A A A A A

Ezigbo agwa: [Ọmịiko]


KỌLỌSI 3:12
Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n'anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi;

ỌPUPU 33:19
Ọ si, Mu onwem gēme ka idi-nmam nile gabiga n'iru gi, M'gākpọ kwa òkù bayere aha Jehova n'iru gi: M'gēme-kwa-ra onye ahu amara, bú onye M'gēmere amara, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ahu nke M'gēnwe obi-ebere n'aru ya.

AISAIA 30:18
Ọ bu kwa n'ihi nka ka Jehova gēchere, imere unu amara, ọ bu kwa n'ihi nka ka agēbuli Ya, inwe obi-ebere n'aru unu: n'ihi na Chineke nke ikpé ka Jehova bu; ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nile ndi nēchere Ya bu.

AISAIA 49:10-13
[10] Agu agaghi-agu ha, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku; miri na anyanwu agaghi-amab͕u kwa ha: n'ihi na Onye nwere obi-ebere n'aru ha gēdu ha, ọ bu kwa n'akuku isi-iyi nile juputara na miri ka O gēdu ha nwayọ.[11] M'gēme kwa ka ugwum nile ghọ uzọ, agēme kwa ka uzọm nile atuliri atuli di elu.[12] Le, ndia gēsi n'ebe di anya bia: le kwa, ndia gēsi n'Ugwu na n'Ọdida-anyanwu; ndia gēsi kwa n'ala Sainim.[13] Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ndi-Ya ewedara n'ala.

AISAIA 54:10
N'ihi na ugwu nile gāpu n'ọnọdu-ha, agēwezuga kwa ugwu ntà nile n'ọnọdu-ha; ma eberem agaghi-esi n'ebe i nọ pua, agaghi-ewezuga kwa ọb͕ub͕a-ndu nke udo nkem n'ọnọdu-ya, ka Onye nwere obi-ebere n'aru gi siri, bú Jehova.

AISAIA 63:7
Ebere nile nke Jehova ka M'gēhota, ha na otuto nile nke Jehova, dika ihe nile si di nke Jehova mesoworo ayi; na iba-uba nke ezi ihe emere ulo Israel, nke O mesoworo ha dika obi-ebere-Ya nile si di, na dika iba-uba nke ebere-Ya si di.

JEMES 5:11
Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere.

ABÙ-ÁKWÁ 3:32
N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.

ABÙ ỌMA 51:1
Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile.

ABÙ ỌMA 103:13
Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya, Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya.

ABÙ ỌMA 116:5
Onye-amara na onye ezi omume ka Jehova bu; E, Chineke-ayi nwere obi-ebere.

ABÙ ỌMA 119:77
Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu; N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku.

ABÙ ỌMA 119:156
Obi-ebere-Gi nile bara uba, Jehova; Dika ikpé-Gi nile si di, me ka m'di ndu.

ABÙ ỌMA 145:9
Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di; Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile.

ROM 9:15
N'ihi na Ọ si Moses, M'gēmere onye ọ bula ebere, bú onye M'nēmere ebere, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ọ bula, bú onye M'gēnwe obi-ebere n'aru-ya.

2 KỌRINT 1:3-4
[3] Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile;[4] Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.

FILIPAI 2:1-3
[1] Ya mere ọ buru na nkasi-obi ọ bula di nime Kraist, ọ buru na ngugu-obi ọ bula nke ihu-n'anya di, ọ buru na nnwekọ ọ bula nke Mọ Nsọ di, ọ buru na obi-ebere na ime-ebere ọ bula di,[2] menu ka ọṅùm juputa, ka unu we tukwasi uche-unu n'otù ihe ahu, nwe kwa otù ihunanya ahu, nēnwekọ otù nkpuru-obi, nēnwe otù uche;[3] unu emela ihe ọ bula n'uzọ ikpa-iche-iche ma-ọbu n'uzọ ichọ otuto efu, kama n'obi di ume-ala nāguritanu ibe-unu na ndi ka unu onwe-unu nma;

MATIU 9:35-38
[35] Jisus we nējeghari n'obodo na obodo ntà ha nile, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.[36] Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu nile, O nwere ọmiko n'aru ha, n'ihi na anēsob͕u ha, nāchusa kwa ha, dika aturu nēnweghi onye nāzù ha.[37] Mb͕e ahu Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Owuwe-ihe-ubi riri nne n'ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole.[38] Ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu bà n'owuwe-ihe-ubi-Ya.

