A A A A A

Ndụ: [Amaokwu Maka Menmụ nwoke]


1 KỌRINT 15:58
Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.

1 KỌRINT 16:13
Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.

1 PITA 5:5
Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.

1 TIMỌTI 4:8
n'ihi na ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru-Chineke bara urù nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndu, ma nke ndu ub͕u a, ma nke gaje ibia.

1 TIMỌTI 4:12
Ekwela ka onye ọ bula lelìa nwata i bu anya; kama me onwe-gi ka i buru ndi kwere ekwe ihe-atù, n'okwu, n'ibi-obi, n'ihu-n'anya, n'okwukwe, n'idi-ọcha.

2 KỌRINT 4:16
N'ihi nka ike agwughi ayi n'obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi.

DEUTERONOMI 8:3
O we weda gi n'ala, me ka agu gua gi, O we me ka i rie manna ahu, nke i nāmaghi, nke nna-gi-hà nāmaghi kwa; ka O we me ka i mara na ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu ihe nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Jehova puta ka madu gēji di ndu.

GALETIA 1:10
N'ihi na ọ̀ bu madu ka m'nēme ka ha kweye ub͕u a, ma-ọbu Chineke? ma-ọbu ànamachọ uzọ ime ihe gātọ madu utọ? ọ buru na anọm nēme ihe gātọ madu utọ, m'gaghi-abuwori orù nke Kraist.

HIBRU 4:12
N'ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n'ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi.

JEMES 5:16
Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.

JOSHUA 1:9
Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.

LUK 10:27
O we za, si, Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya site n'obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum; hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.

MAIKA 6:8
Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ̀ bu kwa gini ka Jehova nāchọ n'aka-gi, ma-ọbughi nání ime ihe ekpere n'ikpe, na ihu ebere n'anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije?

ILU 20:7
Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya, Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.

ILU 27:17
Ígwè nāmucha ígwè; Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.

ILU 24:5-6
[5] Onye mara ihe di ike; E, onye nwere ihe-ọmuma nēme ka ike nwe ume.[6] N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha: Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.

1 KỌRINT 10:12-13
[12] Ya mere, onye nēchè na o nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida.[13] Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.

MATIU 6:19-20
[19] Unu akpadola àkù n'uwa nye onwe-unu, ebe nla na nchala nērichapu, ebe ndi-ori nēgwupú kwa nēzu kwa ori:[20] kama kpadonu àkù n'elu-igwe nye onwe-unu, ebe nla ma-ọbu nchala nādighi-erichapu, ebe ndi-ori nādighi-egwupú kwa, ha adighi-ezu kwa ori:

ROM 12:1-2
[1] Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n'iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di.[2] Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè.

HIBRU 10:24-25
[24] ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche;[25] ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe-ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike; ka ayi me kari kwa otú a, n'uzọ ra otú unu nēle ubọchi ahu anya ka ọ nābiaru nso.

JEMES 1:19-20
[19] Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe:[20] n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke.

2 TIMỌTI 3:16-17
[16] Ihe ọ bula edeworo n'akwukwọ nsọ bu ihe si n'obi Chineke puta, ọ ba-kwa-ra urù iji zí ihe, na iji tu madu nmehie-ha n'anya, na iji me ka uche madu guzozie, na iji zùputa nzùputa nke di n'ezi omume:[17] ka onye nke Chineke we zue okè, onye emeworo ka o zue okè ilu ezi ọlu nile ọ bula.

1 TIMỌTI 6:11-12
[11] Ma gi onwe-gi, onye nke Chineke, nāb͕anari ihe ndia; ma nāb͕aso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ihu-n'anya, ntachi-obi, idi-nwayọ.[12] Nāb͕asi nb͕a ọma nke okwukwe ike, jide ndu ebighi-ebi aka nke akpọrọ gi ka i nata ya, i kwuputa-kwa-ra nkwuputa ọma ahu n'iru ọtutu ndi-àmà.

1 PITA 5:8-9
[8] Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:[9] ma nēguzogidenu ya, n'ihi na unu di ike n'okwukwe-unu, ebe unu matara na anēmezu otù ahuhu ahu n'aru ndi bu òtù umu-nna-unu ndi nọ n'uwa.

MAK 10:43-45
[43] Ma ọ dighi otú a n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi:[44] ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n'etiti unu, ọ gabu orù unu nile.[45] N'ihi na Nwa nke madu Onwe-ya abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu.

ABÙ ỌMA 1:1-3
[1] Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu, Nke nēguzoghi kwa n'uzọ ndi nmehie, Nke nānọghi kwa n'ọnọdu ndi nākwa emò.[2] Kama n'iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di; Ọ bu kwa n'iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali.[3] Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma.

ABÙ ỌMA 118:6-8
[6] Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem?[7] Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka: Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì.[8] Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi.

ABÙ ỌMA 119:9-11
[9] Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di.[10] Obim nile ka m'wereworo chọ Gi: Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.[11] N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006