A A A A A

Ezigbo agwa: [Nnabata]


1 KỌRINT 5:11-13
[11] ma otú ọ di, edegaram unu ka unu na onye ọ bula nke anākpọ ya aha na ọ bu nwa-nna ghara imekọ ihe, ma ọ buru na onye ahu bu onye nākwa iko, ma-ọbu onye-anya-uku, ma-ọbu onye nēkpere arusi, ma-ọbu onye-nkwutọ, ma-ọbu onye nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu onye nāpunara madu ihe; ka unu na onye di otú a ghara ọbuná irikọ ihe.[12] N'ihi na òle ihe bu nkem ikpe ndi nọ n'èzí ikpé? Ọ̀ bughi ndi nọ n'ime ka unu onwe-unu nēkpe?[13] ma Chineke nēkpe ndi nọ n'èzí ikpé. Wepunu ajọ onye ahu n'etiti onwe-unu.

1 JỌN 1:9
Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka O we b͕aghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile.

1 PITA 3:8-9
[8] Ma n'ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n'anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala:[9] ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.

JỌN 3:16
N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.

ILU 13:20
Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.

ROM 2:11
n'ihi na ile-madu-anya-n'iru adighi n'ebe Chineke nọ.

ROM 5:8
Ma Chineke nēme ka ihu-n'anya nke aka Ya n'ebe ayi nọ puta ìhè, n'ihi na, mb͕e ayi nọ nābu ndi-nmehie, Kraist nwuru n'ihi ayi.

ROM 8:31
Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?

ROM 14:1-2
[1] Ma kpọbatanu onye nādighi ike n'okwukwe-ya, ọ bughi ikpa ókè n'ihe ọ nātule n'obi.[2] Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi.

HIBRU 10:24-25
[24] ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche;[25] ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe-ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike; ka ayi me kari kwa otú a, n'uzọ ra otú unu nēle ubọchi ahu anya ka ọ nābiaru nso.

JỌN 6:35-37
[35] Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula.[36] Ma asirim unu, na unu ahuwom, ma unu ekweghi.[37] Ihe nile nke Nnam nēnyem gābiakutem; onye nābiakutekwam M'gaghi-achupu ya ma-ọli.

KỌLỌSI 3:12-14
[12] Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n'anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi;[13] nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a:[14] ma n'elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n'anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè.

MATIU 5:38-42
[38] Unu nuru na ekwuru, si, Anya lara anya, ezé lara ezé:[39] ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ.[40] Ma ọ buru na onye ọ bula nāchọ ka gi na ya je ikpé, ka o we nara gi uwe-ime-gi, rapu-kwa-ra ya oké uwe-gi.[41] Onye ọ bula nke gējide gi ije otù mile, so ya je mile abua.[42] Nye onye nāriọ gi, ab͕akuta-kwa-la ya azú, bú onye nāchọ ka i binye ya ihe.

MATIU 25:34-40
[34] Mb͕e ahu Eze ahu gāsi ndi nọ n'aka-nri-Ya, Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa:[35] n'ihi na agu gurum, unu we nyem ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, unu we kuru miri nyem: abum ọbìa, unu we kpọbatam;[36] ab͕aram ọtọ, unu we b͕okwasim ákwà: aru adighm ike, unu we letam: anọm n'ulo-nkpọrọ, unu we biakutem.[37] Mb͕e ahu ndi ezi omume ahu gāza Ya, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ayi we zùa Gi? ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ayi we kuru miri nye Gi?[38] Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka I bu ọbìa, ayi we kpọbata Gi? ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ayi we b͕okwasi Gi ákwà?[39] Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka aru nādighi ike, ma-ọbu n'ulo-nkpọrọ, ayi we biakute Gi?[40] Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.

ROM 15:1-7
[1] Ma ayi onwe-ayi, bú ndi nwere ike, ayi aghaghi ibū adighi-ike nile nke ndi nēnweghi ike, na ighara ime ihe nātọ onwe-ayi utọ.[2] Onye ọ bula n'etiti ayi, ya me ihe gātọ onye-ab͕ata-obi-ya utọ iwetara ya ezi ihe, ka ọ we wulie ya elu dika ulo.[3] N'ihi na Kraist-ayi emeghi kwa ihe tọrọ Onwe-ya utọ; kama, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta dakwasirim.[4] N'ihi na ka ha ra, bú ihe edere n'akwukwọ nsọ n'oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ nwe olile-anya.[5] Ma ka Chineke nke ntachi-obi na nke nkasi-obi nye unu ka unu tukwasi uche n'otù ihe ahu n'etiti-onwe-unu dika Kraist Jisus si chọ:[6] ka unu we ji otù obi ji kwa otù olu nēnye Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist otuto.[7] N'ihi ya nākpọbatanu ibe-unu, dika Kraist-ayi kpọbata-kwa-ra unu, ka ewe nye Chineke otuto.

ROM 14:10-19
[10] Ma gi onwe-gi, gini mere i nēkpe nwa-nna-gi ikpé? ma-ọbu gi onwe-gi kwa, gini mere i nākpọ, nwa-nna-gi ihe-efu? n'ihi na ayi nile gēguzo n'iru oche-ikpé Chineke.[11] N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Dika Mu onwem nādi ndu, ka Onye-nwe-ayi kwuru, ọ bu Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru, Ire nile ọ bula gēkwuputa kwa Chineke.[12] Ya mere otú a onye ọ bula n'etiti ayi gāza ajuju bayere onwe-ya nye Chineke.[13] Ya mere ka ayi ghara ikperita ibe-ayi ikpé ọzọ: ma kama ya kpenu ikpé a, ka onye ọ bula ghara idebe ihe-isu-ngọngọ, ma-ọbu ọnyà, n'uzọ nwa-nna-ya.[14] Amataram, eme-kwa-ra ka m'kweye nime Onye-nwe-ayi Jisus, na ọ dighi ihe ruru árú site n'onwe-ya: ọ bu nání n'ebe ọ nọ, bú onye nāgu ihe ọ bula na ọ ruru árú, n'ebe onye ahu nọ ka ọ ruru árú.[15] N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya.[16] Ya mere unu ekwela ka ekwulu ezi ihe-unu:[17] n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ.[18] N'ihi na onye nābu orù Kraist n'uzọ nka, ọ di Chineke ezi utọ, buru kwa onye anwaputara n'iru madu.[19] Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006