A A A A A

Ndụ: [Ahụike]


1 KỌRINT 6:19-20
[19] Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;[20] n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.

3 JỌN 1:2
Onye m'huru n'anya, anamekpere Chineke ka ihe nile nāgara gi nke-ọma, ka i nwe kwa ezi ndu, dika ọ nāgara nkpuru-obi-gi nke-ọma.

1 KỌRINT 10:31
Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.

1 TIMỌTI 4:8
n'ihi na ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru-Chineke bara urù nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndu, ma nke ndu ub͕u a, ma nke gaje ibia.

ILU 17:22
Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma: Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.

ILU 31:17
O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké, Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.

EFESỌS 5:18
Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;

ILU 20:1
Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe.

DEUTERONOMI 7:12-15
[12] Ọ gēru kwa, n'ihi na unu nānu ikpé ndia, debe kwa ha, me kwa ha, na Jehova, bú Chineke-gi, gēdebe-kwa-ra gi ọb͕ub͕a-ndu ahu na ebere ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha:[13] Ọ gāhu kwa gi n'anya, gọzie gi, me ka i ba uba: Ọ gāgọzi kwa nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-gi, bú ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, n'elu ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.[14] Ndi agọziri agọzi ka i gābu kari ndi nile ọzọ: nwoke nēnweghi ike imu nwa na nwayi-àgà agaghi-adi n'etiti gi, ma-ọbu n'etiti anu-ulo-gi.[15] Jehova gēwezuga kwa n'aru-gi ọria nile; nriaria ọjọ nile nke Ijipt nke i maworo, Ọ gaghi-atukwasi kwa ha n'aru-gi, ma Ọ gētiye ha n'aru ndi nākpọ gi asì.

JEREMAIA 33:6
Le, M'gaje ime ka anu-aru ọhu puchie n'aru ya, ya na ngwọta, M'gāgwọta kwa ha; M'gēkpughe-kwa-ra ha nbabiga-ókè nke udo na ezi-okwu.

ỌLU OZI 27:34
N'ihi ya ariọm unu ka unu rie nri: n'ihi na nka diri nzọputa-unu: n'ihi na ọ dighi otù agiri-isi gēsi n'isi onye ọ bula n'etiti unu la n'iyì.

DEUTERONOMI 28:53
I gēri kwa nkpuru nke afọ-gi, bú anu-aru umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-gi nākpab͕u gi.

LEVITIKỌS 11:1-4
[1] Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si ha,[2] Gwanu umu Israel okwu, si, Ndia bu anu di ndu unu gēri n'etiti anumanu nile nke di n'elu uwa.[3] Anu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara, nke nātaghari kwa ọnu, n'etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri.[4] Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n'etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n'etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ọ bughi ihe ukwu-ya wara njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu.

NKPUGHE 14:12
N'ebe a ka ntachi-obi ndi nsọ di, bú ndi nēdebe ihe Chineke nyere n'iwu, na okwukwe Jisus.

ILU 16:24
Ub͕ub͕ọ-manu-aṅu ka okwu-ọnu utọ nile bu, Nke nātọ nkpuru-obi utọ, buru kwa ihe nāgwọ ọkpukpu n'ọria.

ILU 4:20-22
[20] Nwam, ṅa nti n'okwum nile; Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile.[21] Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Debe ha n'etiti obi-gi.[22] N'ihi na ndu ka ha buru ndi nachọta ha, Ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile.

ILU 3:7-8
[7] Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi:[8] Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi, Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile.

ỌPUPU 15:26
si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006