A A A A A

Chineke: [Lovehụnanya Chineke]


1 KỌRINT 13:13
Ma ub͕u a ka okwukwe, olile-anya, ihu-n'anya, ihe atọ ndia, nānọgide; ma nke kachasi n'ihe ndia bu ihu-n'anya.

1 JỌN 3:1
Lenu aha ihunanya nka bu nke Nna-ayi nyeworo ayi, ka ewe kpọ ayi umu Chineke: ayi bu kwa umu-Ya. N'ihi nka uwa amaghi ayi, n'ihi na ọ maghi Ya.

1 JỌN 4:7-8
[7] Ndi m'huru n'anya, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya: n'ihi na ihu-n'anya bu ihe si na Chineke puta; onye ọ bula nke nāhu n'anya bu kwa onye amuworo site na Chineke, ọ ma-kwa-ra Chineke.[8] Onye nādighi-ahu n'anya amaghi Chineke; n'ihi na Chineke bu ihu-n'anya.

1 JỌN 4:16-19
[16] Ayi onwe-ayi amawo kwa ihu-n'anya ahu, ayi ekwerewo kwa na ya, bú nke Chineke nwere n'ebe ayi nọ. Chineke bu ihu-n'anya; onye nānọgide kwa n'ihu-n'anya; nime Chineke ka ọ nanọgide Chineke nānọgide kwa nime ya.[17] Nime nka ka emeworo ka ihu-n'anya zue okè n'akuku ayi, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu n'ubọchi ikpé ahu; n'ihi na dika Ya onwe-ya di, ayi onwe-ayi di kwa otú a n'uwa nka.[18] Egwu adighi n'ihu-n'anya: kama ihu-n'anya nke zuru okè nāchupu egwu n'èzí, n'ihi na egwu, akēmeghi ya ka o zue òkè nime ihunanya[19] Ayi onwe-ayi nāhu n'anya, n'ihi na Ya onwe-ya buru uzọ hu ayi n'anya.

GALETIA 2:20
Akpọgidekọwo mu na Kraist n'obe; ọ bughi kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem ma ndu ahu m'nādi n'anu-aru ub͕u a, anamadi ya n'okwukwe, bú nke m'kwere n'Ọkpara Chineke, Onye hurum n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihim.

JEREMAIA 29:11
N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.

JEREMAIA 31:3
Site n'ebe di anya ka Jehova mere ka m'hu Ya, si, Ọ bu ihu-n'anya nke di mb͕e ebighi-ebi ka M'jiworo hu gi n'anya: n'ihi nka ka M'meworo ka ebere digidere gi.

JỌN 3:16
N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.

JỌN 15:13
Ọ dighi onye ọ bula nwere ihu-n'anya kari nka uku, ka madu tọb͕ọ ndu-ya n'ihi ndi-enyì-ya.

ABÙ ỌMA 86:15
Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, bu Chineke Nke nwere obi-ebere, Onye di kwa amara, Nke nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere na ezi-okwu.

ABÙ ỌMA 136:26
Kelenu Chineke nke elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

ROM 5:8
Ma Chineke nēme ka ihu-n'anya nke aka Ya n'ebe ayi nọ puta ìhè, n'ihi na, mb͕e ayi nọ nābu ndi-nmehie, Kraist nwuru n'ihi ayi.

DEUTERONOMI 7:9
I gāmara kwa na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu Chineke; Chineke ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, nēdebere ndi huru Ya n'anya, ndi nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere-Ya rue nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri;

ZEFANAIA 3:17
Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu dike nke nāzọputa: O gēji ọṅù nwe obi-utọ n'aru gi, Ọ gedere du n'ihu-n'anya-Ya, Ọ gēji iti-nkpu-ọṅù teghari egwu ọṅù n'aru gi.

EFESỌS 2:4-5
[4] ma Chineke, ebe Ọ bu ọgaranya n'ebere, n'ihi oké ihunanya-Ya Ọ huru ayi,[5] ọbuná mb͕e ayi nọ n'ọnwu site na ndahie nile ayi, O mere ka ayi so Kraist dikọ ndu (ejiwo amara zọputa unu),

1 PITA 5:6-7
[6] Ya mere wedanu onwe-unu n'okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n'oge nke Ya;[7] nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n'ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n'obi.

ROM 8:37-39
[37] É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya.[38] N'ihi na emewo ka m'kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche,[39] ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agaghi-apu ikewapu ayi n'ihu-n'anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006