A A A A A

Chineke: [Chụnanya na-enweghị atụ]


1 JỌN 4:16-18
[16] Ayi onwe-ayi amawo kwa ihu-n'anya ahu, ayi ekwerewo kwa na ya, bú nke Chineke nwere n'ebe ayi nọ. Chineke bu ihu-n'anya; onye nānọgide kwa n'ihu-n'anya; nime Chineke ka ọ nanọgide Chineke nānọgide kwa nime ya.[17] Nime nka ka emeworo ka ihu-n'anya zue okè n'akuku ayi, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu n'ubọchi ikpé ahu; n'ihi na dika Ya onwe-ya di, ayi onwe-ayi di kwa otú a n'uwa nka.[18] Egwu adighi n'ihu-n'anya: kama ihu-n'anya nke zuru okè nāchupu egwu n'èzí, n'ihi na egwu, akēmeghi ya ka o zue òkè nime ihunanya

1 PITA 4:8
nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n'anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n'ihi na ihu-n'anya nēkpuchi ọtutu nmehie:

KỌLỌSI 3:14
ma n'elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n'anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè.

EFESỌS 2:8
n'ihi na ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n'okwukwe; nka esiteghi kwa n'onwe-unu: ọ bu onyinye Chineke:

EFESỌS 5:25
Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ya;

JEREMAIA 31:3
Site n'ebe di anya ka Jehova mere ka m'hu Ya, si, Ọ bu ihu-n'anya nke di mb͕e ebighi-ebi ka M'jiworo hu gi n'anya: n'ihi nka ka M'meworo ka ebere digidere gi.

JỌN 3:16
N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.

1 KỌRINT 13:7
ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n'ihe nile.

1 KỌRINT 13:13
Ma ub͕u a ka okwukwe, olile-anya, ihu-n'anya, ihe atọ ndia, nānọgide; ma nke kachasi n'ihe ndia bu ihu-n'anya.

1 JỌN 3:1
Lenu aha ihunanya nka bu nke Nna-ayi nyeworo ayi, ka ewe kpọ ayi umu Chineke: ayi bu kwa umu-Ya. N'ihi nka uwa amaghi ayi, n'ihi na ọ maghi Ya.

1 JỌN 3:16
Nime nka ka ayi maworo ihu-n'anya, n'ihi na Ya onwe-ya tọb͕ọrọ ndu-Ya n'ihi ayi: ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ itọb͕ọ ndu-ayi n'ihi umu-nna-ayi.

1 JỌN 4:8
Onye nādighi-ahu n'anya amaghi Chineke; n'ihi na Chineke bu ihu-n'anya.

JỌN 14:21
Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya.

JỌN 15:12-13
[12] Nka bu ihe M'nyere n'iwu ka unu hurita ibe-unu n'anya, dika M'huru unu n'anya.[13] Ọ dighi onye ọ bula nwere ihu-n'anya kari nka uku, ka madu tọb͕ọ ndu-ya n'ihi ndi-enyì-ya.

LUK 6:27
Ma asim unu ndi nānu okwum, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēmenu ihe ọma nye ndi nākpọ uṅu asì,

ILU 10:12
Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche: Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi.

ILU 17:17
Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya, Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.

ROM 3:23
n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;

ROM 5:5-8
[5] Olile-anya ahu emeghi kwa ka ihere me ayi; n'ihi na awusaworo ihu-n'anya nke Chineke n'obi-ayi site n'aka Mọ Nsọ Nke enyere ayi.[6] N'ihi na mb͕e ayi nọ nādighi ike, mb͕e oge-Ya ruru Kraist nwuru n'ihi ndi nādighi-asọpuru Chineke.[7] N'ihi na ọ di ike na otù onye gānwu n'ihi onye ezi omume: n'ihi na ma eleghi anya otù onye gēnwe anya-ike ọbuná inwu n'ihi ezi madu.[8] Ma Chineke nēme ka ihu-n'anya nke aka Ya n'ebe ayi nọ puta ìhè, n'ihi na, mb͕e ayi nọ nābu ndi-nmehie, Kraist nwuru n'ihi ayi.

