A A A A A

Ndụ: [Ibu Ọnụ]


1 KỌRINT 7:5
Unu emeb͕ula onwe-unu, ma-ọbughi ma eleghi anya unu gēsite n'inwe otù olu me ya na nwa oge, ka unu we nwe oghere ikpe ekpere, we nọkọ kwa ọzọ, ka Setan we ghara inwa unu n'ihi na unu apughi ijide onwe-unu.

2 SAMUEL 1:12
Ha we tie aka n'obi, kwa ákwá, bue ọnu rue anyasi, n'ihi Sọl, na n'ihi Jonatan nwa-ya, na n'ihi ndi Jehova, na n'ihi ulo Israel; n'ihi na ha dara site na mma-agha.

ỌLU OZI 13:2
Ma mb͕e ha nēfè Onye-nwe-ayi òfùfè, nēbu kwa ọnu, Mọ Nsọ siri, Kewaputaram Banabas na Sọl ilu ọlu nke M'kpọworo ha ka ha lua.

ỌLU OZI 14:23
Mb͕e ha rọputasiri ndi-okenye nime nzukọ Kraist nile n'otù n'otù nye ha, were kwa ọbubu-ọnu kpe ekpere, ha we rara ha nye n'aka Onye-nwe-ayi, bú Onye ha kwereri na Ya.

DANIEL 10:3
Nri anāchọsi ike nke-uku ka m'nērighi, anu na manya-vine abàghi kwa n'ọnum, eteghkwam onwem manu maọli, rue mb͕e ogologo ízù atọ ruzuru.

ESTA 4:16
Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n'uzọ di otú a ka m'gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n'iyì, alawom n'iyì.

ỌPUPU 34:28
Ọ we nọ n'ebe ahu, ya na Jehova, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri o riri, ọ dighi kwa miri ọ ṅuru. Ọ we de n'elu mbadamba nkume abua ahu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú okwu iri ahu.

JOEL 2:12
Ma ọbuná ub͕u a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), werenu obi-unu nile, werekwa obubu-ọnu, were kwa ikwa-ákwá, were kwa iti-aka-n'obi, chigharikutem:

LUK 2:37
o we nọdu n'ọnọdu nwanyi di-ya nwuru rue ọgu arọ anọ na anọ), onye nāpughi n'ulo Chineke, ma o were obubu-ọnu na aririọ nēkpere Chineke abali na ehihie.

LUK 18:12
Anamebu ọnu ub͕ò abua n'ízù ubọchi asa; anamenye otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile, ka ha ra, bú nke m'natara.

NEHEMAIA 1:4
O rue, mb͕e m'nuru okwu ndia, na anọdurum ala, kwa ákwá, rue újú ubọchi ufọdu; m'we bue ọnu, kpe kwa ekpere n'iru Chineke nke elu-igwe,

ABÙ ỌMA 69:10
M'we kwa ákwá n'obubu-ọnu nke nkpuru-obim, O we ghọrọm nání ihe-ita-uta.

ABÙ ỌMA 35:13-14
[13] Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe: Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu; Ekperem nālaghachikute kwa obim.[14] Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri: Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe.

JOEL 2:12-13
[12] Ma ọbuná ub͕u a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), werenu obi-unu nile, werekwa obubu-ọnu, were kwa ikwa-ákwá, were kwa iti-aka-n'obi, chigharikutem:[13] dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe-unu, chigharikute Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Onye-amara na Onye-obi ebere ka Ọ bu, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere, Ọ nēcheghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu Ọ gēweta.

ỌLU OZI 13:3-4
[3] Mb͕e ahu, mb͕e ha busiri ọnu kpe kwa ekpere bikwasi kwa ha aka n'isi, ha we zipu ha.[4] Ya mere ndi ahu, ebe Mọ Nsọ zipuru ha, ha ridata na Seleusia; ha we site n'ebe ahu ba n'ub͕o je Saiprọs.

