1 TIMỌTI 5:4 |
Ma ọ buru na nwanyi ọ bula di-ya nwuru nwere umu ma-ọbu umu umu, ka ha buru uzọ muta isọpuru Chineke n'aru ndi èzí-na-ulo nke aka ha, na inyeghachi ndi muru ha ihe: n'ihi na nka bu ihe anānara nke-ọma n'iru Chineke. |
|
1 TIMỌTI 3:15 |
ma ọ buru na m'nānọ ọdù, ka i we mata otú anāghaghi ibi obi n'èzí-na-ulo Chineke, ebe ọ bu nzukọ nke Chineke di ndu, bú ide na ntọ-ala nke ezi-okwu. |
|
JỌN 8:32 |
unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n'orù. |
|
NKPUGHE 17:5 |
edekwasi-kwa-rari aha n'egedege-iru-ya, bú IHE-OMIMI, BABILON UKU AHU, NNE NKE NDI NÁKWA IKO NA NKE IHE-ÁRÚ NILE NKE UWA. |
|
JEMES 1:27 |
Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa. |
|
JỌN 6:54 |
Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, o nwere ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. |
|
MAK 6:3 |
Nwoke a, Ọ̀ bughi onye-ọ̀kà ahu, nwa Meri, na nwa-nne Jemes, na Joses, na Judas, na Saimon? umu-nne-Ya ndinyom, hà anọghi kwa n'ebe a n'etiti ayi? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya. |
|
JỌN 14:6 |
Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu. |
|
JENESIS 1:1-7 |
[1] Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa.[2] Uwa we buru ihe tọb͕ọrọ n'efu na ihe tọb͕ọrọ nkití; ọchichiri di kwa n'elu ob͕u-miri: Mọ Chineke nērughari kwa n'elu miri.[3] Chineke we si, Ka ihè di: ìhè we di.[4] Chineke we hu ìhè ahu, na ọ di nma: Chineke we kpa ókè n'etiti ìhè ahu na ọchichiri ahu.[5] Chineke we kpọ ìhè ahu Ehihie, ọchichiri ahu ka Ọ kpọkwara Abali. Anyasi we di, ututu we di, buru otù ubọchi.[6] Chineke we si, Ka mbara di n'ab͕ata miri ahu, ka ọ nọ kwa nākpa ókè n'etiti miri na miri.[7] Chineke we me mbara ahu, kpa ókè n'etiti miri ahu nke di n'okpuru mbara ahu na miri ahu nke di n'elu mbara ahu: ọ we di otú a. |
|
1 TIMỌTI 5:8 |
Ma ọ buru na onye ọ bula ebughi uzọ chère ndi nke aka ya ihe nākpa ha, ma nke kachasi ndi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gọnariwo okwukwe-ayi, jọkari kwa onye nēkweghi ekwe na njọ. |
|
GALETIA 1:19 |
Ma ahughm onye ọzọ n'etiti ndi-ozi, ma ọ bu nání Jemes nwa-nne Onye-nwe-ayi. |
|
MALAKAI 1:11 |
N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. |
|
JENESIS 2:7 |
Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n'ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n'oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu. |
|
JỌN 3:3-5 |
[3] Jisus zara, si ya, N'ezie, n'ezie, asi mi, Ọ buru na amughi madu ọzọ, ọ pughi ihu ala-eze Chineke anya.[4] Nikọdimọs we si ya, Èsi aṅa pu imu madu mb͕e ọ kara nká? ọ̀ puru ibà n'afọ nne-ya nke ub͕ò abua, ewe mua ya?[5] Jisus zara, N'ezie, n'ezie, asim i, Ọ buru na amughi madu site na miri na Mọ Nsọ, ọ pughi ibà n'ala-eze Chineke. |
|
HIBRU 12:14 |
Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya: |
|
NKPUGHE 17:18 |
Ma nwanyi ahu i huru bu obodo uku ahu, nke nwere ala-eze nāchi ndi-eze uwa. |
|
MATIU 16:18 |
Ma Mu onwem si kwa gi, na gi onwe-gi bu Pita, ọ bu kwa n'elu oké nkume a ka M'gēwu nzukọm dika ulo; ọnu-uzọ nilenke Hedis agaghi-aka kwa ya n'ike. |
|
JENESIS 1:1 |
Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa. |
|
ỌPUPU 15:3 |
Jehova bu onye-agha: Jehova bu aha-Ya. |
|
NKPUGHE 17:9 |
N'ebe a ka uche nke nwere amam-ihe di. Isi asa ahu bu ugwu asa, nke nwanyi ahu nānọdu n'elu ha: |
|
FILIPAI 4:6-7 |
[6] Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ.[7] Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus. |
|
GALETIA 4:19 |
Umu-ntakirim, unu ndi ime unu nēmem ọzọ rue mb͕e agēme ka udi Kraist di nime unu, |
|
1 PITA 3:15 |
kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu: |
|
NKPUGHE 17:1 |
Otù mọ-ozi n'etiti ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu we bia, we kpayerem uka, si, Biari, m'gēgosi gi ikpé nke oké nwanyi ahu nākwa iko onye nānọkwasi n'ọtutu miri; |
|
MATIU 18:15-18 |
[15] Ọzọ, ọ buru na nwa-nna-gi emehie megide gi, je, tua ya nmehie-ya n'anya n'etiti nání gi na ya abua: ọ buru na ọ nuru olu-gi, i ritara nwa-nna-gi n'urù.[16] Ma ọ buru na ọ nughi, kuru otù madu ma-ọbu madu abua ọzọ tiyere onwe-gi, ka ewe me okwu ọ bula ekwuru ka o guzo n'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ.[17] Ma ọ buru na ọ ṅaghi ha nti, gwa nzukọm: ma ọ buru na ọ ṅaghi kwa nzukọm nti, ka ọ diri gi ka onye mba ozọ na onye-ọna-utu.[18] N'ezie asim unu, Ka ha ra, bú ihe unu gēke ab͕u n'elu uwa, agēke ha n'elu-igwe: ka ha ra kwa, bú ihe unu gātọpu n'elu uwa, agātọpu ha n'elu-igwe. |
|
EFESỌS 1:22-23 |
[22] O do-kwa-ra ihe nile n'okpuru ukwu-Ya abua, ọ bu kwa Ya onwe-ya ka O mere ka Ọ buru isi n'elu ihe nile n'ebe nzukọ-Ya nọ,[23] nke bu aru-Ya, ozuzù nke Onye ahu Nke nāluzu ihe nile nime madu nile. |
|
EFESỌS 5:23 |
N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru. |
|
ỌLU OZI 4:32 |
Ma ọra ndi kwere na Kraist nwere otù obi na otù nkpuru-obi: ọ dighi kwa otù onye n'etiti ha nāsi na ihe ọ bula nime ihe nile o nwere bu nke aka ya; kama ha nwekọrọ ihe nile. |
|
1 KỌRINT 1:10 |
Ma, umu-nnam, esiterem n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist riọ unu, ka unu nile nēkwu otù ihe, ka nkewa ghara kwa idi n'etiti unu; kama ka eme unu ka unu zue okè n'otù uche ahu na n'otù ìzù ahu. |
|
JỌN 12:48 |
Onye nājum, nke nādighi-anara kwa okwum, o nwere onye nēkpe ya ikpé: okwu nke M'kwuru, okwu ahu gēkpe ya ikpé n'ubọchi ikpe-azu. |
|
JỌN 14:28 |
Unu nuru na Mu onwem siri unu, Anamala, biakute kwa unu. Ọ buru na unu hurum n'anya, unu gāṅuwori ọṅu, n'ihi na anamagakuru Nnam: n'ihi na Nnam ka Mu onwem uku. |
|
HIBRU 1:14 |
Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa? |
|
MATIU 18:10 |
Lezienu anya ka unu ghara ilelì otù nime ndi ntà ndia anya; n'ihi na asim unu, na mb͕e nile ndi-mọ-ozi-ha n'elu-igwe nēlegide iru Nnam Nke bi n'elu-igwe. |
|
EFESỌS 6:12 |
N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe. |
|
JỌN 3:16 |
N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi. |
|
JỌN 17:17 |
Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu. |
|
NKPUGHE 2:9 |
Amataram nkpab͕u-gi, na ob͕eye i bu (ma i bu ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndi nāsi na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha bu ulo-nzukọ Setan. |
|
ABÙ ỌMA 68:5 |
Nna nke umu-nb͕ei, na onye-ikpe nke ndinyom di-ha nwuru, Ka Chineke bu n'ebe-obibi-Ya di nsọ. |
|
ABÙ ỌMA 146:9 |
Jehova nēdebe ndi ala ọzọ; Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ; Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ. |
|
GALETIA 2:10 |
ọ bu nání na ha chọrọ ka ayi cheta ndi-obeye; nke m'nuru ọku n'obi ime otù ihe ahu. |
|
ROM 3:23 |
n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke; |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |