A A A A A

Ndụ: [Mgbu]


JEREMAIA 29:11
N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.

ABÙ ỌMA 34:18
Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.

ABÙ ỌMA 147:3
Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu, Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha.

NKPUGHE 21:4
Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo.

MATIU 4:23-25
[23] Jisus we nējeghari na Galili dum, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n'etiti ndi ahu.[24] Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike.[25] Ọtutu ìgwè madu we si na Galili na Dekapọlis na Jerusalem na Judia na n'ofè Jọdan so Ya.

ABÙ ỌMA 23:1-6
[1] Jehova bu onye nāzùm dika aturu; ó dighi ihe kọrọm.[2] N'ebe-ita-nri nke ahihia ndu ka O nēme ka m'makpu: N'akuku miri nke izu-ike ka Ọ nedum nwayo.[3] Ọ nēweghachi nkpuru-obim: Ọ nēdum n'uzọ nile nke ezi omume n'ihi aha-Ya.[4] Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, M'gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n'ihi na Gi onwe-gi nọyerem: Ndele-Gi na nkpa-n'aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.[5] I nēdo table n'usoro n'irum n'anya ndi nākpab͕um: I tewo isim manu; ikom bu inwebiga-ihe-ókè.[6] Nání idi-nma na ebere gāb͕asom ubọchi nile nke ndum: M'gēbi kwa n'ulo Jehova rue ogologo ubọchi nile.

2 KỌRINT 1:3-8
[3] Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile;[4] Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.[5] N'ihi na dika ahuhu nile Kraist huru nābabiga ókè n'ebe ayi nọ, otú a ka nkasi-obi-ayi nābabiga kwa ókè site n'aka Kraist.[6] Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n'itachi obi n'otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa:[7] olile-anya-ayi bayere unu nēguzosi kwa ike; ebe ayi matara na, dika unu bu ndi nēnwekọ ahuhu nile, otú a ka unu nēnwekọ kwa nkasi-obi ahu.[8] N'ihi na, umu-nnam, ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere nkpab͕u-ayi nke akpab͕uru ayi n'Esia, na esob͕uru ayi nke-uku ri nne, kari ike-ayi, ya mere ayi nwebigara obi abua ókè ma ayi gādi kwa ndu:

1 PITA 4:12-19
[12] Ndi m'huru n'anya, unu echèla èchichè bayere ọnwunwa ọku ahu nke di n'etiti unu, nke nābiakwasi unu inwa unu, na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula, dika agāsi na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula nādakwasi unu:[13] kama ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāṅurinu ọṅu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ṅuria nime nkpughe nke ebube-Ya.[14] Ọ buru na anāta unu uta n'aha Kraist, ngọzi nādiri unu; n'ihi na Mọ nke ebube na Mọ nke Chineke nānọgide n'aru unu.[15] N'ihi na, ka onye ọ bula n'etiti unu ghara ihu ahuhu dika ob͕u-madu, ma-ọbu onye-ori, ma-ọbu onye nēme ihe ọjọ, ma-ọbu dika onye nēle ihe nābughi nke aka ya anya:[16] ma ọ buru na onye ọ bula nāhu ahuhu dika Kristian, ka ihere ghara ime ya; ma ka o nye Chineke otuto n'aha nka.[17] N'ihi na oge ahu eruwo ka esite n'ulo Chineke malite ikpe ikpé: ma ọ buru na o buru uzọ site n'aru ayi malite, gini gābu ọgwugwu nke ndi nēkweyeghi ozi ọma nke Chineke?[18] Ọ buru kwa na ọ di ike izọputa onye ezi omume, òle ebe agēgosi onye nādighi-asọpuru Chineke na onye-nmhie?[19] Ya mere ka ndi nāhu ahuhu dika ọchichọ Chineke si di were kwa nkpuru-obi-ha n'ime ezi ihe nye n'aka Onye-òkìkè kwesiri ntukwasi-obi idebe.

JỌN 16:16-24
[16] Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam.[17] Ya mere ufọdu nime ndi nēso uzọ-Ya siritara ibe-ha, Gini bu okwu a nke Ọ nāgwa ayi, si, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam: na, N'ihi na anamalakuru Nnam?[18] Ya mere ha nāsi, Gini bu okwu a nke Ọ nēkwu, Ọ fọduru nwa oge? Ayi amataghi ihe Ọ nēkwu.[19] Jisus mara na ha nāchọ iju Ya, O we si ha, Ùnu nājurita onwe-unu ihe bayere nka, na M'siri, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam ọzọ; ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam?[20] N'ezie, n'ezie, asim unu, na unu onwe-unu gēti nkpu ákwá, kwa kwa ákwá, ma uwa gāṅuri ọṅu: ọ gēwuta unu onwe-unu, ma nwuta-unu gāghọ ọṅù.[21] Nwanyi, mb͕e ọ bula ime nēme ya, o nwere ihe-nwuta, n'ihi na oge hour ya abiawo: ma mb͕e ọ bula ọ muputara nwa, o chetaghi ahuhu-ya ọzọ, n'ihi ọṅù-ya na amuputara madu n'uwa.[22] Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M'gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu.[23] N'ubọchi ahu ọ dighi ihe ọ bula unu gājum. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu gāriọ Nnam ihe ọ bula, Ọ gēnye unu ya n'aham.[24] Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.