DANIEL 9:3-5
[3] M'we che Onye-nwe-ayi Chineke irum, ichọ Ya n'ekpere na aririọ-amara di iche iche, n'obubu-ọnu na ákwà-nkpe na ntu.[4] M'we kpere Jehova, bú Chinekem, kwuputa, si, Biko, Onye-nwe-ayi, bú Chineke ahu Nke di uku di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n'anya, ndi nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere-Ya;[5] ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu, nupu isi, we si n'ihe nile I nyere n'iwu na n'ikpé-Gi nile wezuga onwe-ayi:

2 SAMUEL 12:15-17
[15] Netan we la n'ulo-ya. Jehova we tie nwata ahu ihe-otiti, bú nke nwunye Uraia muru nye Devid, o we nāria ọria nke-uku.[16] Devid we riosie Chineke aririọ ike bayere nwata ahu; Devid we nēbu ọnu, ba nime, dina ala ogologo abali nile.[17] Ndi-okenye ulo-ya we bilie n'akuku ya, ime ka o si n'ala bilie: ma o kweghi, o soghi kwa ha ri nri.

1 EZE 21:25-27
[25] (Otú ọ di, ọ dighi onye di ka Ehab, onye rere onwe-ya ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, onye Jezebel, bú nwunye-ya, rafuru.[26] Ọ we me ihe-árú nke-uku n'ijeso arusi di iche iche, dika ihe nile si di nke ndi-Amorait mere, ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.)[27] O rue, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, na ọ dọwara uwe-ya nile, tukwasi ákwà-nkpe n'anu-aru-ya, bue ọnu, dina n'ákwà-nkpe, jegharia nwayọ.

LUK 4:2-4
[2] ekwensu nānwà kwa Ya ọgu ubọchi abua. O righi kwa ihe ọ bula n'ubọchi ahu: mb͕e ubọchi ahu zuru, agu we gua Ya.[3] Ekwensu we si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọ ob͕e achicha.[4] Jisus we za ya, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu.

EZRA 8:21-23
[21] M'we kpọsa obubu-ọnu n'ebe ahu, n'akuku osimiri Ahava, iweda onwe-ayi n'ala n'iru Chineke-ayi ichọta n'aka-Ya uzọ ziri ezi nye onwe-ayi, nye kwa umu-ntakiri-ayi, nye kwa àkù-ayi nile.[22] N'ihi na emerem ihere iriọ n'aka eze usu-ndi-agha na ndi-inyinya iyere ayi aka n'ihi onye-iro nke di n'uzọ: n'ihi na ayi gwara eze okwu, si, Aka Chineke-ayi di n'aru ndi nile nāchọ Ya, ime ha nma; ma ike-Ya na iwe-Ya nēmegide ndi nile nārapu Ya.[23] Ayi we bue ọnu, riọ Chineke-ayi aririọ bayere nka: O we kwe ka ayi riọta ihe ayi riọrọ.

MATIU 6:16-18
[16] Ọzọ, mb͕e ọ bula unu nēbu ọnu, unu aghọla ndi nāb͕aru iru, dika ndi-iru-abua: n'ihi na ha nēmebi iru-ha, ka ha were onwe-ha gosi madu na ha nēbu ọnu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.[17] Ma gi onwe-gi, mb͕e i nēbu ọnu, were manu te n'isi-gi, sa kwa iru-gi;[18] ka i ghara igosi madu onwe-gi na i nēbu ọnu, kama gosi Nna-gi Nke di na nzuzo: Nna-gi, Nke nāhu ihe na nzuzo, gēnyeghachi kwa gi.

