A A A A A

Chineke: [Iwu]


MAK 10:19
I matawo ihe nile enyere n'iwu, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Emeb͕ula madu, Sọpuru nna-gi na nne-gi.

LUK 18:20
I matawo ihe nile enyere n'iwu, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Sọpuru nna-gi na nne-gi.

MATIU 22:34-40
[34] Ma ndi-Farisi, mb͕e ha nuru na O mereri ka ndi-Sadusi kpuchie ọnu-ha, ha zukọrọ n'otù ebe.[35] Otù onye n'etiti ha, bú onye-iwu, we jua Ya ajuju, nānwa Ya,[36] si, Onye-ozizí, òle ihe di uku nke enyere n'iwu nime iwu-ayi?[37] Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya.[38] Nka bu ihe uku na ihe mbu enyere n'iwu.[39] Ihe nke-abua nke yiri ya bu nka, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.[40] Iwu dum, na ndi-amuma Chineke, nēkokwasi n'ihe abua ndia enyere n'iwu.

ROM 13:9
N'ihi na okwu a, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Agu ihe ọjọ agula gi, ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di enyere n'iwu, achikọtara ya n'okwu a, bú, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.

MATIU 19:16-19
[16] Ma le, otù onye biakutere Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu ezi ihe gini ka m'gēme, ka m'we nwe ndu ebighi-ebi?[17] Ma Ọ siri ya, Gini mere i nājum ajuju bayere nke bu ezi ihe? Otù Onye di Nke bu ezi Onye: ma ọ buru na i nāchọ ibà nime ndu ahu, debe ihe nile enyere n'iwu.[18] Ọ si Ya, Òle? Jisus we si, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha,[19] Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.

MATIU 22:36-40
[36] si, Onye-ozizí, òle ihe di uku nke enyere n'iwu nime iwu-ayi?[37] Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya.[38] Nka bu ihe uku na ihe mbu enyere n'iwu.[39] Ihe nke-abua nke yiri ya bu nka, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.[40] Iwu dum, na ndi-amuma Chineke, nēkokwasi n'ihe abua ndia enyere n'iwu.

MATIU 10:17-22
[17] Ma nēzenu madu: N'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche, n'ulo-nzukọ nile ha ka ha gāpia kwa unu ihe;[18] e, n'iru ndi-isi na ndi-eze ka agēkuru kwa unu je n'ihim, iburu ha na ndi mba ọzọ àmà.[19] Ma mb͕e ọ bula ha gārara unu nye, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gēkwu ma-ọbu okwu unu gēkwu: n'ihi na agēnye unu n'oge hour ahu okwu unu gēkwu.[20] N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ nke Nna-unu Nke nēkwu nime unu.[21] Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye: umu gēbili kwa megide ndi muru ha, me ka ha nwua anwu.[22] Madu nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.

ROM 13:8-14
[8] Unu ejila onye ọ bula ugwọ ọ bula, ma-ọbughi ihurita onwe-unu n'anya: n'ihi na onye nāhu madu-ibe-ya n'anya edebezuwo iwu.[9] N'ihi na okwu a, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Agu ihe ọjọ agula gi, ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di enyere n'iwu, achikọtara ya n'okwu a, bú, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.[10] Ihu-n'anya adighi-alu ọlu ọjọ n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: ya mere ihu-n'anya bu idebezu iwu.[11] Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.[12] Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè.[13] Ka ayi nējeghari dika ọ kwesiri ayi, dika n'ehihie; ọ bughi n'ite-egwú na iṅubiga-manya-ókè, ọ bughi n'ikwa-iko na agu ikwa-iko, ọ bughi n'esem-okwu na ekworo.[14] Kama yikwasinu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, unu ebu-kwa-la uzọ nēchère aru, ime ihe ọjọ nāgu ya.

