; ọzọ, onye nāhu inwe ihe bara uba n'anya, ihe onwunwe agaghi-eju ya afọ: nka bu kwa ihe-efu.

2 IHE EMERE 1:11-12
[11] Chineke we si Solomon, N'ihi na nka di n'obi-gi, ma i riọghi àkù, ma-ọbu ihe-nkpakọta, ma-ọbu nsọpuru, ma-ọbu ndu ndi nākpọ gi asì, i riọghi kwa ọtutu ubọchi; kama i riọworo onwe-gi amam-ihe na ihe-ọmuma, ka i we kpe ndim ikpe, bú ndi M'meworo gi eze-ha:[12] enyewo gi amam-ihe na ihe-ọmuma; M'gēnye kwa gi àkù, na ihe-nkpakọta, na nsọpuru, nke ndi-eze ndi buru gi uzọ nēnweghi otú a, ọ dighi kwa onye nke gēso gi gēnwe otú a.

1 EZE 3:11-13
[11] Chineke we si ya, N'ihi na i riọrọ ihe a, ma i riọghi nye onwe-gi ọtutu ubọchi; i riọghi kwa àkù nye onwe-gi, i riọghi kwa ndu ndi-iro-gi; kama i riọworo onwe-gi nghọta inu ikpé;[12] le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.[13] Ọzọ kwa, enyewom i ihe i nāriọghi, ma àkù ma nsọpuru, ya mere ọ dighi nwoke ọ bula n'etiti ndi-eze gādi ka gi ubọchi-gi nile.

ILU 28:8
Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa, Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.

ABÙ ỌMA 112:1-3
[1] Tonu Ja. Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke nātu egwu Jehova. Nke ihe nile O nyere n'iwu nātọ utọ nke-uku.[2] Ndi-dike ka nkpuru-ya gābu n'uwa: Agāgọzi ọb͕ọ ndi ziri ezi.[3] Ihe di iche iche di oké ọnu-ahia na àkù di n'ulo-ya: Ezi omume-ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

MATIU 6:33
Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.

MATIU 6:24
Ọ dighi onye ọ bula puru ibu orù nke nna abua: n'ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n'anya; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.

ILU 21:5
Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù: Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ.

DEUTERONOMI 15:11
N'ihi na ndi-ob͕eye agaghi-agwupu n'etiti ala: n'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I ghaghi isaghere nwa-nne-gi aka-gi, saghere onye nke gi ewedara n'ala, saghe-kwa-ra ob͕eye nke gi, n'ala-gi.

1 KỌRINT 16:2
Kwa ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa ka unu nile n'otù n'otù debe ihe n'ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara ùtú mb͕e ọ bula m'gābia.

1 PITA 5:2
Nāzùnu ìgwè aturu ntà Chineke nke di n'etiti unu, nēlekọta ha anya, ọ bughi n'ihi na nkpà nākpa unu, kama site n'ọchichọ obi, dika Chineke chọrọ; ọ bughi kwa n'ihi urù nēweta ihere, kama n'ihi na unu di ọku n'obi;

LUK 16:19-31
[19] Ma otù ọgaranya di, o nēyi kwa uwe ododo na ezi ákwà ọcha, ọ nēme kwa ka obi nātọ ya utọ nke-ọma kwa-ubọchi:[20] ma atọb͕ọrọri otù ob͕eye n'ọnu-uzọ-amá-ya, aha-ya bu Lazarọs, nke ọnyá juru ya n'aru,[21] onye ọ nāgu kwa ka ewere irighiri nri nke si na table nke ọgaranya ahu dapu me ka afọ ju ya; e, ọbuná nkita nābia racha ọnyá-ya.[22] O we rue na ob͕eye ahu nwuru, ndi-mọ-ozi we bupu ya ga n'ebe ọ dabere n'obì Abraham: ọgaranya ahu nwukwara, ewe lìe ya.[23] Nime Hedis o we welie anya-ya elu, ebe ọ nọ na nmekpa-aru, ọ hu Abraham n'ebe di anya, na Lazarọs ka ọ dabere n'obì-ya.[24] Ọgaranya ahu we kpọ òkù, si, Nna, Abraham, merem ebere, zite Lazarọs, ka ọ detu ọnu-ọ̀nu nkpisi-aka-ya na miri, we mejua irem; n'ihi na anọm n'aru-ufu nime ire-ọku a.[25] Ma Abraham síri, Nwam, cheta na i nara ezi ihe-gi na ndu-gi, otù ahu Lazarọs narakwara ajọ ihe-ya: ma ub͕u a anākasi ya obi n'ebe a, ma gi onwe-gi nọ n'aru-ufu.[26] Ma n'ihe ndia nile, emewo ka oké olùlù disie ike n'ab͕ata ayi na unu, ka ndi nāchọ isi n'ebe a gabiga ijekuru unu we ghara inwe ike, ka onye ọ bula ghara kwa isi n'ebe ahu gabiga biakute ayi.[27] O we si, Ya mere ariọm gi, nna, ka i ziga ya n'ulo nnam;[28] n'ihi na enwerem umu-nne ise; ka o we dọ ha aka na nti, ka ha onwe-ha ghara ibia kwa n'ebe nmekpa-aru a.[29] Ma Abraham siri, Ha nwere Moses na ndi-amuma; ka ha nuru olu-ha.[30] O we si, É-è, nna Abraham: kama ọ buru na otù onye esite na ndi nwuru anwu jekuru ha, ha gēchèghari.[31] O we si ya, Ọ buru na ha anughi olu Moses na ndi-amuma, agaghi-eme kwa ka ha kweye, asi na otù onye esi na ndi nwuru anwu bilie.

1 TIMỌTI 6:10
N'ihi na ihu ego n'anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche: nke ufọdu nāb͕asosi ike, ewe duhie ha n'okwukwe-ayi, ha were kwa ọtutu ihe-nb͕u dupue onwe-ha.

LUK 6:20
Ya onwe-ya we welie anya-Ya elu le ndi nēso uzọ-Ya, si, Ngọzi nādiri unu, bú ndi-ob͕eye: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke unu.

ILU 22:7
Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye, Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye.

MATIU 6:19-21
[19] Unu akpadola àkù n'uwa nye onwe-unu, ebe nla na nchala nērichapu, ebe ndi-ori nēgwupú kwa nēzu kwa ori:[20] kama kpadonu àkù n'elu-igwe nye onwe-unu, ebe nla ma-ọbu nchala nādighi-erichapu, ebe ndi-ori nādighi-egwupú kwa, ha adighi-ezu kwa ori:[21] n'ihi na ebe àkù-gi di, n'ebe ahu ka obi-gi gādi kwa.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006