A A A A A

Ndụ: [Ka nká]


1 TIMỌTI ५:८
Ma ọ buru na onye ọ bula ebughi uzọ chère ndi nke aka ya ihe nākpa ha, ma nke kachasi ndi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gọnariwo okwukwe-ayi, jọkari kwa onye nēkweghi ekwe na njọ.

2 KỌRINT 4:16
N'ihi nka ike agwughi ayi n'obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi.

DEUTERONOMI 32:7
Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ: Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi; Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi.

DEUTERONOMI 34:7
Moses b͕ara ọgu arọ isi mb͕e ọ nwuru: anya-ya adighi-ahu inyoghi-inyoghi, ume-ya apughi n'aru-ya.

EKLISIASTIS 7:10
Asila, Gini kpatara ubọchi mbu ji di nma kari ubọchi ndia? n'ihi na i siteghi n'amam-ihe ju ajuju bayere nka.

ỌPUPU 20:12
Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

JENESIS 6:3
Jehova we si, Mọm agaghi-achi achi nime madu rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na ya onwe-ya bu kwa anu-aru: ma ubọchi-ya nile gābu ọgu arọ isi.

JENESIS 25:8
Abraham we kubie ume, nwua n'ezi isi-awọ, buru agadi, ndu-ya jukwara ya afọ; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.

AISAIA 40:29
Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba.

AISAIA 46:4
ọzọ, rue agadi Mu onwem bu Onye ahu, ru kwa isi-awọ Mu onwem gēku unu n'aka: Mu onwem emewo, Mu onwem gēbu kwa; e, Mu onwem gēku n'aka me kwa ka unu wepuga onwe-unu.

JOB 5:26
I gābia n'ílì n'ezib͕o agadi, Dika obo ọka si ala elu na mb͕e-ya.

JOB 12:12-20
[12] Nime ndi kara nká ka amam-ihe di, N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.[13] N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di; Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.[14] Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ; Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.[15] Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ; Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.[16] N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di; O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama.[17] Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha, Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.[18] Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo, We ke ihe-ọkiké n'úkwù-ha.[19] Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha, Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.[20] Ọ nēwezuga okwu eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, Ezi uche nke ndi-okenye ka Ọ nēwepu kwa.

JOB 32:7
Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu, Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe.

JOEL 2:28
O gēru kwa ma emesia, na M'gāwusa Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, ndi-okenye-unu gārọ nrọ, umu-okorọbia-unu gāhu ọhù:

LEVITIKỌS 19:32
I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.

FAILIMON 1:9
ma n'ihi ihu-n'anya ahu ọ kam nma iriọ aririọ, ebe m'bu nání aha madu dika Pọl, bú agadi, buru kwa onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus ub͕u a:

ABÙ ỌMA 71:9
Etufulam na mb͕e agadi; Mb͕e ikem gwusiri arapulam.

ABÙ ỌMA 71:18
Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.

ABÙ ỌMA 73:26
Anu-arum na obim agwusiwo: Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi.

ABÙ ỌMA 90:10-12
[10] Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri; Ma ọ buru na ha esite n'idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ, Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n'ọlu na ajọ ihe; N'ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu.[11] Ònye mara ike nke iwe-Gi, Na nrubiga-ókè nke iwe-Gi dika egwu nke kwesiri Gi si di?[12] Si otú a me ka ayi mara iguta ubọchi-ayi, Ka ayi we me ka obi amam-ihe bia.

ABÙ ỌMA 91:16
Ubọchi ndu di ogologo ka M'gēji me ka afọ ju ya, M'gēme kwa ka o lekwasi nzọputam anya.

ILU 17:6
Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu; Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha.

ILU 20:29
Ima-nma umu-okorọbia ka ike-ha bu: Ihe-nsọpuru ndi-okenye ka isi-awọ bu kwa.

ILU 23:22
Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti, Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.

ABÙ ỌMA 37:35
Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji, Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya.

