LEVITIKỌS 20:9 |
N'ihi na onye ọ bula nke nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: nna-ya ma-ọbu nne-ya ka ọ kọchaworo; ọbara-ya gādikwasi ya. |
|
DEUTERONOMI 28:15 |
Ma ọ gēru, ọ buru na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta; na nkọcha nile ndia gābiakwasi gi, we rue gi aru. |
|
ỌPUPU 21:17 |
Onye nākọcha nna-ya, ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua. |
|
JEREMAIA 15:10 |
Ahuhu dirim, nnem, na i muwom onye-ọ̀gù na onye-esem-okwu n'ebe uwa nile di! ebinyeghm ego n'uma; madu ebinyeghkwam ego n'uma; ma onye ọ bula nime ha nākọcham. |
|
GALETIA 3:13 |
Kraist b͕aputara ayi n'ọbubu-ọnu nke iwu ahu, ebe Ọ ghọrọ ọbubu-ọnu n'ọnọdu-ayi: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anabu ọnu ka ọ bu, bú onye ọ bula nke anākwuba n'elu osisi: |
|
ỌPUPU 34:7 |
Onye nēdebere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nāb͕aghara ajọ omume na njehie na nmehie: ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu umu, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ. |
|
LUK 6:28 |
nāgọzinu ndi nābu unu ọnu, nēkpe ekpere nye ndi nākpali unu. |
|
ỌNU-ỌGUGU 14:18 |
Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba uba n'ebere, Ọ nāb͕aghara kwa ajọ omume na njehie, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere kwa ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ. |
|
JENESIS 3:17 |
Adam ka Ọ sikwara, N'ihi na i gewo nti n'olu nwunye-gi, i we rie nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, si, Gi erila nkpuru sitere na ya: ihe anābu ọnu ka ala bu n'ihi gi; n'ihe-nb͕u ka i gēri ihe sitere na ya ubọchi nile nke ndu-gi; |
|
ILU 26:2 |
Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya, Otú a nkọcha adighi-abia n'efu. |
|
DEUTERONOMI 5:9 |
gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì; |
|
GALETIA 5:1 |
Kraist mere ka ayi pua n'orù ka ayi we nwere onwe-ayi: ya mere nēguzosinu ike, unu ekwela ka ewere yoke nke bu ibu-orù jide unu ọzọ. |
|
ỌPUPU 20:5 |
gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì; |
|
2 KỌRINT 5:17 |
Ya mere ọ buru na onye ọ bula di nime Kraist, ọ bu onye ekère ọhu: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu. |
|
1 JỌN 4:4 |
Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n'ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n'uwa uku. |
|
2 SAMUEL 16:5-8 |
[5] Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n'ab͕uru ulo Sọl nēsi n'ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa.[6] Ọ tua Devid nkume, tu kwa ndi-orù nile nke eze, bú Devid: ndi Israel nile na ndi-dike nile di kwa n'aka-nri-ya na n'aka-ekpe-ya.[7] Ma otú a ka Shimai siri mb͕e ọ nākọcha, Pua, pua, gi nwoke ọbara na nwoke jọb͕uru onwe-ya:[8] Jehova eweghachiwo n'isi-gi ọbara nile nke ulo Sọl, onye i buworo eze n'ọnọdu ya; Jehova enyewo kwa ala-eze n'aka Absalom, bú nwa-gi: ma, le, n'ihe ọjọ gi ka ejideworo gi, n'ihi na nwoke ọbara ka i bu. |
|
DEUTERONOMI 21:23 |
ozu-ya agaghi-adigide n'elu osisi abali nile, kama i ghaghi ilì ya n'ubọchi ahu; n'ihi na ihe-nkọcha nke Chineke ka onye a kwugburu akwugbu bu; ka i ghara imeru ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa. |
|
ỌPUPU 20:5-6 |
[5] gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;[6] ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu. |
|
1 SAMUEL 17:43 |
Onye Filistia ahu we si Devid, Ọ̀ bu nkita ka m'bu, na gi onwe-gi nēwere nkpa-n'aka biakutem? Onye Filistia ahu we were chi-ya nile kọcha Devid. |
|
EZIKIEL 18:20 |
Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n'ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n'isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n'isi ya. |