ABÙ ỌMA 103:1-5
[1] Gọzie Jehova, nkpuru-obim; Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya.[2] Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi:[3] Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile;[4] Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi; Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche:[5] Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi; Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo.

MATIU 20:29-34
[29] Mb͕e ha nāputa na Jeriko, oké ìgwè madu we so Ya.[30] Ma le, ndi-ìsì abua ndi nānọdu n'akuku uzọ, mb͕e ha nuru na Jisus nāgabiga, ha tie nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.[31] Ìgwè madu ahu we bara ha nba, ka ha kpuchie ọnu-ha: ma ha tikariri nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.[32] Jisus we guzo, kpọ ha, we si, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu?[33] Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, ka ewe meghe anya-ayi.[34] Ma Jisus, ebe O nwere ọmiko n'aru-ha, O we metu anya-ha aka: ngwa ngwa ewe me ka ha hu uzọ, ha we so Ya.

MATIU 14:13-21
[13] Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala.[14] O we puta, hu oké ìgwè madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, me ndi-nriaria-ha ka aru-ha di ike.[15] Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si, Ebe a bu ọhia, oge agawo kwa ub͕u a; zilaga ìgwè madu ndia, ka ha we je n'obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe-oriri.[16] Ma Jisus siri ha, Ọ dighi ha nkpà ka ha la; unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie.[17] Ha we si Ya, Ayi enweghi n'ebe a ma-ọbughi ob͕e achicha ise na azù abua.[18] O we si, Chita ha n'ebe a nyem.[19] O we gwa ìgwè madu nile ka ha nọdu n'elu ahihia; O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawaha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ob͕e achicha ahu, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile.[20] Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, nkata iri na abua juru.[21] Ma ndi riri ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri, nāgughi ndinyom na umu-ntakiri.

MATIU 15:29-39
[29] Jisus we si n'ebe ahu pua bia n'usọ osimiri Galili; O we rigo n'ugwu ahu, we nọdu n'ebe ahu.[30] Ọtutu ìgwè madu we biakute Ya, chiri ndi-ngwurọ, ndi-ìsì, ndi-ob͕i, ndi-ọlusi, na ọtutu ndi-ọria di iche, tiyere onwe-ha, ha we tọb͕ọ ha n'ala n'ukwu-Ya; O we me ka aru-ha di ike:[31] ya mere na o juru ìgwè madu ahu anya, mb͕e ha huru ndi-ob͕i ka ha nēkwu okwu, na ndi-ọlusi ka aru-ha di nma, na ndi-ngwurọ ka ha nēje ije, na ndi-ìsì ka ha nāhu uzọ: ha we to Chineke nke Israel.[32] Jisus we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si, Enwerem ọmiko n'aru ìgwè madu a, n'ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri: ma achọghm izilaga ha n'ọnu efu, ka ha ghara ida #mbà n'uzọ ma eleghi anya.[33] Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe ka ayi gēsi nwe ọtutu ob͕e achicha ra otú a n'ọhia, inyeju oké ìgwè madu di otú a afọ?[34] Jisus we si ha, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa, na azù ntà ole-na-ole.[35] O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala;[36] O we nara ob͕e achicha asa ahu na azù ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile.[37] Ha nile we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, abọ asa juru.[38] Ma ndi riri bu nnù ndikom iri, nāgughi ndinyom na umuaka.[39] Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ ba n'ub͕ọ ahu, bia n'ókè-ala Magadan.

