A A A A A

Ezigbo agwa: [Ike n'ezi]


ILU ๑๑:๓
Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha: Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha.

ILU ๒๘:๖
Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya.

1 PITA 3:16
ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya.

ILU 12:22
Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu: Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ.

ILU 21:3
Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe Bu ihe Jehova nārọputa kari àjà.

2 KỌRINT 8:21
n'ihi na ayi buru uzọ nēchè ihe ọma, ọ bughi nání n'iru Onye-nwe-ayi, kama n'iru madu kwa.

JỌN ๑๔:๖
Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu.

ILU ๔:๒๕-๒๗
[๒๕] Ka anya-gi abua legide n'iru, Ka mbubere-anya-gi lezi kwa n'iru gi.[๒๖] Me ka okporo-uzọ nke ukwu-gi abua di lari, Ka edozi kwa uzọ-gi nile.[๒๗] Ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: Si n'ihe ọjọ wezuga ukwu-gi.

HIBRU 13:18
Nēkpenu ekpere bayere ayi: n'ihi na emere ka ayi kweye na ayi nwere akọ-na-uche ọma, ebe ayi nāchọ ibi obi nke-ọma n'ihe nile.

LUK 6:31
Dika unu nāchọ kwa ka madu mere unu, unu onwe-unu nēme kwa ha otú ahu.

ABÙ ỌMA 41:11-12
[11] Nka ka m'ji mara na ihem nātọ Gi utọ, N'ihi na onye-irom adighi-eti nkpu nmeri n'arum.[12] Ma mu onwem, n'izu-okèm ka I jideworom, We me ka m'guzosie ike n'iru Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

FILIPAI 4:8
Nke fọduru, umu-nnam, ka ihe bu ezi-okwu ra, ka ha ra, bú ihe kwesiri nsọpuru, ka ha ra, bú ihe ziri ezi, ka ha ra, bú ihe di ọcha, ka ha ra, bú ihe kwesiri ihu-n'anya, ka ha ra, bú ihe ekwuru nke-ọma; ọ buru na idi-nma ọ bula di, o buru kwa na otuto ọ bula di, nāgukọnu ihe ndia.

AISAIA 26:7
Uzọ onye ezi omume nēso bu izi-ezi nile: Gi onye ziri ezi nēme ka uzọ onye ezi omume di lari.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006