A A A A A

Chineke: [Onye Chineke Bụ]


KỌLỌSI 1:16
n'ihi na nime Ya ka ekère ihe nile, nke di nime elu-igwe na nke di n'elu uwa, ihe apuru ihu anya na ihe anāpughi ihu anya, ma ọ bu oche-eze, ma-ọbu ibu-ndi-nwe-madu, ma-ọbu ibu-ndi-isi, ma-ọbu ichi-isi; esitewo n'aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile;

JENESIS 1:1
Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa.

HIBRU १:३
Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu;

HIBRU 4:12
N'ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n'ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi.

AISAIA 44:6
Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem.

JỌN 1:1
Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke.

JỌN १:१४
Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.

JỌN 3:16
N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.

JỌN 4:24
Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghaghi ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu.

1 JỌN 1:5
Nka bu kwa ozi ahu nke ayi nuworo n'ọnu-Ya, nākọ-kwa-ra unu, na Chineke bu ìhè, ọ dighi kwa ọchichiri ọ bula di nime Ya.

1 JỌN 4:8
Onye nādighi-ahu n'anya amaghi Chineke; n'ihi na Chineke bu ihu-n'anya.

1 JỌN 4:16
Ayi onwe-ayi amawo kwa ihu-n'anya ahu, ayi ekwerewo kwa na ya, bú nke Chineke nwere n'ebe ayi nọ. Chineke bu ihu-n'anya; onye nānọgide kwa n'ihu-n'anya; nime Chineke ka ọ nanọgide Chineke nānọgide kwa nime ya.

2 SAMUEL 7:22
N'ihi nka I di uku, Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.

JỌN 17:3
Ma nka bu ndu ebighi-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nání Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist.

ABÙ ỌMA 34:8
Detunu ire, hu na Jehova di nma: Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya.

ABÙ ỌMA 86:5
N'ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, di nma, I bu kwa onye nāb͕aghara nmehie, I nāba kwa uba n'ebere n'aru ndì nile nākpọku Gi.

NKPUGHE 1:1
Nkpughe nke Jisus Kraist, nke Chineke nyere Ya igosi ndi-orù-Ya, bú ihe nāghaghi iputa n'isi nso: O we site n'aka mọ-ozi-Ya ziga we gosi Jọn orù-Ya;

NKPUGHE 22:13
Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, onye mbu na onye ikpe-azu, nmalite na ọgwugwu.

ROM 5:8
Ma Chineke nēme ka ihu-n'anya nke aka Ya n'ebe ayi nọ puta ìhè, n'ihi na, mb͕e ayi nọ nābu ndi-nmehie, Kraist nwuru n'ihi ayi.

ZEFANAIA 3:17
Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu dike nke nāzọputa: O gēji ọṅù nwe obi-utọ n'aru gi, Ọ gedere du n'ihu-n'anya-Ya, Ọ gēji iti-nkpu-ọṅù teghari egwu ọṅù n'aru gi.

NKPUGHE 1:17-18
[17] Mb͕e m'huru Ya, m'we da n'ala n'ukwu-Ya dika onye nwuru anwu. O we bikwasim aka-nri-Ya, si, Atula egwu; Mu onwem bu onye mbu na onye ikpe-azu,[18] buru kwa Onye ahu nādi ndu; aghọ-kwa-ram onye nwuru anwu, ma le, anamadi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, enwe-kwa-ram nkpisi-ugodi nile nke ọnwu na nke Hedis

2 TIMỌTI 3:16-17
[16] Ihe ọ bula edeworo n'akwukwọ nsọ bu ihe si n'obi Chineke puta, ọ ba-kwa-ra urù iji zí ihe, na iji tu madu nmehie-ha n'anya, na iji me ka uche madu guzozie, na iji zùputa nzùputa nke di n'ezi omume:[17] ka onye nke Chineke we zue okè, onye emeworo ka o zue okè ilu ezi ọlu nile ọ bula.

JỌN 10:30-33
[30] Mu onwem na Nnam bu otù.[31] Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya.[32] Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M'gosiri unu site na Nnam; n'ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume?[33] Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006