1 JỌN 4:17 |
Nime nka ka emeworo ka ihu-n'anya zue okè n'akuku ayi, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu n'ubọchi ikpé ahu; n'ihi na dika Ya onwe-ya di, ayi onwe-ayi di kwa otú a n'uwa nka. |
|
1 JỌN 5:14 |
Nkwuwa-okwu ahu nke ayi nwere n'ebe Ọ nọ bu nka, na ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchichọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi: |
|
2 IHE EMERE 32:8 |
nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda. |
|
EFESỌS 3:12 |
ọ bu kwa nime Ya ka ayi sitere n'okwukwe nke ayi kwere na Ya nwe nkwuwa-okwu na nkpọbata nime ntukwasi-obi. |
|
HIBRU 4:16 |
Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n'oge nkpà. |
|
AISAIA 32:17 |
Ihe ezi omume ahu gāluputa bu udo; ihe nke gēsi n'òfùfè ezi omume ahu puta bu kwa inọ-jū na ntukwasi-obi rue mb͕e ebighi-ebi. |
|
JEREMAIA 17:7 |
Onye agọziri agọzi ka nwoke ahu bu nke nātukwasi Jehova obi, onye Jehova bu ihe-ntukwasi-obi-ya. |
|
NEHEMAIA 6:16 |
O rue, mb͕e ndi-iro-ayi nile nuru ya, na mba nile nke di ayi buruburu turu egwu, we da ada nke-uku n'anya nke aka ha: ha we mara na esitere n'aka Chineke-ayi je ozi a. |
|
FILIPAI 1:6 |
ebe m'tukwasiworo obim n'otù ihe nka, na Onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisus Kraist: |
|
FILIPAI 4:13 |
Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike. |
|
ILU 3:26-32 |
[26] N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi, Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.[27] Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri, Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.[28] Asila madu-ibe-gi, Je, lata, Echi ka m'gēnye gi; Mb͕e ọ di n'aka-gi.[29] Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi, Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.[30] Gi na madu esela okwu n'efu, Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ.[31] Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo, Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile.[32] N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu: Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di. |
|
ABÙ ỌMA 20:7 |
Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya: Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi. |
|
FILIPAI 3:3-5 |
[3] n'ihi na ayi onwe-ayi bu ndi obibì-úgwù, ndi ji Mọ nke Chineke nēkpe ekpere, ndi nānya kwa isi nime Kraist Jisus, ndi natukwasighi kwa obi n'anu-aru-ayi:[4] ọ bu ezie na mu onwem puru itukwasi obi ọbuná n'anu aru: ọ buru na onye ọ bula ọzọ nēchè na ya puru itukwasi obi n'anu-aru, mu onwem puru itukwasi obi n'anu-aru kari:[5] ebìrim úgwù n'ubọchi nke-asatọ, esiterem n'umu Israel, site kwa n'ebo Benjamin, abum onye-Hibru nke sitere na ndi-Hibru; n'akuku iwu, abumri onye-Farisi; |
|
2 KỌRINT 3:1-4 |
[1] Àyi nāmalite ọzọ ime ka madu mara ayi? ma-ọbu ǹkpà akwukwọ-ozi ime ka madu mara ayi nākpa ayi inye unu ma-ọbu inara unu, dika ọ nākpa ufọdu?[2] Unu onwe-unu bu akwukwọ-ozi-ayi, nke edeworo nime obi-ayi, nke madu nile mara nāgu kwa;[3] ebe emere ka unu puta ìhè na unu bu akwukwọ-ozi Kraist, nke ayi jere ozi ya, nke anējighi ink de, kama ọ bu Mọ nke Chineke di ndu ka eji de ya; ọ bughi n'elu mbadamba nkume, kama ọ bu n'elu mbadamba ihe di iche, bú obi nke anu-aru.[4] Ntukwasi-obi di otú a ka ayi nwe-kwa-ra site n'aka Kraist n'ebe Chineke nọ: |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |