A A A A A

Ezigbo agwa: [Tụkwasị obi]


AISAIA 12:2
Le, Chineke bu nzọputam; m'gātukwasi Ya obi, ghara itu egwu: n'ihi na ikem na abù ọmam ka Ja JEHOVA bu; O we ghọrọm nzọputa.

AISAIA 26:3-4
[3] I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n'udo: n'ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi.[4] Tukwasinu obi na Jehova rue mb͕e nile ebighi-ebi: n'ihi na Ja Jehova bu oké nkume nke mb͕e nile ebighi-ebi.

AISAIA 41:10
atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.

JEREMAIA 29:11
N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.

JỌN 10:10
Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè.

JỌN 14:1
Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu.

JOSHUA 1:9
Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.

FILIPAI 4:19
Ma Chinekem gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika àkù-Ya n'ebube si di, nime Kraist Jisus.

ILU 29:25
Egwu madu nēweta ọnyà: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu.

ABÙ ỌMA 9:10
Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi; N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.

ABÙ ỌMA 20:7
Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya: Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.

ABÙ ỌMA 28:7
Jehova bu ikem na ọtam; Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka: Obim we nāwuli elu n'ọṅù; M'gēsite kwa n'abùm kele Ya.

ABÙ ỌMA 32:10
Ọtutu ihe-nb͕u gādiri onye nēmebi iwu: Ma onye nātukwasi obi na Jehova, ebere gādi ya buruburu.

ABÙ ỌMA 37:5
Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru; Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.

ABÙ ỌMA 46:10
Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke: Agēbulim n'etiti mba nile, agēbulim n'uwa.

ABÙ ỌMA 118:8
Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi.

ABÙ ỌMA 143:8
Mem ka m'nuru ebere-Gi n'ututu; N'ihi na Gi ka m'tukwasiworo obi: Mem ka m'mara uzọ nke m'gēje ije nime ya; N'ihi na Gi ka m'buliworo nkpuru-obim nye.

ROM 8:28
Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di.

ROM 15:13
Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ.

ABÙ ỌMA 56:3-4
[3] N'ubọchi m'nātu egwu, Mu onwem, ọ bu Gi ka m'gātukwasi obi.[4] Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya: Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu; Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?

ABÙ ỌMA 62:7-8
[7] N'ebe Chineke nọ ka nzọputam na nsọpurum di: Oké nkume nke ikem, bú ebe-nb͕abàm, di nime Chineke.[8] Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya; Wusinu obi-unu n'iru Ya dika miri: Chineke buru ayi ebe-nb͕abà. Selah

ABÙ ỌMA 91:1-2
[1] Onye nēbi n'ebe-nzuzo nke Onye kachasi ihe nile elu, Ọ bu n'okpuru ǹdò nke Onye puru ime ihe nile ka ọ nānọ ọnọdu-abali.[2] M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike; I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi.

ABÙ ỌMA 112:6-7
[6] N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewezuga ya n'onọdu-ya: Ihe-ncheta ebighi-ebi ka onye ezi omume gābu.[7] Ọ gaghi-esite n'ihe ọjọ anuworo tu egwu: Edoziwo obi-ya, ebe ọ nātukwasi Jehova obi.

1 JỌN 5:14-15
[14] Nkwuwa-okwu ahu nke ayi nwere n'ebe Ọ nọ bu nka, na ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchichọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi:[15] ọ buru kwa na ayi matara na Ọ nānu olu-ayi n'ihe ọ bula ayi nāriọ, ayi matara na ayi nwere ihe-aririọ ahu ayi riọ̀woro n'aka-Ya.

ABÙ ỌMA 46:1-2
[1] Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile.[2] N'ihi nka ayi agaghi-atu egwu mb͕e uwa nāb͕anwe, Ma-ọbu mb͕e anēwezuga ugwu nile n'ọnọdu-ha ga n'etiti oké osimiri;

ILU 3:5-6
[5] Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi:[6] N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.

MATIU 6:25-26
[25] N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri, ma-ọbu ihe unu gāṅu; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. Ọ̀ bughi ndu kariri ihe eji azù ya, ọ̀ bughi kwa aru kariri uwe-oyiyi-ya?[26] Lenu anu-ufe nke elu-igwe, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewè kwa ihe-ubi, ha adighi-ekpokọta kwa ihe ba n'ọba; ma Nna-unu nke elu-igwe nāzù ha. Ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari ha?

JEREMAIA 17:7-8
[7] Onye agọziri agọzi ka nwoke ahu bu nke nātukwasi Jehova obi, onye Jehova bu ihe-ntukwasi-obi-ya.[8] Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku miri, ọ bu kwa n'akuku osimiri ka ọ nāwasa nkpọrọgwu-ya, ọ dighi-atu kwa egwu mb͕e okpom-ọku nābia, ma akwukwọ-ya gābu akwukwọ ndu; ọzọ, n'arọ nb͕ochi miri-ozuzo ọ gaghi-echeb͕u onwe-ya, ọ gaghi-apu kwa n'imì nkpuru.

JOSHUA 1:5-9
[5] Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi ubọchi nile nke ndu-gi: dika M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi: M'gaghi-ara gi aka, M'gaghi-arapu kwa gi.[6] Idi ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka ndi nka keta ala ahu nke M'ṅuru nna-ha iyi inye ha.[7] Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje.[8] Akwukwọ iwu a agaghi-apu n'ọnu-gi, kama i gātughari uche nime ya ehihie na abali, ka i we lezie anya ime dika ihe nile si di nke edeworo nime ya: n'ihi na mb͕e ahu i gēme ka ije-gi ga nke-ọma, mb͕e ahu i gēnwe kwa uche.[9] Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006