A A A A A

Ndụ: [Mmega]


LUK 22:25
O we si ha, Ndi-eze nke mba ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi nāchi kwa ha ka anākpọ ndi nālu ọlu ọma.

NKPUGHE 13:12
O we nāchi isi nile nke anu-ọhia mbu ahu n'iru ya. Ọ nēme kwa uwa na ndi bi nime ya ka ha kpọ isi ala nye anu-ọhia mbu ahu, nke emere ka ihe-otiti-ya nke nēweta ọnwu la.

MATIU 20:25
Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Unu amatawo na ndi bu isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha: ndi uku ha nāchi kwa ha.

MAK 10:42
Jisus we kpọ ha biakute Ya, si ha, Unu amatawo na ndi aguru ibu ndi-isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi uku ha nāchi kwa ha.

JEREMAIA 9:24
kama, onye nānya isi, ya nya isi na nka, na o nwere uche n'ebe M'nọ, we maram, na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ebere na ikpé ziri ezi na ezi omume n'uwa: n'ihi na ihe ndia atọwom utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

KỌLỌSI 2:23
Ọ bu ezie na ihe di otú a nwere nke anākpọ amam-ihe n'ikpe ekpere dika madu chọrọ, n'inwe kwa obi di ume-ala, n'ime kwa ka aru hu ahuhu; ma ha abughi ihe di oké ọnu-ahia ma-ọli megide ime ihe ọjọ nke gēju anu-aru afọ.

HIBRU 5:14
Ma nri siri ike bu nke ndi tozuru okè, ndi anwaworo nghọta-ha n'ihi omume ha nēme mb͕e dum itule ihe ọma na ihe ọjọ.

1 PITA 5:2
Nāzùnu ìgwè aturu ntà Chineke nke di n'etiti unu, nēlekọta ha anya, ọ bughi n'ihi na nkpà nākpa unu, kama site n'ọchichọ obi, dika Chineke chọrọ; ọ bughi kwa n'ihi urù nēweta ihere, kama n'ihi na unu di ọku n'obi;

EZIKIEL 22:29
Ndi ala nka emeb͕uwo emeb͕u, punara madu ihe n'ike; onye ewedara n'ala na ob͕eye ka ha meworo ihe-ike, ọ bu kwa ọbìa ka ha meb͕uworo n'ekpeghi ikpe.

MATIU 8:9
N'ihi na mu onwem bu kwa onye nọ n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya.

1 TIMỌTI 4:8
n'ihi na ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru-Chineke bara urù nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndu, ma nke ndu ub͕u a, ma nke gaje ibia.

1 KỌRINT 6:19-20
[19] Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;[20] n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.

FILIPAI 4:13
Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.

1 KỌRINT 10:31
Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.

2 TIMỌTI 2:5
Ma ọ buru kwa na onye ọ bula nāb͕a nb͕a, ekpughi ya okpu-nmeri, ma ọ buru na ọ b͕aghi nb͕a otú ọ di n'iwu.

1 TIMỌTI 2:12
Ma ekweghm nwanyi ka o zí ihe, ma-ọbu ka ọ buru onye-isi n'ebe nwoke nọ, kama ka ọ nọ n'ọnọdu nwayọ.

ILU 31:17
O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké, Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.

ROM 12:1
Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n'iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di.

ABÙ ỌMA 131:1
Jehova, nkpuru-obim adighi elu, anyam abua ebulighi kwa onwe-ha elu; Ejegharighkwam n'ihe uku di iche iche, Ma-ọbu n'oké ọlu di iche iche karirim.

ỌLU OZI 24:16
Nime nka ka m'nārughari kwa arum uka inwe akọ-na-uche nādighi-asu ngọngọ n'ebe Chineke na madu nọ mb͕e ọ bula.

1 TIMỌTI 4:7
ma ju akukọ-irò nile emeruru emeru nke di-kwa-ra agadi-ndinyom. Ma nānwa onwe-gi ka i we rue nsọpuru-Chineke:

