A A A A A

Ezigbo agwa: [Dọ aka ná ntị]


2 TIMỌTI 1:7
N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè.

EFESỌS 6:4
Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n'ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi.

ILU 10:17
Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu: Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue.

ILU 12:1
Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya: Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.

ILU 13:1
Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike.

ILU 13:24
Onye nēb͕ochi nkpa-n'aka-ya nākpọ nwa-ya asì: Ma onye nāhu ya n'anya nādọsi ya aka na nti ike.

ILU 22:6
Zulite nwata dika uzọ-ya si di, Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya.

ILU 22:15
Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata; Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.

ILU 29:15-17
[15] Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe: Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.[16] Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari: Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha.[17] Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike; E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.

NKPUGHE 3:19
Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa.

TAITỌS 1:8
kama ọ ghaghi ibu onye nēle ndi-ọbìa nke-ọma, onye nāhu ezi ihe n'anya, onye uche-ya zuru okè, onye ezi omume, onye di ọcha n'obi, onye nējidesi onwe-ya ike;

ILU 23:13-14
[13] Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n'aru nwata: Mb͕e i gēji nkpa-n'aka tie ya, ọ gaghi-anwu.[14] Gi onwe-gi gēji nkpa-n'aka tie ya, We naputa nkpuru-obi-ya n'ala-mọ.

HIBRU 12:10-11
[10] N'ihi na ndi ahu nezí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu n'ezie ubọchi ole-na-ole otú ọ di ha nma; ma Ya onwe-ya nēzí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu ka o we bara ayi urù, ka ayi we keta idi-nsọ-Ya.[11] Ozizí nile site n'inye ahuhu nādi ka ihe nādighi-eweta ọṅù n'oge di ub͕u a, kama nwuta: ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n'udo, bú nkpuru nke ezi omume.

JOB 5:17-18
[17] Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba: Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.[18] N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u, Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.

ILU 3:11-12
[11] Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova: Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:[12] N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba; Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.

DEUTERONOMI 8:5-6
[5] I gāma kwa n'obi-gi, na, dika nwoke si adọ nwa-ya nwoke aka na nti, otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nādọ gi aka na nti.[6] I gēdebe kwa ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, ka i we je ije n'uzọ-Ya nile, tu kwa egwu Ya.

1 KỌRINT 9:25-27
[25] Madu ọ bula nke nāb͕asi nb͕a ike ika ibe-ya n'egwú-unu nējide kwa onwe-ya n'ihe nile. Ya mere, ndi ahu nēme ya inata okpu-nmeri nke puru ire uré; ma ayi onwe-ayi nēme ya inata okpu-nmeri nke nāpughi ire uré.[26] Ya mere mu onwem nāb͕a ọsọ otú a, dika onye nādighi-ab͕a nēleghi anya ihe; otú a ka m'nēsu ọkpọ, dika onye nādighi-apia ifufe:[27] ma anametiputa arum ọnyá, me kwa ya ka ọ buru orùm: ka mu onwem ghara ighọ onye ajuru aju n'uzọ ọ bula, mb͕e m'kwusasiri okwu Chineke nye ndi ọzọ.

2 KỌRINT 7:9-11
[9] Ub͕u a anamaṅuri ọṅu, ọ bughi na emere ka ihe wuta unu, kama na emere ka o wuta unu rue nchèghari: n'ihi na emere ka o wuta unu dika Chineke chọrọ, ka unu we ghara isite n'ayi yi iyì n'ihe ọ bula.[10] N'ihi na nwuta dika Chineke chọrọ nālu ọlu nchèghari rue nzọputa, bú nchèghari nke anāpughi ikwa uta bayere ya: ma nwuta nke uwa nāluputa ọnwu.[11] N'ihi na le, otù ihe a, na emere ka ihe wuta unu dika Chineke chọrọ, le ka ọ ra, bú inu-ọku-n'obi ọ luputara nime unu, e, le ka ngọpu ra, e, le ka iwe uku ra, e, le ka egwu ra, e, le ka ọgugu m'gusiri unu ike ra, e, le ka ekworo ra, e, le ka nkpeputa ra! N'ihe nile ọ bula unu mere ka amara unu na unu di ọcha n'okwu ahu.

ABÙ ỌMA 94:12-14
[12] Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja, Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;[13] Ime ka ọ nọ jū pua n'ubọchi nile nke ihe ọjọ, Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù.[14] N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka, Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.

HIBRU 12:5-9
[5] unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si, Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu, Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya;[6] N'ihi na onye Onye-nwe-ayi huru n'anya ka Ọ nēzí ihe site n'inye ya ahuhu, O nāpia kwa nwa ọ bula Ọ nānata utari.[7] Nātachinu obi ka ewe zí unu ihe site n'inye unu ahuhu; n'ihi na Chineke nēmeso unu dika umu; n'ihi na ònye bu nwa ahu nna-ya nādighi-ezi ya ihe site n'inye ya ahuhu?[8] Ma ọ buru na adighi-ezí unu ihe site n'inye unu ahuhu, nke emeworo unu niile ka ha buru ndi-nketa, ya mere unu bu umu iko, unu abughi kwa umu n'ezie.[9] Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu?

EFESỌS 6:1-9
[1] Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n'ihi na nka bu ihe ziri ezi.[2] Sọpuru nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n'iwu nke nkwa diri ya),[3] ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n'elu uwa.[4] Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n'ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi.[5] Ndi-orù, werenu egwu na ima-jijiji nāṅa nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru, nime afọ-ofufo nke obi-unu, dika unu nēmere Kraist;[6] ọ bughi n'uzọ ibu-orù-n'anya, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ; kama dika ndi-orù Kraist, nēme ihe Chineke nāchọ site na nkpuru-obi-unu;[7] were-kwa-nu obi-ọma nābu orù, dika ọ bu Onye-nwe-ayi ka unu bu orù-Ya, ọ bughi kwa madu:[8] ebe unu matara na ezi ihe ọ bula onye ọ bula nēme, nka ka ọ gānaghachi n'aka Onye-nwe-ayi, ma ọ bu orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya.[9] Ndi-nwe madu, nēme-kwa-ranu ha otù ihe ahu, nārapu iba-nba-unu: ebe unu matara na Onye-nwe ma ha ma unu nọ n'elu-igwe, ile-madu-anya-n'iru adighi kwa n'ebe Ọ nọ.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006