MATIU 6:30-44
[30] Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia nke ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n'ite ọku, Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà?[31] Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu, si, Gini ka ayi gēri? ma-ọbu, Gini ka ayi gāṅu? ma-ọbu, Gini ka agēji b͕okwasi ayi?[32] N'ihi na ihe ndia nile ka ndi mba ọzọ nāchọ; n'ihi na Nna-unu nke elu-igwe nāmata na ihe ndia nile di unu nkpà.[33] Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.[34] Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu nye echi: n'ihi na echi gēcheb͕uru onwe-ya. Ihe ọjọ nke ubọchi ta ezuworo ya.[35] Unu ekpela ikpé, ka aghara ikpe unu ikpé.[36] N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu.[37] Ma gini mere i ji le irighiri ahihia nke di n'anya nwa-nna-gi, ma i tugharighi uche na ntuhie nke di n'anya nke gi?[38] Ma-ọbu ì gēsi aṅa si nwa-nna-gi, Kwe ka m'tupu irighiri ahihia ahu n'anya-gi: ma le, ntuhie ahu di n'anya nke gi?[39] Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n'anya nke gi; mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu n'anya nwa-nna-gi.[40] Unu enyela nkita ihe di nsọ, unu atuda-kwa-la pearl-unu n'iru ezì, ka ha ghara izọkwasi ha n'ukwu-ha ma eleghi anya, we chigharia, dọka unu.[41] Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu:[42] n'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere.[43] Ma -ọbu òle madu di n'etiti unu, onye, ma ọ buru na nwa-ya gāriọ ya ob͕e achicha, gēnye ya nkume;[44] ma-ọbu asi na ọ gāriọ azù, gēnye ya agwọ?

LUK 15:11-32
[11] O we si, Otù nwoke ji umu-ndikom abua:[12] nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri.[13] Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n'ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n'idi ndu nke ila-n'iyì.[14] Ma mb͕e o mefusiri ihe nile, oké unwu siri ike dara n'ala ahu; ya onwe-ya we malite inọ na nkpà.[15] O we ga were onwe-ya rapara n'otù onye nime ndi amuru n'ala ahu; o we ziga ya n'ubi-ya izù ezì.[16] O we nāgu ya iwere mb͕ub͕ọ nke ezì nāta riju afọ-ya: ma ọ dighi onye ọ bula nēnye ya.[17] Ma mb͕e ọ mara onwe-ya ọ si, Ọ̀tutu ndi egoro ọlu ole nke nnam nwebigara ob͕e achicha ókè, ma mu onwem nāla n'iyì n'oké agu n'ebe a![18] M'gebili jekuru nnam, m'gāsi kwa ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi:[19] ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ: mem ka m'di ka otù onye nime ndi nke gi egoro ọlu.[20] O we bilie, biakute nna-ya. Ma mb͕e ọ nọ n'ebe di anya ub͕u a, nna-ya huru ya, o we nwe ọmiko n'aru-ya, b͕a ọsọ, makua ya n'olu, sutu kwa ya ọnu nke-uku.[21] Nwa-ya we si ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi: ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ.[22] Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya:[23] sekputa kwa nwa-ehi azùru azù, b͕ue ya, ka ayi ri kwa, ka obi tọ kwa ayi utọ:[24] n'ihi na nwam nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fururi efu, ewe hu ya. Ha we malite ime ka obi tọ ha utọ.[25] Ma nwa-ya nke-okenye nọ n'ubi: mb͕e ọ nābia ru ulo nso, o we nu olu abù na ite-egwú.[26] O we kpọ otù onye nime ndi nēje ozi ka ọ biakute ya, we jua ya ihe ha bu, bú ihe ndia.[27] O we si ya, Nwa-nne-gi abiawo; nna-gi eb͕uwo kwa nwa-ehi azùru azù, n'ihi na ọ nara ya n'aru-ike.[28] Ma o were iwe, ọ chọghi kwa ibà n'ulo: nna-ya we puta, riọ ya.[29] Ma ọ zara, si nna-ya, Le, ọtutu arọ ndia ka m'bu orù-gi, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula m'rapuru ihe i nyere n'iwu: ma ọ dighi mb͕e ọ bula i nyerem nwa-ewu, ka obi we tọ mu na ndi-eyìm utọ:[30] ma mb͕e nwa-gi nka biara, nke ya na ndinyom ndi nākwa iko ripiara ihe nile i ji biri, i b͕uru nwa-ehi azùru azù nye ya.[31] O we si ya, Nwam, mu na gi nọ mb͕e nile, ihem nile bu kwa nke gi.[32] Ma ayi aghaghi ime ka obi tọ ayi utọ na iṅuri ọṅu: n'ihi na nwa-nne-gi nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fukwara efu, ewe hu ya.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006