A A A A A

Ezigbo agwa: [Nyocha]


ROM 14:12
Ya mere otú a onye ọ bula n'etiti ayi gāza ajuju bayere onwe-ya nye Chineke.

ROM 1:20
N'ihi na ihe-Ya anya nāhughi site n'òkìkè uwa ka anāhu nke-ọma, ebe anāghọta ha site n'ihe nile ekère èkè, bú ike ebighi-ebi Ya na udi-Chineke-Ya; ka ha ghara inwe ngọpu:

ILU 27:17
Ígwè nāmucha ígwè; Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.

JEMES 5:16
Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.

ROM 2:12
N'ihi na ka ha ra, bú ndi mehiere nēnweghi iwu, ha gāla kwa n'iyì nēnweghi iwu: ka ha ra kwa, bú ndi mehiere n'okpuru iwu, agēsite n'iwu kpe ha ikpé;

LUK 12:47-48
[47] Ọzọ, orù ahu, nke mara ihe onye-nwe-ya chọrọ, ma o dozighi, o meghi kwa dika ọ chọrọ, agāpia ya ọtutu utari;[48] ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n'aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n'aka idebe, n'aka-ya ka ha gāju ihe nke ka.

1 TESALỌNAIKA 5:11
N'ihi nka nākasiritanu ibe-unu obi, wulirita kwa ibe-unu elu dika ulo, dika unu nēme kwa.

JEMES 4:17
Ya mere onye matara ime ihe ọma, ma ọ meghi ya, ọ buru onye ahu nmehie.

ROM 4:15
n'ihi na iwu ahu nāluta iwe; ma ebe iwu nādighi, njehie adighi kwa.

1 TIMỌTI 1:10
nye ndi nākwa iko, nye ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, nye ndi nēzu madu n'ori, nye ndi-ugha, nye ndi nāṅu iyi ugha, ma ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di iche di nēmegide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu;

MATIU ۱۲:۳۶
Ma asim unu, na okwu ọ bula madu gēkwu nke nābaghi n'ihe, ha gāza ajuju bayere ya n'ubọchi ikpé.

LUK 12:48
ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n'aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n'aka idebe, n'aka-ya ka ha gāju ihe nke ka.

EZIKIEL 18:20
Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n'ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n'isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n'isi ya.

EFESỌS 5:21
nēdorita onwe-unu n'okpuru ibe-unu nime egwu Kraist.

HIBRU 10:25
ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe-ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike; ka ayi me kari kwa otú a, n'uzọ ra otú unu nēle ubọchi ahu anya ka ọ nābiaru nso.

EZIKIEL 33:8
Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, Gi onye nēmebi iwu, i ghaghi inwu, ma i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.

MATIU 12:36-37
[36] Ma asim unu, na okwu ọ bula madu gēkwu nke nābaghi n'ihe, ha gāza ajuju bayere ya n'ubọchi ikpé.[37] N'ihi na agēsite n'okwu-ọnu-gi nile gu gi n'onye ezi omume, agēsite kwa n'okwu-ọnu-gi nile kpeb͕u gi.

GALETIA 6:1-2
[1] Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi.[2] Nēburitanu ibu nānyi ibe-unu, nēdebezu-kwa-nu iwu Kraist n'uzọ di otú a.

HIBRU 10:24
ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche;

ABÙ ỌMA 51:5
Le, n'ajọ omume ka amuputaram; Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem.

1 JỌN 2:2
Ya onwe-ya bu kwa ihe ijuru Chineke obi bayere nmehie nile ayi; ma Ọ bughi ihe ijuru Ya obi bayere nání nmehie nke ayi onwe-ayi, kama Ọ bu kwa ihe ijuru Ya obi bayere nmehie nke uwa dum;

2 KỌRINT 5:10
N'ihi na aghaghi ime ka ayi nile puta ìhè n'iru oche-ikpé Kraist; ka ayi nile n'otù n'otù we nāghachi íhe esitere n'aru me, dika ihe onye ọ bula mere si di, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma.

2 KỌRINT 4:17-18
[17] N'ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi;[18] ebe ayi nādighi-ele ihe anāhu anya, kama ihe anādighi-ahu anya: n'ihi na ihe anāhu anya nādiru nwa oge; ma ihe anādighi-ahu anya di ebighi-ebi.

EFESỌS 4:25
N'ihi nka, ebe unu tupuru okwu-ugha, nēkwunu ezi-okwu onye ọ bula n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: n'ihi na ayi nāburita ihe di n'aru ibe-ayi.

GALETIA 6:2
Nēburitanu ibu nānyi ibe-unu, nēdebezu-kwa-nu iwu Kraist n'uzọ di otú a.

ỌLU OZI 14:17
Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n'elu-igwe, nēmeju obi-unu n'ihe-ọzùzù na ọṅù.

2 KỌRINT 2:6
O zuworo madu di otú a, bú nba nka nke ndi ka n'ọnu-ọgugu nime unu bara ya;

1 SAMUEL 16:7
Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi.

1 KỌRINT 1:10
Ma, umu-nnam, esiterem n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist riọ unu, ka unu nile nēkwu otù ihe, ka nkewa ghara kwa idi n'etiti unu; kama ka eme unu ka unu zue okè n'otù uche ahu na n'otù ìzù ahu.

2 EZE 12:4-5
[4] Jehoash we si ndi-nchu-àjà, Ego nile nke ihe nsọ nile nke anēwebata n'ulo Jehova, bú ego onye nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, nwoke ọ bula ego madu nile nke ọ̀rùrù-ọnu-ya, na ego nile nke ọ batara n'obi nwoke ọ bula iwebata n'ulo Jehova,[5] ka ndi-nchu-àjà were ya n'onwe-ha, nwoke ọ bula site n'aka onye ọ mara: ha onwe-ha gēme ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike, ebe ọ bula agāchọta ebe etipúru etipú.

ABÙ ỌMA 82:1
Chineke nēguzo Onwe-ya nime nzukọ Chineke; N'etiti chi nile ka Ọ nēkpe ikpe.

ABÙ ỌMA 82:6
Mu onwem siri, Chi ka unu bu, Ọ bu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu ka unu bu.

JOB 1:6-12
[6] Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha.[7] Jehova we si Setan Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n'igaghari n'uwa, na site n'ijeghari nime ya.[8] Jehova we si Setan Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.[9] Setan we za Jehova, si, Ọ̀ bu n'efu ka Job nātu egwu Chineke?[10] Ọ̀ bughi Gi onwe-gi b͕aworo ya, b͕a-kwa-ra ulo-ya, b͕a-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige buruburu? I gọziwo ọlu aka-ya abua, ihe-nnweta-ya ab͕asawo kwa n'ala.[11] Ma otú ọ di, biko setipu aka-Gi, metu ihe nile o nwere, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi.[12] Jehova we si Setan Le, ihe nile o nwere di n'aka-gi; nání esetila aka-gi metu aru-ya. Setan we si n'iru Jehova pua.

JOB 2:1-7
[1] Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha iguzo onwe-ya n'iru Jehova.[2] Jehova we si Setan, Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n'igaghari n'uwa, na site n'ijeghari nime ya.[3] Jehova we si Setan, Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: ọ nọ nējide kwa izu-okè-ya, ma i nākpalim imegide ya, iloda ya n'efu.[4] Setan we za Jehova, si, Akpukpọ-aru lara akpukpọ-aru, ọbuná ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n'ọnọdu ndu-ya.[5] Otú ọ di, biko, setipu aka-Gi, metu okpukpu-ya metu kwa anu-aru-ya, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi.[6] Jehova we si Setan, Le, ọ nọ n'aka-gi; nání debe ndu-ya.[7] Setan we si n'iru Jehova pua, were ihe-ofifi ọjọ tie Job, site n'ọbu-ukwu-ya rue opu-n'isi-ya.

1 IHE EMERE 28:8
Ma ub͕u a, n'anya Israel nile, bú nkpọkọta Jehova kpọkọtara, ma na nti Chineke-ayi, debenu, chọ kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu: ka unu we nweta ezi ala nka, me kwa ka umu-unu keta ya rue mb͕e ebighi-ebi, bú ndi gānọchi unu.

English NIRV Version 1996
Copyright © 1995, 1996, 1998, 2014 by Biblica, Inc.® Used by permission. All rights reserved worldwide.