|
JEREMAIA 31:29-30 |
[29] N'ubọchi ahu ha agaghi-asi kwa ọzọ, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì.[30] Kama onye ọ bula gānwu n'ihi ajọ omume nke aka ya: madu ọ bula nke nēri nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé-ya ganēru izìzì. |
|
ỌPUPU 20:6 |
ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu. |
|
DEUTERONOMI 18:10-12 |
[10] Agaghi-ahuta n'etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi,[11] ma-ọbu dibia nrafu, ma-ọbu onye nāju mọ ihe, ma-ọbu dibia-afa, ma-ọbu onye nāju ndi nwuru anwu ihe.[12] N'ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye ọ bula nke nēme ihe ndia bu: ọ bu kwa n'ihi ihe-árú ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi. |
|
ROM 8:37-39 |
[37] É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya.[38] N'ihi na emewo ka m'kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche,[39] ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agaghi-apu ikewapu ayi n'ihu-n'anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi. |
|
1 PITA 5:8-9 |
[8] Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:[9] ma nēguzogidenu ya, n'ihi na unu di ike n'okwukwe-unu, ebe unu matara na anēmezu otù ahuhu ahu n'aru ndi bu òtù umu-nna-unu ndi nọ n'uwa. |
|
JENESIS 3:17-19 |
[17] Adam ka Ọ sikwara, N'ihi na i gewo nti n'olu nwunye-gi, i we rie nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, si, Gi erila nkpuru sitere na ya: ihe anābu ọnu ka ala bu n'ihi gi; n'ihe-nb͕u ka i gēri ihe sitere na ya ubọchi nile nke ndu-gi;[18] o bu kwa ogwu na uke ka ọ gēpuru gi; i gēri kwa ihe-ọkukú nke ubi;[19] n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata. |
|
JENESIS 4:10-12 |
[10] Ọ si, Gini ka i meworo? ge nti! olu ọbara nwa-nne-gi nētikum site n'ala.[11] Ma ub͕u a, onye anābu ọnu ka i bu site n'ala, nke saghere ọnu-ya inara ọbara nwa-nne-gi n'aka-gi;[12] mb͕e i nālu ọlu ubi, ọ gaghi-enye gi ike-ya ọzọ; onye nāṅaghari na ọsọ ka i gābu n'uwa. |
|
JENESIS 9:18-27 |
[18] Umu-ndikom Noa, ndi siri n'ub͕ọ ahu pua, bu Shem, na Ham, na Jefet: ma Ham bu nna Kenean.[19] Ndia atọ bu umu-ndikom Noa: ọ bu kwa site na ndia ka uwa nile b͕asara.[20] Noa, bú onye-ọlu-ubi, we malite iku ubi-vine:[21] ọ we ṅua ufọdu nime manya-vine-ya, ṅubiga ókè, b͕aba onwe-ya ọtọ n'etiti ulo-ikwū-ya.[22] Ham, bú nna Kenean, we hu ọtọ nna-ya, gosi umu-nne-ya ndikom abua n'èzí.[23] Shem na Jefet we chiri uwe-nb͕okwasi, tukwasi n'ubu ha abua, were azu-ha je, kpuchie ọtọ nna-ha; ma iru-ha di n'azu, ha ahughi kwa ọtọ nna-ha.[24] Noa we teta n'ura manya-vine-ya, mara ihe nwa-ya nwoke nke-ntà mere ya.[25] Ọ we si, Onye anābu ọnu ka Kenean bu; Orù nke ndi-orù ka ọ gāburu umu-nne-ya ndikom.[26] Ọ si kwa, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Shem, bu; Ka Kenean ghọkwara ha orù.[27] Ka Chineke me ka Jefet setia, Ya biri kwa n'ulo-ikwū nile nke Shem; Ka Kenean ghọ-kwa-ra ha orù. |
|
1 EZE 2:32-46 |
[32] Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.[33] Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova.[34] Benaia nwa Jehoiada we rigo, dakwasi ya, me ka ọ nwua; ewe lìe ya n'ulo-ya n'ọzara.[35] Eze we tiye Benaia nwa Jehoiada n'ọnọdu-ya ka ọ buru onye-isi usu-ndi-agha: Zedok, bú onye-nchu-àjà, ka eze tiyere n'ọnọdu Abaiata.[36] Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Wuere onwe-gi ulo na Jerusalem, biri n'ebe ahu, esi-kwa-la n'ebe ahu pua je ebe ọ bula.[37] O gēru kwa, n'ubọchi i gāpu, gabiga miri-iyi Kidron, na i gāmara nke-ọma na i ghaghi inwu: ọbara-gi gādi n'isi-gi.[38] Shimai we si eze, Okwu a di nma: dika onye-nwem, bú eze, kwuworo, otú a ka orù-gi gēme. Shimai we biri na Jerusalem ọtutu ubọchi.