MAK 12:28-34
[28] Otù onye nime ndi-ode-akwukwọ bia-kwa-ra, we nu ka ha nājurita onwe-ha ajuju, ma ebe ọ matara na Ọ zarari ha nke-ọma, ọ jua Ya, si, Òle nke bu nke-mbu n'ihe nile enyere n'iwu?[29] Jisus zara, si, Nke-mbu bu, Nuru, Israel; Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, Onye-nwe-ayi bu otù:[30] i gāhu kwa Onye-nwe-ayi, bú Chineke-gi, n'anya, site n'obi-gi dum, site kwa na nkpuru-obi-gi dum, site kwa n'uche-gi dum, site kwa n'ike-gi dum.[31] Nke-abua bu nke à, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Ọ dighi ihe ọzọ enyere n'iwu nke dikariri ndia.[32] Ode-akwukwọ ahu we si Ya, Onye-ozizi, n'ezie I kwuru nke-ọma na Ọ bu otù; ọ dighi kwa chi ọzọ di ma-ọbughi Ya:[33] na ihu Ya n'anya site n'obi-gi dum, site kwa na nghọta-gi dum, site kwa n'ike-gi dum, na ihu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, ọ kachasi àjà-nsuresi-ọku nile na àjà ọzọ nile nke-uku.[34] Mb͕e Jisus huru na ọ zara dika onye nwere uche, Ọ si ya, I nọghi ebe di anya n'ala-eze Chineke. Ma ọ dighi onye nwere anya-ike site na mb͕e ahu iju Ya ajuju.

ỌPUPU 34:28
Ọ we nọ n'ebe ahu, ya na Jehova, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri o riri, ọ dighi kwa miri ọ ṅuru. Ọ we de n'elu mbadamba nkume abua ahu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú okwu iri ahu.

DEUTERONOMI 4:13
Ọ we gosi unu ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ọ nyere unu iwu ime, bú okwu iri ahu; Ọ we de ha n'elu mbadamba nkume abua.

DEUTERONOMI 10:4
O we dekwasi na mbadamba nkume ahu, dika odide mbu ahu si di, okwu iri ahu, nke Jehova gwara unu n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu n'ubọchi nkpọkọta ahu: Jehova we nyem ha.

DEUTERONOMI 5:7-22
[7] Gi enwela chi ọzọ tiyerem.[8] Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, bú oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa:[9] gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;[10] ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu.[11] Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.[12] Debe ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu.[13] Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile:[14] ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na ehi-gi, na inyinya-ibu-gi, na anu-ulo-gi nile, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula; ka orù-gi nwoke na orù-gi nwayi we zuru ike dika gi onwe-gi nēzu.[15] I gēcheta kwa na i buri orù n'ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, were aka di ike, were kwa ogwe-aka eseteri eseti, me ka i si n'ebe ahu puta: n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu idebe ubọchi-izu-ike.[16] Sọpuru nna-gi na nne-gi, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu: ka ubọchi-gi we di anya, ka ọ we di-kwa-ra gi nma, n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.[17] Gi eb͕ula madu.[18] Gi akwa-kwa-la iko.[19] Gi ezu-kwa-la ori.[20] Gi ab͕a-kwa-la àmà ugha megide madu-ibe-gi.[21] Gi enwe-kwa-la anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ; agu ulo madu-ibe-gi agu-kwa-la gi, ma-ọbu ubi-ya, ma-ọbu orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ma-ọbu ehi-ya, ma-ọbu inyinya-ibu-ya, ma-ọbu ihe ọ bula nke madu-ibe-gi nwere.[22] Okwu ndia ka Jehova were oké olu gwa nkpọkọta-unu nile n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, na igwe-oji ahu, na oké ọchichiri ahu: ma Ọ tukwasighi ihe ọzọ. O we dekwasi ha na mbadamba nkume abua, were ha nyem.

DEUTERONOMI 6:21
i gāsi kwa nwa-gi, Ayi buru Fero ndi-orù n'Ijipt; Jehova we were aka di ike me ka ayi si n'Ijipt puta:

DEUTERONOMI 10:1-5
[1] Na mb͕e ahu Jehova sirim, Wara onwe-gi mbadamba nkume abua dika nke-mbu, rigokutem rue ugwu a, me-kwa-ra onwe-gi ib͕e osisi.[2] M'gēdekwasi kwa na mbadamba nkume ahu okwu nile nke di n'elu mbadamba nkume mbu, nke i tupiara, i gētiye kwa ha nime ib͕e ahu.[3] M'we me ib͕e osisi acacia, wa mbadamba nkume abua dika nke-mbu, we rigo n'ugwu ahu, mbadamba nkume abua ahu di kwa n'akam.[4] O we dekwasi na mbadamba nkume ahu, dika odide mbu ahu si di, okwu iri ahu, nke Jehova gwara unu n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu n'ubọchi nkpọkọta ahu: Jehova we nyem ha.[5] M'we chigharia si n'ugwu ahu rida, tiye mbadamba nkume ahu nime ib͕e ahu nke m'mereri; ha di kwa n'ebe ahu, dika Jehova nyerem iwu.