AISAIA 58:3-7
[3] Ha si, N'ìhi gini ka ayi būworo ọnu, ma I hughi? n'ìhi gini ka ayi wedaworo nkpuru-obi-ayi n'ala, ma I dighi-ama? Le, n'ubọchi obubu-ọnu-unu unu nāchọputa ihe nātọ unu utọ, ọ bu kwa ihe nile nke putara na ndọb͕u ndi-ọlu-unu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu ka unu nānara n'ihe-ike.[4] Le, ọ bu n'ihi ise-okwu na ilu-ọ̀gù ka unu nēbu ọnu, ya na iwere ọkpọ nke nmebi-iwu tib͕ue: unu adighi-ebu ọnu dika ta ime ka anuru olu-unu n'elu.[5] Ọ̀ bu dika nka ka obubu-ọnu nke M'nārọputa bu? bú ubọchi madu gēweda nkpuru-obi-ya n'ala? Ọ̀ bu iruda isi-ya n'ala dika amì, na ib͕asa-ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ya? ọ̀ bu nka ka i gākpọ obubu-ọnu na ubọchi nātọ Jehova utọ?[6] Ọ̀ bughi nka bu obubu-ọnu M'nārọputa? itọpu ab͕u nile nke nmebi-iwu, itọsa ihe-ọkiké nile nke yoke, na izilaga ndi anēmeb͕u emeb͕u ka ha nwere onwe-ha, ka unu tiji kwa yoke ọ bula?[7] Ọ̀ bughi ikèsara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n'ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n'ulo-gi? mb͕e i huru onye b͕a ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi?

JONA 3:5-9
[5] Ndi Nineve we kwere na Chineke; ha we kpọsa obubu-ọnu, yiri ákwà-nkpe, site n'onye uku ha we rue onye ntà ha.[6] Okwu ahu we rute eze Nineve aru, ọ we si n'oche-eze-ya bilie, yipu uwe-nwuda-ya n'aru ya, kpuchie onwe-ya n'ákwà-nkpe, nọkwasi na ntu.[7] O we tie nkpu, kwusa nime Nineve site n'iwu eze na ndi uku ya, si, Ka madu na anumanu, ma ìgwè ehi ma ìgwè ewu na aturu, ghara idetu ihe ọ bula n'ọnu: ka ha ghara izù onwe-ha, ghara kwa iṅu miri:[8] ma ka ha kpuchie onwe-ha n'ákwà-nkpe, ma madu ma anumanu, ka ha kpọkusi kwa Chineke ike: ka ha chighari kwa, onye ọ bula ya pua n'uzọ ọjọ ya, na n'ihe-ike nke di n'ọbu-aka-ha.[9] Ònye mara? eleghi anya Chineke gēchighari, chègharia uche, si n'iwe-Ya di ọku chigharia, ka ayi we ghara ila n'iyì.

LUK 18:1-12
[1] O we turu ha ilu izí ha na ha aghaghi ikpe ekpere mb͕e nile, na ighara ikwe ka ike gwu ha;[2] si, Otù onye-ikpé nọ n'otù obodo, onye nādighi-atu egwu Chineke, nke nādighi-asọpuru kwa madu:[3] otù nwanyi nke di-ya nwuru nọ kwa n'obodo ahu; nwanyi ahu we nābiakute ya, nāsi, Kpeputam n'aka onye-irom.[4] Ma na mbu ọ chọghi ime ya: ma emesia ọ siri n'onwe-ya, Ọ bu ezie na adighi m-atu egwu Chineke, adighm-asọpuru kwa madu;[5] ma n'ihi na nwanyi a di-ya nwuru nēsobum, m'gēkpeputa ya, ka ọ ghara ime ka ike gwusiam site n'ọbibia ọ nābia mb͕e nile.[6] Onye-nwe-ayi we si, Nurunu ihe onye-ikpé nke nēme ajọ omume kwuru.[7] Ma Chineke, Ọ̀ gaghi-ekpeputa ndi nke Ya arọputara, ndi nākpọku Ya ehihie na abali, O nwe-kwa-ra ogologo ntachi-obi n'ebe ha nọ?[8] Asim unu, na Ọ gēkpeputa ha ọsọsọ. Otú ọ di, mb͕e Nwa nke madu gābia, Ọ̀ gāhu okwukwe n'elu uwa?[9] O we tu kwa ilu a nye ufọdu ndi tukwasiri obi n'onwe-ha na ha bu ndi ezi omume, ndi kpọkwara ndi nile fọduru ihe-efu:[10] Ndikom abua rigoro n'ulo uku Chineke ikpe ekpere; otù nime ha bu onye-Farisi, ibe-ya bu onye-ọna-utu.[11] Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n'etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a.[12] Anamebu ọnu ub͕ò abua n'ízù ubọchi asa; anamenye otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile, ka ha ra, bú nke m'natara.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006