[39] O rue, n'ọgwugwu arọ atọ, na ndi-orù abua Shimai nwere b͕akuru Ekish, nwa Meaka, eze Gat. Ha we gosi Shimai, si, Le, ndi-orù-gi nọ na Gat.[40] Shimai we bilie, jikwa inyinya-ibu-ya, jerue Gat, jekuru Ekish, ichọ ndi-orù-ya: Shimai we je, me ka ndi-orù ya si na Gat biaghachi.[41] Ewe gosi Solomon na Shimai esiwo na Jerusalem je rue Gat, lata kwa.[42] Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Èmeghm ka i were Jehova ṅua iyi, m'we b͕ara gi àmà, si, Mara nke-ọma, na i ghaghi inwu n'ubọchi i gāpu je n'ebe ọ bula? i we sim, Ọ di nma, bú okwu m'nuru.[43] Ọ̀ bu kwa gini mere i nēdebeghi iyi Jehova, na ihe enyere n'iwu nke m'nyere gi n'iwu?[44] Eze si-kwa-ra Shimai, Gi onwe-gi mara ihe ọjọ nile nke obi-gi mara, nke i mere Devid, bú nnam: Jehova gēme kwa ka ihe ọjọ gi laghachi n'isi-gi.[45] Ma eze, bú Solomon, bu onye agọziri agọzi, agēme kwa ka oche-eze Devid guzosie ike n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi.[46] Eze we nye Benaia nwa Jehoiada iwu; ọ pua, dakwasi ya, ọ we nwua. Ewe me ka ala-eze guzosie ike n'aka Solomon. |
|
JOB 2:9 |
Nwunye-ya we si ya, Ì nọ nējide izu-okè-gi? b͕akuta Chineke azu, nwua. |
|
JOB 19:17 |
Iku-umem aghọwo iku-ume onye nābughi di-ya n'ebe nwunyem nọ, Ariọwokwam umu afọ nnem aririọ-amara. |
|
JOB 1:10 |
Ọ̀ bughi Gi onwe-gi b͕aworo ya, b͕a-kwa-ra ulo-ya, b͕a-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige buruburu? I gọziwo ọlu aka-ya abua, ihe-nnweta-ya ab͕asawo kwa n'ala. |
|
EFESỌS 6:10-17 |
[10] Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.[11] Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.[12] N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.[13] N'ihi nka chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n'ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile.[14] Ya mere guzonu, mb͕e unu weresiri ezi-okwu ke úkwù-unu, were kwa ihe-agha nke nēb͕ochi obi yikwasi, bú ezi omume,[15] were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n'ukwu-unu;[16] tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya.[17] Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke: |
|
MATIU 5:22 |
ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ. |
|
ROM 3:23 |
n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke; |
|
ROM 6:23 |
N'ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi. |
|
JENESIS 9:25 |
Ọ we si, Onye anābu ọnu ka Kenean bu; Orù nke ndi-orù ka ọ gāburu umu-nne-ya ndikom. |
|
ABÙ ỌMA 104:9 |
I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya; Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa. |
|
JENESIS 6:12 |
Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n'ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n'elu uwa. |
|
JENESIS 7:20 |
Cubit iri na ise ka miri ahu di ike site n'elu ugwu; ewe kpuchie ugwu nile. |
|
JENESIS 8:5-9 |
[5] Miri we nēbilata mb͕e nile rue ọnwa nke-iri: n'ọnwa nke-iri ahu, n'ubọchi mbu nke ọnwa, ka ahuru elu ugwu.[6] O rue, mb͕e ọgu ubọchi abua gwusiri, na Noa meghere window nke ub͕ọ o mere:[7] o zipu ugolo ọma, nke púru nāpù nālata, rue mb͕e miri tasiri n'elu uwa.[8] Ọ we si n'ebe ọ nọ zipu nduru, ile ma miri esiwo n'elu ala taba;[9] ma nduru ahu ahughi ebe-izu-ike nye ọbu-ukwu-ya, ọ we laghachikute ya rue n'ub͕ọ, n'ihi na miri ahu di n'elu uwa nile: ọ we setipu aka-ya, were ya, me ka ọ bakute ya nime ub͕ọ. |
|
JENESIS 9:11 |
M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ: agaghi-ebipu kwa anu-aru nile ọzọ site na miri nke iju-miri ahu; iju-miri agaghi-adi kwa ọzọ ibibi uwa. |
|
ROM 12:14 |
Nāgọzinu ndi nēsob͕u unu; nāgọzinu, abu-kwa-la ha ọnu. |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |