A A A A A

Ndụ: [Mmekọahụ]


2 KỌRINT 12:21
ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia ọzọ, Chinekem gēwedam n'ala n'iru unu, m'ru-kwa-ra ọtutu madu újú n'etiti ndi mehieworo n'oge gara aga, ha echègharighi kwa n'adighi-ọcha na ikwa-iko na agu ikwa-iko nke ha mere.

EFESỌS 5:3
Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n'etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ;

EFESỌS 5:33
Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.

GALETIA 5:19
Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko,

JENESIS 2:24
N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya: ha ewe ghọ otù anu-aru.

HIBRU 13:4
Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.

1 KỌRINT 6:9
Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,

1 KỌRINT ೬:೧೮
B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya.

1 JỌN 1:9
Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka O we b͕aghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile.

MATIU 5:28
ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwanyi anya ka agu ya we gua ya, ọ kwasiwo ya iko n'obi-ya ub͕u a.

MAK 7:22-23
[22] ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche:[23] ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa, ha nēmeru madu.

1 TESALỌNAIKA 4:3-5
[3] N'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ, ka unu ghara ikwa iko;[4] ka onye ọ bula nime unu matara otú ọ gēnwe nwunye nke aka ya n'odido-nsọ na nsọpuru,[5] ọ bughi n'ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke;

MAK 10:6-9
[6] Ma site na nmalite òkìkè uwa, Nwoke na nwanyi ka O mere ha.[7] N'ihi nka ka nwoke gēji rapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya;[8] ha abua ewe ghọ otù anu-aru: ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru.[9] Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala.

ILU 5:15-19
[15] Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi, Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi.[16] Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí? Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi?[17] Ka ha diri nání gi onwe-gi, Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha.[18] Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi; Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia.[19] Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma, Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile; Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile.

1 KỌRINT 13:4-8
[4] Ihu-n'anya nwere ogologo-ntachi-obi, o nwe-kwa-ra obi-ọma; ihu-n'anya adighi-ekwo ekworo; ihu-n'anya adighi-anya isi, ọ dighi-afuli onwe-ya elu,[5] ọ dighi-eme ihe nādighi nma n'anya, ọ dighi-achọ ihe nke aka ya, oké iwe adighi-ewe ya, ọ dighi-agu ihe ọjọ emere ya;[6] ọ dighi-aṅuri ọṅu nime ajọ omume, ma ọ nēso ezi-okwu ṅurikọ ọṅu;[7] ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n'ihe nile.[8] Ihu-n'anya adighi-ada mb͕e ọ bula: ma ọ buru na ibu-amuma di, agēme ka ha ghara idi irè; ọ buru kwa na asusu di iche iche di, ha gāgwu; ọ buru kwa na ihe-ọmuma di, agēme ka ọ ghara idi irè.

ABÙ NKE ABÙ 7:6-12
[6] Le ka i si ma nma nke-uku, le kwa ka i si di utọ nke-uku, Gi ihu-n'anya, n'ihe-utọ nile![7] Ogologo-gi nka yiri nkwu, Ara-gi abua yiri uyọkọ nkpuru-vine.[8] M'siri, M'gārigo elu nkwu, M'gējide igu-ya aka: Biko, ka ara-gi abua di kwa ka uyọkọ osisi vine, Ka ísì utọ nke imi-gi di kwa ka nkpuru-osisi apple;[9] Ka okpo-ọnu-gi di kwa ka manya-vine makarisiri nma, Nke nāsughari n'iko nke-ọma nye onye ihe-ya nātọm utọ, Nke nērùbà nwayọ n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke ndi nāraru ura.[10] Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, N'arum ka ọchichọ-ya di kwa.[11] Bia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, ka ayi pua ba n'ọhia; Ka ayi nọ ọnọdu-abali n'obodo ntà.[12] Ka ayi bilie n'isi-ututu je rue ubi-vine nile; Ka ayi hu ma osisi vine amawo ifuru, Ma okoko-ya ab͕awawo, Ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko: N'ebe ahu ka m'gēnye gi ihu-n'anyam.

1 KỌRINT 6:13-20
[13] Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi:[14] ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n'ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n'ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n'ọnwu bilie.[15] Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n'aru Kraist? #m'gēwepu kwa ihe di n'aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n'aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela.[16] Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n'aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n'ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru.[17] Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ.[18] B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya.[19] Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;[20] n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006