2 SAMUEL 24:14 |
Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko, ka ayi dabà n'aka Jehova; n'ihi na obi-ebere-Ya bara uba: ma ka m'ghara idabà n'aka madu. |
|
ABÙ ỌMA 86:5 |
N'ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, di nma, I bu kwa onye nāb͕aghara nmehie, I nāba kwa uba n'ebere n'aru ndì nile nākpọku Gi. |
|
ABÙ ỌMA 145:9 |
Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di; Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile. |
|
LUK 6:36 |
Nwenu obi-ebere, dika Nna-unu nwere obi-ebere. |
|
EFESỌS 2:4 |
ma Chineke, ebe Ọ bu ọgaranya n'ebere, n'ihi oké ihunanya-Ya Ọ huru ayi, |
|
TAITỌS 3:5 |
O siteghi n'ọlu di iche iche aluru n'ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n'ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme, |
|
HIBRU 4:16 |
Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n'oge nkpà. |
|
1 JỌN 1:3 |
ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ: |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |