A A A A A

Ezigbo agwa: [Nkwuwa okwu]


ỌLU OZI 4:29-31
[29] Ub͕u a, Onye-nwe-ayi, le kwa iba-nba-ha anya: nye kwa ndi-orù-Gi ike ka ha were nkwuwa-okwu nile kwue okwu-Gi,[30] n'iseti aka-Gi ime ka aru madu di ike; ka ewe me kwa ihe-iriba-ama na ọlu-ebube site n'aha Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus.[31] Mb͕e ha riọsiri aririọ, ewe me ka ebe ha nọ na nzukọ me nkpatu; ha nile we juputa na Mọ Nsọ, we were nkwuwa-okwu nēkwu okwu Chineke.

2 KỌRINT 3:12
Ya mere ebe ayi nwere olile-anya di otú a, ayi nēkwuwa okwu nke-uku,

ỌLU OZI 14:3
Ya mere ha nọgidere n'ebe ahu oge di anya, nēkwuwa okwu nime Onye-nwe-ayi, Onye nāb͕ara okwu amara-Ya àmà, ebe Ọ nēnye ka eme ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche site n'aka-ha.

ỌLU OZI 13:46
Pọl na Banabas we kwuwa okwu, si, Ọ di nkpà ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n'aru-unu, nekpe kwa onwe-unu ndi nēkwesighi ndu ebighi-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa ndi mba ọzọ okwu.

ỌLU OZI 19:8
O we ba n'ulo-nzukọ-ha, we nēkwuwa okwu ogologo ọnwa atọ, nāgwa ha okwu n'ihe nile bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka ha kweye ha.

FAILIMON 1:8
N'ihi nka, ọ bu ezie na enwerem oké nkwuwa-okwu nime Kraist iwere ihe nke kwesiri nye gi n'iwu,

ỌLU OZI 18:26
onye ahu we malite ikwuwa okwu n'ulo-nzukọ. Ma mb͕e Prisila na Akwila nuru okwu-ya, ha kutara ya n'ebe ha nọ, we kọrọ ya uzọ Chineke nke-ọma kari.

MAK 15:43
Josef nke Arimatia we bia, onye bu onye-nnọkọ-ikpé onye anāsọpuru, onye ya onwe-ya nēche kwa ala-eze Chineke; o were anya-ike bakuru Pailat, riọ aru Jisus.

ỌLU OZI 28:31
nēkwusa ala-eze Chineke, nēwere kwa nkwuwa-okwu nile zí ihe nile bayere Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ọ dighi onye nēb͕ochi ya.

ỌLU OZI 4:29-30
[29] Ub͕u a, Onye-nwe-ayi, le kwa iba-nba-ha anya: nye kwa ndi-orù-Gi ike ka ha were nkwuwa-okwu nile kwue okwu-Gi,[30] n'iseti aka-Gi ime ka aru madu di ike; ka ewe me kwa ihe-iriba-ama na ọlu-ebube site n'aha Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus.

ILU 28:1
Ndi nēmebi iwu ab͕alagawo mb͕e ọ dighi onye nāchu ha: Ma ndi ezi omume nwere ntukwasi-obi dika ọdum.

JENESIS 18:23-32
[23] Abraham we biarue nso, si, Ọ̀ gābu ezie na I gēkpochapu ndi ezi omume tinyere ndi nēmebi iwu?[24] Eleghi anya ọgu ndi ezi omume abua na iri di n'obodo ahu: ọ̀ gābu ezie na i gēkpochapu ebe ahu ghara ib͕aghara ya n'ihi ọgu ndi ezi omume abua na iri nọ nime ya?[25] Ya buru Gi ihe-árú ime dika ihe a si di, ime ka onye ezi omume so onye nēmebi iwu nwua, o we buru na dika ndi ezi omume si di, otú a ka ndi nēmebi iwu di; ya buru Gi ihe-árú: Onye-ikpé uwa nile, Ọ̀ gaghi-eme ihe ekpere n'ikpe?[26] Jehova we si, Ọ buru na achọtam nime Sọdọm ọgu ndi ezi omume abua na iri n'etiti obodo ahu, M'gāb͕aghara ebe ahu nile n'ihi ha.[27] Abraham we za, si, Biko, le, ejisiwom ike igwa Onye-nwe-ayi okwu, mu onwem, nke bu ájá na ntu:[28] eleghi anya madu ise agaghi-adi n'ọgu ndi ezi omume abua na iri ahu: Ì gēbibi obodo ahu nile n'ihi madu ise ahu nādighi ya? Ọ si, M'gaghi-ebibi ya, ma M'chọta n'ebe ahu ọgu abua na ise.[29] Ọ gwa kwa Ya okwu ọzọ, si, Eleghi anya agāchọta n'ebe ahu ọgu abua. Ọ si, M'gaghi-eme ya n'ihi ọgu abua ahu.[30] Ọ si, Biko, ka Onye-nwe-ayi ghara iwe iwe di ọku, ka m'kwu kwa okwu: eleghi anya agāchọta n'ebe ahu orú na iri. Ọ si, M'gaghi-eme ya, ma M'chọta n'ebe ahu orú na iri.[31] Ọ si, Biko, le, ejisiwom ike igwa Onye-nwe-ayi okwu: eleghi anya agāchọta n'ebe ahu orú. Ọ si, M'gaghi-ebibi ya n'ihi orú ahu.[32] Ọ si, Biko, ka Onye-nwe-ayi ghara iwe iwe di ọku, ka m'kwu kwa okwu nání otù ub͕ò a: eleghi anya agāchọta n'ebe ahu iri. Ọ si, M'gaghi-ebibi ya n'ihi iri ahu.