ỌPUPU 20:1-17
[1] Chineke we kwue okwu ndia nile, si,[2] Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta.[3] Gi enwela Chi ọzọ tiyerem.[4] Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-ọbu oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa:[5] gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;[6] ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu.[7] Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.[8] Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ.[9] Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile:[10] ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula:[11] n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ.[12] Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.[13] Gi eb͕ula madu.[14] Gi akwala iko.[15] Gi ezula ori.[16] Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi.[17] Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n'ebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.

ỌPUPU 24:12
Jehova we si Moses, Rigokutem rue ugwu a, nọ kwa n'ebe ahu: ka M'nye kwa gi nkume abua ahu di mbadamba, na iwum, na ihe M'nyere n'iwu, bú nke M'deworo, ka i we zí ha.

ỌPUPU 34:10-29
[10] Ọ we si, Le, Mu onwem nāb͕a ndu: n'iru ndi-gi nile ka M'gālu oké ọlu di iche iche, bú nke ọ dighi mb͕e ekere ha n'uwa nile, ma-ọbu nime mba ọ bula: ndi nile ndi gi onwe-gi nọ n'etiti ha gāhu kwa ọlu Jehova, n'ihi na ihe-egwù ka ọ bu, bú nke Mu onwem nēme n'ebe i nọ.[11] Debere onwe-gi ihe nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta: le, M'gaje ichupu ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, n'iru gi.[12] Lezie onwe-gi anya, ka gi na ndi bi n'ala nke gi onwe-gi nābà nime ya ghara ib͕a ndu, ka ọ we ghara ibu ọnyà n'etiti gi:[13] kama unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, b͕utu Asherim-ha:[14] n'ihi na i gaghi-akpọ isi ala nye chi ọzọ: n'ihi na Jehova, Nke Onye-ekworo bu aha-Ya, Chineke ekworo ka Ọ bu:[15] ka gi na ndi bi n'ala ahu we ghara ib͕a ndu, ha we so chi-ha nākwa iko, churu chi-ha àjà, otù onye ewe kpọ gi, i we rie ufọdu nime ihe àjà-ya;[16] i we lutara umu-gi ndikom ufọdu nime umu-ha ndinyom, umu-ha ndinyom we so chi-ha nākwa iko, me kwa ka umu-gi ndikom soro chi-ha nākwa iko.[17] Gi emerela onwe-gi chi akpuru akpu.[18] Ememe achicha ekoghi-eko ka i gēdebe. Ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M'nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n'ọnwa Ebib: n'ihi na ọ bu nime ọnwa Ebib ka i siri n'Ijipt puta.[19] Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa bu nkem; na anu-ulo-gi ọ bula nke bu oké, nwa nke meghere àkpà-nwa ehi ma-ọbu aturu.[20] Ma nwa inyinya-ibu nke meghere àkpà-nwa, i gēwere nwa-aturu b͕aputa ya: ma ọ buru na i b͕aputaghi ya, i gāb͕aji kwa olu-ya. Ọkpara ọ bula n'etiti umu-gi ka i gāb͕aputa. Ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka.[21] Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n'ubọchi nke-asa i gākwusi: n'ilu-ọlu-ubi na n'owuwe-ihe-ubi i gākwusi.[22] I gēme-kwa-ra onwe-gi ememe nke izù asa nke ubọchi asa, bú nke nkpuru mbu nke obìbì ọka wheat, na ememe nke nchikọta-ihe n'ọb͕ub͕a arọ.[23] Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Onye-nwe-unu Jehova, bú Chineke nke Israel.[24] N'ihi na M'gānara mba di iche iche ala-ha n'iru gi, me ka ókè-ala-gi nile sa mbara: ọ dighi kwa onye ọ bula gēnwe anya-uku n'ebe ala-gi di, mb͕e i nārigo ka ewe hu gi n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ub͕ò atọ n'arọ.[25] Eb͕upula ọbara nke àjàm n'elu ihe nēko achicha; àjà ememe ngabiga agaghi-adigide kwa abali nile rue ututu.[26] Ihe mbu nke nkpuru mbu nke ala-ubi-gi ka i gēwebata n'ulo nke Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.[27] Jehova we si Moses, Dere onwe-gi okwu ndia n'ihe: n'ihi na dika okwu ndia si di ka M'b͕aworo ndu n'etiti Mu na gi, na n'etiti Mu na umu Israel.[28] Ọ we nọ n'ebe ahu, ya na Jehova, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri o riri, ọ dighi kwa miri ọ ṅuru. Ọ we de n'elu mbadamba nkume abua ahu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú okwu iri ahu.[29] O rue, mb͕e Moses siri n'ugwu Sainai rida (mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka Moses mb͕e o siri n'ugwu ahu rida), na Moses amaghi na akpukpọ iru-ya nēnwuputa ìhè mb͕e Ọ kpayere ya uka.

