A A A A A

Ndụ: [Amaokwu maka Womenmụ nwanyị]


ABÙ ỌMA 46:5
Chineke nọ n'etiti ya; agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Chineke gēyere ya aka mb͕e chi bọrọ.

ABÙ ỌMA 139:14
M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu: Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di; Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma.

1 TIMỌTI 3:11
Otú ahu ndinyom aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nādighi-ebo madu ebubo ugha, ndi nwere anya-udo, ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ihe nile.

1 KỌRINT 11:12
N'ihi na dika nwanyi siri na nwoke puta, otú a ka nwoke site-kwa-ra n'aka nwanyi; ma ihe nile si na Chineke puta.

1 KỌRINT 15:10
Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.

LUK 1:45
Ngọzi nādi-kwa-ra nwanyi ahu nke kwere na ihe ndia gēmezu, bú nke agwaworo ya site n'ọnu Onye-nwe-ayi.

ILU 11:16
Nwayi amara nējidesi nsọpuru ike: Ndi nēme ka madu ma jijiji nējidesi kwa àkù ike.

ILU 14:1
Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya: Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ji aka-ya abua akwada ya.

ILU 19:13
Ila-n'iyi nile n'ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu: Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu.

ILU 21:9
Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.

ILU 21:19
Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara, Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.

1 PITA 3:1-2
[1] Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n'ibi-obi nwunye-ha rita ha n'urù n'ebe anēkwughi okwu;[2] mb͕e ha nēle ibi-obi-unu di ọcha, ya na egwu.

EFESỌS 5:22-23
[22] Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu, dika n'okpuru Onye-nwe-ayi.[23] N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru.

ILU 31:16-17
[16] O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya: Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine.[17] O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké, Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.

TAITỌS 2:3-5
[3] otú ahu ka agadi-ndinyom di nsọ n'omume-ha, ghara ibu ndi nēbo ebubo ugha, ghara kwa ibu orù nke iṅubiga manya ókè, ka ha buru ndi nēzí ihe ọma;[4] ka ha we me ka ndi bu umu-ab͕ọghọ nwe uche zuru okè ibu ndi nāhu di-ha n'anya, ndi nāhu umu-ha n'anya,[5] ndi uche-ha zuru okè, ndi di ọcha, ndi nālu ọlu n'ulo, ezi madu, ndi nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha, ka ewe ghara ikwulu okwu Chineke:

JENESIS 2:18-24
[18] Jehova, bú Chineke, we si, Ọ dighi nma ka madu ahu nọ nání ya; M'gēmere ya onye-iye-aka kwesiri ya.[19] Jehova, bú Chineke, we site n'ala kpu anu-ọhia nile ọ bula, na anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; O we me ka ha biakute madu ahu, ihu ihe ọ gākpọ ha: ma aha ọ bula madu ahu nākpọ anu nwere nkpuru-obi di ndu, nke ahu bu aha-ya.[20] Madu ahu we kpọ anu-ulo nile na anu-ufe nke elu-igwe na anu-ọhia nile ọ bula aha; ma madu, ahughi onye-iye-aka kwesiri ya.[21] Jehova, bú Chineke, we me ka oké ura dakwasi madu ahu, o we raru ura; O we weputa otù nime ọgiriga-ya, mechie anu-aru n'ọnọdu-ya:[22] ọgiriga ahu, bú nke O weputara n'aru madu ahu, Jehova, bú Chineke, we wue ya dika ulo ka ọ ghọ nwanyi, O me ka ọ biakute madu ahu.[23] Madu ahu we si, Ehe! nka bu nọ ọkpukpu si n'ọkpukpum puta, na anu-aru si n'anu-arum puta: nka ka agākpọ Nwayi, n'ihi na eweputara nka n'aru Nwoke.[24] N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya: ha ewe ghọ otù anu-aru.

1 TIMỌTI 2:9-15
[9] Otú ahu, ezuberem ka ndinyom were ihe-ichọ-nma kwesiri ekwesi chọ onwe-ha nma, ya na nsọpuru na uche zuru okè; ọ bughi isi akpara akpa, na ọla-edo ma-ọbu pearl ma-ọbu uwe di oké ọnu-ahia;[10] kama (nke kwesiri ndinyom nēkwuputa egwu Chineke) ka ha site n'ezi ọlu chọ onwe-ha nma.[11] Ka nwanyi were nwayọ muta n'ido onwe-ya n'okpuru n'uzọ nile.[12] Ma ekweghm nwanyi ka o zí ihe, ma-ọbu ka ọ buru onye-isi n'ebe nwoke nọ, kama ka ọ nọ n'ọnọdu nwayọ.[13] N'ihi na Adam ka eburu uzọ kpu, mb͕e ahu ewe kpu Iv;[14] ọ bughi kwa Adam ka aghọrọ aghughọ, ma ebe aghọb͕uru nwanyi ọ bu nwanyi ahu ka ahuworo na ọ nọ nime njehie:[15] ma agēsite n'ọmumu-nwa-ya zọputa ya, ma ọ buru na ha anọgide nime okwukwe na ihu-n'anya na odido-nsọ, ya na uche zuru okè.

ILU 31:1-31
[1] Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti.[2] Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm? Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere?[3] Enyela ndinyom ike-gi, Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile.[4] Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine; Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di?[5] Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ, We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala.[6] Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine:[7] Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu, Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ.[8] Saghere onye-ob͕i ọnu-gi, N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì.[9] Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume, Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye.[10] Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya? N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku.[11] Obi di-ya atukwasiwo ya obi, Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu.[12] Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ, Ubọchi nile nke ndu-ya.[13] Ọ chọwo aji-anu na flax, We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.[14] Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia; Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya.[15] O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa, We nye ulo-ya nri, Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha.[16] O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya: Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine.[17] O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké, Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.[18] Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma: Oriọna-ya adighi-anyu n'abali.[19] Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho, Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike.[20] Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala; E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru.[21] Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe; N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.[22] Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya; Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu.[23] Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu, Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala.[24] Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya; Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.[25] Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya; Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì.[26] Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe; Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya.[27] Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma, Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri.[28] Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma; Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si:[29] Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma, Ma gi onwe-gi kachasi ha nile.[30] Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu: Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto[31] Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara; Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006