1 IHE EMERE 29:28
O we nwua n'ezi isi-awọ, ubọchi nile nke ndu-ya na àkù na nsọpuru ju-kwa-ra ya afọ: Solomon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

1 EZE 3:14
Ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu dika nna-gi, bú Devid, jere, M'gēme kwa ka ubọchi-gi di ogologo.

ABÙ ỌMA 103:5
Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi; Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo.

TAITỌS 2:3
otú ahu ka agadi-ndinyom di nsọ n'omume-ha, ghara ibu ndi nēbo ebubo ugha, ghara kwa ibu orù nke iṅubiga manya ókè, ka ha buru ndi nēzí ihe ọma;

1 TIMỌTI 5:1-2
[1] Abarala okenye oké nba, kama nāriọ ya aririọ dika nna; nēmeso kwa umu-okorọbia dika umu-nne:[2] ndinyom, ndi bu okenye, dika ndi bu nne; umu-ab͕ọghọ dika umu-nne-nwanyi, n'idi-ọcha nile.

ABÙ ỌMA 71:8-9
[8] Ọnum gējuputa n'otuto-Gi, Ogologo ubọchi nile ka ọ gējuputa kwa n'ima-nma-Gi.[9] Etufulam na mb͕e agadi; Mb͕e ikem gwusiri arapulam.

FILIPAI 3:20-21
[20] N'ihi na ala-ayi di n'elu-igwe ub͕u a; site n'ebe ayi nēchesi kwa Onye-nzọputa ike, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist:[21] Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n'okpuru Onwe-ya.

AISAIA 46:3-4
[3] Genum nti, unu uio Jekob, na ulo Israel nile fọduru afọdu, unu ndi bu ibu eboro ebo site n'afọ nne-unu, ndi eburu ebu site n'àkpà-nwa:[4] ọzọ, rue agadi Mu onwem bu Onye ahu, ru kwa isi-awọ Mu onwem gēku unu n'aka: Mu onwem emewo, Mu onwem gēbu kwa; e, Mu onwem gēku n'aka me kwa ka unu wepuga onwe-unu.

ABÙ ỌMA 92:12-15
[12] Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu: Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù.[13] Ndi akuworo n'ulo Jehova dika osisi Gāma akwukwọ n'ogige nile nke Chineke-ayi.[14] Ha gānọ nāmi nkpuru n'isi-awọ; Osisi nke miri di ha n'aru ri nne, nke nwezu-kwa-ra akwukwọ ndu, ka ha gābu.[15] Igosi na Jehova zirí ezi; Ọ bu oké nkumem, ọ dighi kwa ajọ omume di nime Ya.

EKLISIASTIS 12:1-7
[1] Cheta kwa Onye kèworo gi n'ubọchi nile i di n'okorọbia, mb͕e ubọchi ihe ọjọ akābiaghi, na mb͕e arọ akābiarughi nso, mb͕e i gāsi, Ha atọghim utọ;[2] mb͕e anyanwu na ìhè na ọnwa na kpakpando nile akāb͕achighi, igwe-oji we lata mb͕e oké miri zosiri:[3] n'ubọchi ahu mb͕e ndi nēdebe ulo gāma jijiji, mb͕e ndi bu dìnkpà gērulata onwe-ha, mb͕e ndinyom nke nēgwe nri gākwusi n'ihi na ha di ole-na-ole, mb͕e agēme ka anya b͕achie ndinyom nēsi na window elepu anya,[4] mb͕e agēmechi uzọ n'amá; mb͕e olu ogwugwe-nri gāla ala, mb͕e madu gēbili n'urá n'olu nnunu, mb͕e ndinyom nile nke nābù abù gādi ala ala;[5] ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu:[6] mb͕e akātọpughi udọ̀ ọla-ọcha, mb͕e akētiwaghi kwa ọkwa ọla-edo, mb͕e ite akādawaghi kwa n'isi-iyi, mb͕e akētiwaghi kwa wheel n'olùlù-miri;[7] ájá ewe laghachi n'ala dika o si diri, mọ alaghachikuru kwa Chineke Onye nyere ya.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006