DEUTERONOMI 6:4-9
[4] Nuru, Israel; Jehova, bú Chineke-ayi, Jehova bu otù:[5] i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, were kwa ike-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya.[6] Okwu ndia, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, gādikwasi kwa n'obi-gi:[7] i gējisi kwa ike izí ha-umu-gi, i gēkwu kwa okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.[8] I gēke kwa ha n'elu aka-gi ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n'iru n'etiti anya-gi abua.[9] I gēdekwasi kwa ha n'awara-uzọ abua nke ulo-gi, na n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.

ỌPUPU 20:2-17
[2] Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta.[3] Gi enwela Chi ọzọ tiyerem.[4] Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-ọbu oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa:[5] gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;[6] ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu.[7] Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.[8] Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ.[9] Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile:[10] ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula:[11] n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ.[12] Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.[13] Gi eb͕ula madu.[14] Gi akwala iko.[15] Gi ezula ori.[16] Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi.[17] Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n'ebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.

ỌPUPU 31:18
Mb͕e Ọ kpayesiri Moses uka n'ugwu Sainai, O we nye ya mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu, bú mbadamba nkume, nke ewere nkpisi-aka Chineke de ihe n'elu ha.

JỌN 14:15
Ọ buru na unu nāhum n'anya, unu gēdebe ihe nile M'nyere n'iwu.

MATIU 19:18
Ọ si Ya, Òle? Jisus we si, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha,

JỌN 15:10
Ọ buru na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, unu gānọgide n'ihu-n'anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n'iwu, nọgide kwa n'ihu-n'anya-Ya.

MATIU 5:17
Unu echèla na abiaram imebi iwu Chineke ma-ọbu ndi-amuma-Ya: abiaghm imebi, kama imezu ya.

ỌPUPU 32:15
Moses we chigharia, si n'ugwu ahu rida, mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka-ya; bú mbadamba nkume nke edere ihe n'iru ha abua; n'otù iru na n'iru nke-ọzọ ka edeworo ihe n'elu nkume ahu.

JỌN 15:12-17
[12] Nka bu ihe M'nyere n'iwu ka unu hurita ibe-unu n'anya, dika M'huru unu n'anya.[13] Ọ dighi onye ọ bula nwere ihu-n'anya kari nka uku, ka madu tọb͕ọ ndu-ya n'ihi ndi-enyì-ya.[14] Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n'iwu.[15] Akpọkwaghm unu ndi-orù ọzọ site n'ub͕u a; n'ihi na orù adighi-amara ihe onye-nwe-ya nēme: ma akpọwom unu ndi-eyì; n'ihi na ihe nile M'nuru site n'ọnu Nnam ka M'mere ka unu mara.[16] Ọ bughi unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa: ka ihe ọ bula unu gāriọ Nnam n'aham, ka O we nye unu ya.[17] Ihe ndia ka M'nēnye unu n'iwu, ka unu we hurita ibe-unu n'anya.

ỌPUPU 32:16
Mbadamba nkume ahu, ọlu Chineke ka ha bu; odide ahu kwa, odide Chineke ka ọ bu, bú eb͕ub͕u eb͕uru n'elu mbadamba nkume abua ahu.

ỌPUPU 34:27
Jehova we si Moses, Dere onwe-gi okwu ndia n'ihe: n'ihi na dika okwu ndia si di ka M'b͕aworo ndu n'etiti Mu na gi, na n'etiti Mu na umu Israel.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006