A A A A A

Ezigbo agwa: [Afọ ojuju]


MATIU 6:25-33
[25] N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri, ma-ọbu ihe unu gāṅu; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. Ọ̀ bughi ndu kariri ihe eji azù ya, ọ̀ bughi kwa aru kariri uwe-oyiyi-ya?[26] Lenu anu-ufe nke elu-igwe, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewè kwa ihe-ubi, ha adighi-ekpokọta kwa ihe ba n'ọba; ma Nna-unu nke elu-igwe nāzù ha. Ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari ha?[27] Ma ònye n'etiti unu puru itukwasi otù cubit n'ogologo-ya site n'icheb͕u onwe-ya?[28] Gini mere unu nēcheb͕u kwa onwe-unu nye uwe-oyiyi? Ribanu urodi nke ubi ámá, otú ha nētó etó; ha adọb͕ughi onwe-ha n'ọlu, ha atughi kwa ogho:[29] ma asim unu, na ọbuná Solomon n'ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia.[30] Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia nke ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n'ite ọku, Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà?[31] Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu, si, Gini ka ayi gēri? ma-ọbu, Gini ka ayi gāṅu? ma-ọbu, Gini ka agēji b͕okwasi ayi?[32] N'ihi na ihe ndia nile ka ndi mba ọzọ nāchọ; n'ihi na Nna-unu nke elu-igwe nāmata na ihe ndia nile di unu nkpà.[33] Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.

2 KỌRINT 11:23-25
[23] Hà bu ndi nējere Kraist ozi? (anamekwu dika onye anya nādighi nma) mu onwem nēje kari; anamadọb͕ubiga onwem ókè n'ọlu kari, anamanọbiga ókè n'ulo-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n'ọnu ọnwu ọtutu mb͕e.[24] Ub͕ò ise ka ndi-Ju piaram otù adighi n'ọgu ube-utari abua.[25] Ub͕ò atọ ka apiaram utari, otù ub͕ò ka aturum nkume, ub͕ò atọ ka ub͕ọ m'nọ nime ya kpùru, otù ubọchi abali na ehihie ka m'nọworo nime ob͕u-miri;

FILIPAI 4:12-13
[12] Amataram uzọ iweda onwem, amata-kwa-ram uzọ ibabiga ókè: n'ihe ọ bula na n'ihe nile ezíwo mu ihe-omimi a, bú inọ n'afọ-ojuju na inọ kwa n'agu, ibabiga ókè na inọ kwa na nkpà.[13] Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.

1 TIMỌTI 6:10-11
[10] N'ihi na ihu ego n'anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche: nke ufọdu nāb͕asosi ike, ewe duhie ha n'okwukwe-ayi, ha were kwa ọtutu ihe-nb͕u dupue onwe-ha.[11] Ma gi onwe-gi, onye nke Chineke, nāb͕anari ihe ndia; ma nāb͕aso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ihu-n'anya, ntachi-obi, idi-nwayọ.

ILU 16:8
Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume, Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.

ILU 28:6
Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya.

EKLISIASTIS 3:13
Ọzọ kwa, madu ọ bula nke nēri ihe, nke nāṅu kwa ibe-ọṅuṅu, nke nāhu kwa ezi ihe na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, onyinye Chineke ka nke ahu bu.

ABÙ ỌMA 37:3-4
[3] Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe; Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi.[4] Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ; Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.

1 TIMỌTI 6:10-11
[10] N'ihi na ihu ego n'anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche: nke ufọdu nāb͕asosi ike, ewe duhie ha n'okwukwe-ayi, ha were kwa ọtutu ihe-nb͕u dupue onwe-ha.[11] Ma gi onwe-gi, onye nke Chineke, nāb͕anari ihe ndia; ma nāb͕aso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ihu-n'anya, ntachi-obi, idi-nwayọ.

ILU 16:8
Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume, Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.

ILU 28:6
Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya.

EKLISIASTIS 3:13
Ọzọ kwa, madu ọ bula nke nēri ihe, nke nāṅu kwa ibe-ọṅuṅu, nke nāhu kwa ezi ihe na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, onyinye Chineke ka nke ahu bu.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006