HIBRU 12:2-11
[2] nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke.[3] na n'ihi ya, tugharianu uche n'Onye ahu Nke tachiworo obi na nkwugide di otú a, bú nke ndi-nmehie nēkwugide onwe-ha, ka ike ghara igwu unu, unu we da #mbà na nkpuru-obi-unu.[4] Unu akēguzogideghi rue ọbara, n'ib͕a nb͕a megide nmehie:[5] unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si, Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu, Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya;[6] N'ihi na onye Onye-nwe-ayi huru n'anya ka Ọ nēzí ihe site n'inye ya ahuhu, O nāpia kwa nwa ọ bula Ọ nānata utari.[7] Nātachinu obi ka ewe zí unu ihe site n'inye unu ahuhu; n'ihi na Chineke nēmeso unu dika umu; n'ihi na ònye bu nwa ahu nna-ya nādighi-ezi ya ihe site n'inye ya ahuhu?[8] Ma ọ buru na adighi-ezí unu ihe site n'inye unu ahuhu, nke emeworo unu niile ka ha buru ndi-nketa, ya mere unu bu umu iko, unu abughi kwa umu n'ezie.[9] Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu?[10] N'ihi na ndi ahu nezí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu n'ezie ubọchi ole-na-ole otú ọ di ha nma; ma Ya onwe-ya nēzí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu ka o we bara ayi urù, ka ayi we keta idi-nsọ-Ya.[11] Ozizí nile site n'inye ahuhu nādi ka ihe nādighi-eweta ọṅù n'oge di ub͕u a, kama nwuta: ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n'udo, bú nkpuru nke ezi omume.

1 PITA 2:14
ma-ọbu ndi-isi, dika ndi anēzite site n'aka-ya ka ha bọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nēme ihe ọjọ, ka ha to kwa ndi nēme ezi ihe.

1 PITA 2:1
Ya mere, tupunu ihe ọjọ nile, na aghughọ nile, na iru-abua, na ekworo, na nkwutọ nile di iche iche,

EKLISIASTIS 1:13
M'were kwa obim nye ichọ na iledo site n'amam-ihe ihe bayere ihe nile nke emeworo n'okpuru elu-igwe: nke ahu bu nweda-n'ala jọrọ njọ nke Chineke nyeworo umu nke madu ka ewere ya weda ha n'ala.

EKLISIASTIS 3:10
Ahuwom nweda-n'ala nke Chineke nyeworo umu madu iweda ha n'ala nime ya.

1 KỌRINT 6:19
Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;

3 JỌN 1:2
Onye m'huru n'anya, anamekpere Chineke ka ihe nile nāgara gi nke-ọma, ka i nwe kwa ezi ndu, dika ọ nāgara nkpuru-obi-gi nke-ọma.

1 KỌRINT 9:24-27
[24] Ùnu amataghi na ndi nāb͕a ọsọ n'ebe ọsọ, ha nile nāb͕a ọsọ, ma ọ bu otù onye nāb͕ata ihe ọsọ? Nāb͕anu otú a, ka unu we b͕ata.[25] Madu ọ bula nke nāb͕asi nb͕a ike ika ibe-ya n'egwú-unu nējide kwa onwe-ya n'ihe nile. Ya mere, ndi ahu nēme ya inata okpu-nmeri nke puru ire uré; ma ayi onwe-ayi nēme ya inata okpu-nmeri nke nāpughi ire uré.[26] Ya mere mu onwem nāb͕a ọsọ otú a, dika onye nādighi-ab͕a nēleghi anya ihe; otú a ka m'nēsu ọkpọ, dika onye nādighi-apia ifufe:[27] ma anametiputa arum ọnyá, me kwa ya ka ọ buru orùm: ka mu onwem ghara ighọ onye ajuru aju n'uzọ ọ bula, mb͕e m'kwusasiri okwu Chineke nye ndi ọzọ.

1 SAMUEL 16:7
Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi.

ABÙ ỌMA 104:9
I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya; Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa.

JENESIS 6:12
Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n'ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n'elu uwa.

JENESIS 7:20
Cubit iri na ise ka miri ahu di ike site n'elu ugwu; ewe kpuchie ugwu nile.

JENESIS 8:5
Miri we nēbilata mb͕e nile rue ọnwa nke-iri: n'ọnwa nke-iri ahu, n'ubọchi mbu nke ọnwa, ka ahuru elu ugwu.

JENESIS 9:11
M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ: agaghi-ebipu kwa anu-aru nile ọzọ site na miri nke iju-miri ahu; iju-miri agaghi-adi kwa ọzọ ibibi uwa.

1 PITA 3:3-4
[3] Ndi ichọ-nma-ha ka ọ ghara ibu ichọ-nma ahu nke aru nke bu ikpa isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, ma-ọbu iyikwasi ọtutu uwe;[4] kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n'uwe anāpughi imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n'anya Chineke.

2 TIMỌTI 4:7
Ab͕asiwom nb͕a ọma ahu, ab͕asiwom ọsọ ahu, edebesiwom okwukwe ahu:

1 KỌRINT 9:26-27
[26] Ya mere mu onwem nāb͕a ọsọ otú a, dika onye nādighi-ab͕a nēleghi anya ihe; otú a ka m'nēsu ọkpọ, dika onye nādighi-apia ifufe:[27] ma anametiputa arum ọnyá, me kwa ya ka ọ buru orùm: ka mu onwem ghara ighọ onye ajuru aju n'uzọ ọ bula, mb͕e m'kwusasiri okwu Chineke nye ndi ọzọ.

AISAIA 40:31
ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006