A A A A A

Ndụ: [Nghọta]


1 KỌRINT 2:14
Ma madu nke nkpuru-obi onwe-ya nāchi adighi-anata ihe nke Mọ nke Chineke: n'ihi na ha bu ihe-nzuzu n'anya-ya; ọ pughi kwa imara ha, n'ihi na ewere Mọ Nsọ sikwuputa ha.

1 KỌRINT 12:10
nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu:

1 KỌRINT 14:29-33
[29] Ka ndi-amuma kwu kwa okwu, madu abua ma-ọbu madu atọ, ka ndi ọzọ tule kwa.[30] Ma asi na ekpughere onye ọzọ nke nọdu n'akuku ya ihe, ka onye mbu kpuchie ọnu-ya.[31] N'ihi na unu nile puru ibu amuma n'otù n'otù, ka madu nile we muta ihe, ka ewe kasi kwa madu nile obi;[32] anēdo kwa mọ nile nke ndi-amuma n'okpuru ndi-amuma;[33] n'ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ.

1 JỌN 2:27
Unu onwe-unu kwa, otite-manu ahu nke unu natara n'aka-Ya nādigide nime unu, ọ dighi kwa unu nkpà ka onye ọ bula zí unu ihe; kama dika otite-manu-Ya nēzí unu ihe bayere ihe nile, dika ọ bu kwa ezie, nābughi kwa okwu-ugha, dika O zíkwara unu, nānọgidenu nime Ya.

1 JỌN 4:1
Ndi m'huru n'anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n'ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n'uwa.

1 EZE 3:9
Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n'ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe?

1 SAMUEL 16:7
Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi.

1 TESALỌNAIKA 5:21
nānwanu ihe nile; jidesienu ihe ọma ike;

1 TIMỌTI 4:1
Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ,

KỌLỌSI 2:8
Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n'anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n'ori, ihu-amam-ihe-n'anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di:

HIBRU 4:12
N'ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n'ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi.

HIBRU 5:14
Ma nri siri ike bu nke ndi tozuru okè, ndi anwaworo nghọta-ha n'ihi omume ha nēme mb͕e dum itule ihe ọma na ihe ọjọ.

HOSEA 14:9
Ònye bu onye-amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia; ònye bu onye-nghọta? ọ gāma kwa ha. N'ihi na uzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ije nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha.

JEMES 1:5
Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya.

JỌN 7:24
Unu elela iru kpe ikpé, kama nēkpenu ikpé ziri ezi.

MATIU 10:16
Le, Mu onwem nēzipu unu dika aturu n'etiti agu: ya mere, burunu ndi nwere uche dika agwọ, ndi nādighi kwa aghughọ dika nduru.

MATIU 24:24
N'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.

ILU 15:14-21
[14] Obi onye-nghọta nāchọ ihe-ọmuma: Ma ọnu ndi-nzuzu nāzù onwe-ya n'uche b͕agọrọ ab͕agọ dika anu-ulo.[15] Ubọchi nile nke onye ewedara n'ala jọrọ njọ: Ma onye obi-ya di nma nēri oké oriri mb͕e nile.[16] Ọ di nma inwe ihe ntà n'egwu Jehova, Kari inwe ọtutu àkù ma ọb͕ub͕a-aghara adi ya.[17] Ọ di nma, bú òkè ihe-oriri nke bu nání akwukwọ nri, ma ihu-n'anya di n'ebe ahu, Kari ehi azùru azù ib͕u eb͕u, ma ikpọ-asì adi ya.[18] Onye-ọnuma nākpali ise-okwu: Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.[19] Uzọ onye-ume-ngwu di ka ogige ogwu: Ma okporo-uzo ndi ziri ezi bu uzọ atuliri atuli.[20] Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya.[21] Uche b͕agọrọ ab͕agọ buru onye obi amam-ihe kọrọ ọṅù: Ma onye-nghọta nēme ka ije-ije-ya zie ezi.

ILU 18:15
Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma; Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma.

ILU 28:11
Onye mara ihe n'anya-ya ka ọgaranya bu; Ma onye nēnweghi ike nke nāghọta ihe nēgwuputa ala-ya.

ABÙ ỌMA 119:125
Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe, Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile.

ROM 12:2
Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè.

ỌLU OZI 17:10-11
[10] Ngwa ngwa umu-nna nime Kraist we zipu Pọl na Sailas n'abali igaru Beria: mb͕e ha ruru ebe ahu, ha ba nime ulo-nzukọ nke ndi-Ju.[11] Ma ndia ka ndi bi na Tesalọnaika nma n'obi, ebe ha were obi di ọku nile nara okwu ahu nke-ọma, nēnyocha ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ kwa-ubọchi, ma ihe ndia di otú a.

FILIPAI 1:9-10
[9] Nka ka m'nēkpe kwa ekpere, ka ihu-n'anya-unu we nābabiga kwa ókè kari nke-uku nime nmazu na nghọta nile;[10] ka unu we nwa ihe ha na ibe-ha di iche; ka unu we di ọcha n'obi ghara kwa isu ngọngọ rue ubọchi nke Kraist;

1 TIMỌTI 6:3-5
[3] Ọ buru na onye ọ bula nēzí ihe di iche, nēkweyeghi kwa n'okwu nēnye ezi ndu, bú okwu nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ozizí ahu nke di ka nsọpuru-Chineke si di;[4] afuliwo ya elu, ọ dighi ihe ọ mara, kama ọria bayere ajuju na esem-okwu n'ihi okwu efu nāria ya, nke ekworo, esem-okwu, nkwulu, ajọ èchìchè, nēsi nime ha nāputa,[5] bú iru-uka nke madu ndi mebiworo n'uche, ndi apunarawo-kwa-ra ha ezi-okwu, ebe ha nāgu na nsọpuru-Chineke bu uzọ irita urù.

2 KỌRINT 11:13-15
[13] N'ihi na madu di otú a bu ndi-ozi ugha, ndi-ọlu nātu ntu, ndi nēme onwe-ha ka ha yie ndi-ozi Kraist.[14] Ọ bughi kwa ihe iju anya; n'ihi na Setan onwe-ya nēme onwe-ya ka o yie mọ-ozi nke ìhè.[15] Ya mere ọ bughi ihe uku ma asi na ndi nējere ya ozi nēme kwa onwe-ha ka ha yie ndi nēje ozi ezi omume; ndi ọgwugwu-ha gādi ka ọlu-ha si di.

ILU 2:1-5
[1] Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile, Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ;[2] Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala, We wezuga obi-gi inwe nghọta;[3] E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku, Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;[4] Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha, Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:[5] Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova, Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.

ILU 3:1-6
[1] Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu:[2] N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, Na udo, ka ha gātukwasiri gi.[3] Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:[4] Chọta kwa amara na ezi uche N'anya Chineke na madu.[5] Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi:[6] N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006