HIBRU 12:1-11
[1] Ya mere ka ayi onwe-ayi, ebe ayi nwere oké ìgwè ndi-àmà di otú a ndi b͕ara ayi gburugburu dika igwe-oji, ka ayi tupu kwa ibu nile ọ bula, ya na nmehie ahu nke nārapara ayi n'aru nke-uku, ka ayi were kwa ntachi-obi b͕a ọsọ ahu edebere ayi n'iru,[2] nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke.[3] na n'ihi ya, tugharianu uche n'Onye ahu Nke tachiworo obi na nkwugide di otú a, bú nke ndi-nmehie nēkwugide onwe-ha, ka ike ghara igwu unu, unu we da #mbà na nkpuru-obi-unu.[4] Unu akēguzogideghi rue ọbara, n'ib͕a nb͕a megide nmehie:[5] unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si, Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu, Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya;[6] N'ihi na onye Onye-nwe-ayi huru n'anya ka Ọ nēzí ihe site n'inye ya ahuhu, O nāpia kwa nwa ọ bula Ọ nānata utari.[7] Nātachinu obi ka ewe zí unu ihe site n'inye unu ahuhu; n'ihi na Chineke nēmeso unu dika umu; n'ihi na ònye bu nwa ahu nna-ya nādighi-ezi ya ihe site n'inye ya ahuhu?[8] Ma ọ buru na adighi-ezí unu ihe site n'inye unu ahuhu, nke emeworo unu niile ka ha buru ndi-nketa, ya mere unu bu umu iko, unu abughi kwa umu n'ezie.[9] Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu?[10] N'ihi na ndi ahu nezí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu n'ezie ubọchi ole-na-ole otú ọ di ha nma; ma Ya onwe-ya nēzí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu ka o we bara ayi urù, ka ayi we keta idi-nsọ-Ya.[11] Ozizí nile site n'inye ahuhu nādi ka ihe nādighi-eweta ọṅù n'oge di ub͕u a, kama nwuta: ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n'udo, bú nkpuru nke ezi omume.

ROM 8:18-28
[18] N'ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ub͕u a ekwesighi ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n'ebe ayi nọ.[19] N'ihi na olile-anya siri ike nke ihe nile ekère èkè nēchesi nkpughe nke umu-ndikom Chineke ike.[20] N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya;[21] n'ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n'ibu-orù nmebi ba n'ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke.[22] N'ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a.[23] Ma ọ bughi nání nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mb͕e ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú nb͕aputa nke aru-ayi.[24] N'ihi na ọ bu n'olile-anya ka azọputara ayi: ma olile-anya nke anāhu anya abughi olile-anya: n'ihi na ihe madu nāhu anya, gini mere o ji nēle anya ya?[25] Ma ọ buru na ayi nēle anya ihe ayi nāhughi anya, ayi ji ntachi-obi nēchesi ya ike.[26] Otù ahu Mọ Nsọ nēye-kwa-ra adighi-ike-ayi aka: n'ihi na ayi amataghi ihe ayi gēkpe n'ekpere dika ayi nāghaghi ikpe; kama ọ bu Mọ Nsọ onwe-ya were isu-udè anāpughi ikwu nāriọrọ ayi aririọ;[27] ma Onye ahu Nke nēnyocha obi-ayi matara ihe Mọ Nsọ nātukwasi uche na ya, n'ihi na Ọ nāriọrọ ndi nsọ aririọ dika Chineke si chọ.[28] Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di.

ABÙ ỌMA 91:1-16
[1] Onye nēbi n'ebe-nzuzo nke Onye kachasi ihe nile elu, Ọ bu n'okpuru ǹdò nke Onye puru ime ihe nile ka ọ nānọ ọnọdu-abali.[2] M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike; I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi.[3] N'ihi na Ya onye-ya gānaputa gi n'ib͕udu nke osi-ọnyà, Na n'aka ajọ ọria nēfe efe nke nēweta ila-n'iyì.[4] Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi, Ọ bu kwa n'okpuru nkù-Ya abua ka i gāb͕àba: Ọta uku na ọta di buruburu ka ezi-okwu-Ya bu.[5] I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali, Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie;[6] Ma-ọbu site n'ajọ ọria nēfe efe nke nējeghari n'ọchichiri, Ma-ọbu site na nbipu nke nēbibi n'etiti-ehihie.[7] Nnù madu abua na ọgu iri gāda n'akuku-gi; Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n'aka-nri-gi; Ma ọ gaghi-abiaru gi nso.[8] Ọ bu nání na I gēji anya-gi abua legide, We hu nkwughachi nke ndi nēmebi iwu.[9] N'ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm; N'ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi;[10] Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi, Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi.[11] N'ihi na ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi, Idebe gi n'uzọ-gi nile.[12] N'elu ọbu-aka-ha ka ha gēburu gi, Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume.[13] Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu: I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri.[14] N'ihi na ọ huwom n'anya si-ike, M'gēme kwa ka ọ b͕aputa: M'gēme ka ọ nọ n'ebe di elu, n'ihi na ọ mawo aham.[15] Ọ gākpọkum, M'gāza kwa ya; Mu onwem gānọyere ya n'ahuhu: M'gādọputa ya, sọpuru kwa ya.[16] Ubọchi ndu di ogologo ka M'gēji me ka afọ ju ya, M'gēme kwa ka o lekwasi nzọputam anya.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006