A A A A A

Ndụ: [Egwu]


ABÙ ỌMA 95:1
Bianu, ka ayi tikue Jehova nkpu ọṅù: Ka ayi tikusie oké nkume nke nzọputa-ayi nkpu ọṅù ike.

EFESỌS 5:19
nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi;

HIBRU 2:12
Ọ si, Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi, N'etiti nzukọ-Gi k m'gābù abu nye Gi.

ABÙ ỌMA 71:23
Eb͕ub͕ere-ọnum abua gēti nkpu ọṅù mb͕e m'nābùku Gi abù ọma; Nkpuru-obim, nke I b͕aputaworo, gēti kwa nkpu ọṅù.

ỌPUPU 15:1
Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si, Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku: Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.

ABÙ ỌMA 105:2
Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma; Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.

ABÙ ỌMA 49:4
M'gātọ ntim n'ala n'ilu: M'gēkpughepu okwu-omimim n'ubọ-akwara.

ABÙ ỌMA 101:1
Ebere na ezi ikpé ka M'gābù n'abù: Gi, Jehova, ka m'gabùku abù ọma.

ABÙ ỌMA 150:1-5
[1] Tonu Ja. Tonu Chineke n'ebe nsọ Ya: Tonu Ya na mbara-ígwé nke ike-Ya.[2] Tonu Ya n'ihi idi-ike-Ya nile: Tonu Ya dika iba-uba nke idi-uku-Ya si di.[3] Werenu ọfufù opì-ike to Ya: Chirinu une na ubọ-akwara to Ya.[4] Werenu egwú-otiti na ite-egwú to Ya: Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọ̀jà to Ya:[5] Chirinu ájà nke anānu nke-ọma to Ya: Chirinu ájà nke nādasi udà ike to Ya.

KỌLỌSI 3:16
Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.

ABÙ ỌMA 98:1-7
[1] Bùkuenu Jehova abù ọhu; N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche; Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa.[2] Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya: N'anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya.[3] O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n'ebe ulo Israel di: Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi.[4] Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile: Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma.[5] Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma; Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma.[6] Chirinu opì na olu opì-ike Tisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova.[7] Ka oké osimiri bib͕ọ, na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi, na ndi bi nime ya;

NKPUGHE 14:3-4
[3] ha we nābù dika agāsi na ọ bu abù ọhu n'iru oche-eze ahu, na n'iru ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru imuta abù ahu ma-ọbughi ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ ahu, bú ndi ab͕atarari n'uwa.[4] Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n'aru ndinyom; n'ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n'etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu.

ABÙ ỌMA 135:3
Tonu Ja; n'ihi na Jehova di nma: Bùkuenu aha-Ya abù ọma; n'ihi na ọ di utọ.

EMOS 6:5
ndi nābùso olu une abù efu; dika Devid ka ha zuputaworo onwe-ha ubọ-abù di iche iche;

ABÙ ỌMA 57:7
Edoziwo obim Chineke, edoziwo obim: M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma.

2 IHE EMERE 5:13
o we rue, mb͕e ndi nāfù opì na ndi-ọbù-abù di ka otù onye, ime ka anu otù olu n'ito na n'ikele Jehova, mb͕e ha were kwa opì na ájà, na ihe abù, na otuto eji to Jehova, welie olu-ha elu, si, N'ihi na Ọ di nma: n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na igwe-oji juputara ulo ahu, bú ulo Jehova,

ABÙ ỌMA 40:3
Ọ we tiye abù ọhu n'ọnum, bú otuto diri Chineke-ayi: Ọtutu madu gāhu ya, tua egwu, We tukwasi Jehova obi.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006