ABÙ ỌMA 138:3
N'ubọchi m'kpọkuru Gi ka I zaram, I nēji ike di na nkpuru-obim kpaliem.

EFESỌS 3:12
ọ bu kwa nime Ya ka ayi sitere n'okwukwe nke ayi kwere na Ya nwe nkwuwa-okwu na nkpọbata nime ntukwasi-obi.

JỌN 4:17
Nwanyi ahu zara, si Ya, Enweghm di. Jisus si ya, I kwuru nke-ọma, si, Enweghi m di:

HIBRU 10:19
Ya mere, umu-nnam, ebe ayi nwere nkwuwa-okwu ibà n'ebe nsọ ahu site n'ọbara Jisus,

HIBRU 4:16
Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n'oge nkpà.

HIBRU 13:6
Ya mere ayi were obi-ike si, Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka; Gini ka madu gēmem?

EFESỌS 6:19-20
[19] nēkpe kwa ekpere n'ihim, ka ewe nyem okwu n'isaghe ọnum, iwere nkwuwa-okwu me ka madu mara ihe-omimi nke ozi ọma,[20] nke m'bu ukọ̀ nime nkpọrọ n'ihi ya; ka m'we kwuwa okwu nime ya, dika m'nāghaghi ikwu.

ỌLU OZI 4:13
Ma mb͕e ha huru nkwuwa-okwu nke Pita na Jọn, mb͕e ha ghọta-kwa-ra na ha bu ndi nāmaghi ihe na ndi nāmutaghi akwukwọ ri nne, o ju ha anya; ha we mata ha, na ha na Jisus anọwori.

1 TIMỌTI 3:13
N'ihi na ndi jeworo ozi nke-ọma nēnwetara onwe-ha ọnọdu ọma, na oké nkwuwa-okwu nime okwukwe nke ekwere na Kraist Jisus.

1 TESALỌNAIKA 2:2
kama ọ bu ezie na ayi hururi ahuhu na mbu, eme kwa ayi ihe-ihere, dika unu matara, na Filipai, ma ayi kwuwara okwu nime Chineke-ayi igwa unu ozi ọma Chineke n'oké nb͕a.

FILIPAI 1:20
dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile.

2 TIMỌTI 1:7
N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè.

1 KỌRINT 16:13
Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.

ILU 14:26
N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di: Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà.

ABÙ ỌMA 27:14
Nēle anya Jehova: Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume; E, nēle anya Jehova.

ROM 1:16
N'ihi na ihere ozi ọma ahu adighi-emem: n'ihi na ọ bu ike nke Chineke rue nzọputa nye onye ọ bula nke kwere; onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa.

1 IHE EMERE 28:20
Devid we si Solomon nwa-ya, Di ike, nwe kwa ume, me ya: atula egwu, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova Chineke, bú Chinekem, nọyere gi; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi, rue mb͕e i jezuru ozi nile nke òfùfè ulo Jehova.

1 KỌRINT 15:58
Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.

EFESỌS 6:10
Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.

AISAIA 54:4
Atula egwu; n'ihi na ihere agaghi-eme gi: ka aghara itiye kwa gi n'ọnọdu-ihere; n'ihi na agaghi-eme gi ka i nwe iru-ihere: n'ihi na i gēchezọ ihere nke mb͕e i nọ na nwata, ọzọ, ita-uta nke ọnọdu nwayi di-ya nwuru i nọ, i gaghi-echeta ya ọzọ.

JỌN 14:27
Udo ka M'rapuru unu; udo nkem ka M'nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ.

MAK 5:36
Ma Jisus aṅaghi nti n'okwu anēkwu, Ọ si onye-isi ulo-nzukọ ahu, Atula egwu, kwere nání.

FILIPAI 1:28
ghara ikwe ka ndi nēmegide unu me ka unu tua ujọ n'ihe ọ bula: ebe nke ahu bu ihe nēme ka ila-n'iyì putara ha ìhè, ma ọ nēme ka nzọputa-unu puta ìhè, nka site-kwa-ra na Chineke;

JỌN 7:26
Ma le, Ọ nēkwuwa okwu, ma ha agwaghi Ya okwu ọ bula. Ọ̀ gābu na ndi-isi mara n'ezie na Onye a bu Kraist-ayi?

ỌLU OZI 5:29
Ma Pita na ndi-ozi zara, si, Ayi aghaghi ikweyere Chineke kari madu.

JOSHUA 1:7
Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje.

EZIKIEL 3:9
Dika nkume adamant nke di ike kari ọmu, otú a ka M'meworo egedege-iru-gi: atula egwu ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

ỌLU OZI 9:29
nēkwuwa okwu n'aha Onye-nwe-ayi: o we nāgwa ndi-Ju nāsu asusu Grik okwu, ya na ha nājurita kwa onwe-ha ajuju; ma ha tiyere aka-ha ib͕u ya.

FILIPAI 1:1
Pọl na Timọti, ndi-orù nke Kraist Jisus, nēdegara ndi nsọ nile nime Kraist Jisus ndi nọ na Filipai akwukwọ, ha na ndi nēlekọta unu anya na ndi nējere unu ozi:

1 TIMỌTI 3:1
Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, Ọ buru na onye ọ bula nāb͕aso ọnọdu onye nēlekọta nzukọ Kraist anya, agu ọlu ọma nāgu ya.

1 KỌRINT 3:12
Ma ọ buru na onye ọ bula ewukwasi ọla-edo, ọla-ọcha, nkume di oké ọnu, osisi, ahihia, okporo-ọka, n'elu ntọ-ala ahu;

HIBRU 10:1
N'ihi na iwu ahu, ebe o nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apughi ime ka ndi nābiaru ha nso zue okè mb͕e ọ bula, site n'otù àjà ndia nke ha nēche n'iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile.

1 PITA 5:10
Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006