ROM 8:35
Ònye gēkewapu ayi n'ihu-n'anya nke Kraist? Ọ̀ bu nkpab͕u, ma-ọbu oké nkpà, ma-ọbu nsob͕u, ma-ọbu oké unwu, ma-ọbu ib͕a-ọtọ, ma-ọbu ize-ndu, ma-ọbu mma-agha?

ROM 12:9-10
[9] Ka ihu-n'anya buru ihe nke iru-abua nādighi nime ya. Nākpọnu ajọ ihe asì; nārapara ezi ihe n'aru.[10] N'akuku ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ, ka ihe madu-ibe-unu nātọrita unu utọ nke-uku; n'akuku nsọpuru-unu, nācharanu ibe-unu uzọ;

TAITỌS 3:4-5
[4] Ma mb͕e egosiri obi-ọma nke Onye-nzọputa-ayi Chineke, ya na ihu-n'anya-Ya n'ebe madu nọ,[5] O siteghi n'ọlu di iche iche aluru n'ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n'ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme,

1 JỌN 4:9-10
[9] Nime nka ka emere ka ihu-n'anya Chineke puta ìhè nime ayi, na Chineke ewerewo Ọkpara Ọ muru nání Ya zite n'uwa, ka ayi we di ndu site n'aka-Ya.[10] Nime nka ka ihu-n'anya di, ọ bughi na ayi onwe-ayi huru Chineke n'anya, kama ọ bu na Ya onwe-ya huru ayi n'anya, we zite Ọkpara-Ya ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi bayere nmehie-ayi.

JỌN 13:34-35
[34] Iwu ọhu M'nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n'anya; dika M'huru unu n'anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n'anya.[35] Madu nile gēji nka mara na unu bu ndi nēso uzọm, ọ buru na unu enwerita ihu-n'anya n'ebe ibe-unu nọ.

1 KỌRINT 13:4-7
[4] Ihu-n'anya nwere ogologo-ntachi-obi, o nwe-kwa-ra obi-ọma; ihu-n'anya adighi-ekwo ekworo; ihu-n'anya adighi-anya isi, ọ dighi-afuli onwe-ya elu,[5] ọ dighi-eme ihe nādighi nma n'anya, ọ dighi-achọ ihe nke aka ya, oké iwe adighi-ewe ya, ọ dighi-agu ihe ọjọ emere ya;[6] ọ dighi-aṅuri ọṅu nime ajọ omume, ma ọ nēso ezi-okwu ṅurikọ ọṅu;[7] ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n'ihe nile.

MATIU 5:43-48
[43] Unu nuru na ekwuru, si, Hu madu-ibe-gi n'anya, kpọ kwa onye-iro-gi asì:[44] ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu;[45] ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n'elu-igwe: n'ihi na Ọ nēme ka anyanwu-Ya nāwakwasi ajọ madu na ezi madu, Ọ nēme kwa ka miri zokwasi ndi ezi omume na ndi ajọ omume.[46] N'ihi na ùnu nwere ugwọ-ọlu gini, ma ọ buru na unu huru ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu unu n'anya? ọbuná ndi-ọna-utu, hà adighi-eme otù ihe ahu?[47] Ọ buru kwa na unu nēkele nání umu-nne-unu, gini ka unu nēme kari ndi ọzọ? ọbuná ndi mba ọzọ, hà adighi-eme otù ihe ahu?[48] Ya mere unu onwe-unu gēzu okè, dika Nna-unu nke elu-igwe zuru okè.

1 KỌRINT 1:1-13
[1] Pọl, onye akpọrọ ibu onye-ozi nke Jisus Kraist site n'ọchichọ nke Chineke, na Sostenis nwa-nna-ayi,[2] nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, bú ndi edoworo nsọ nime Kraist Jisus, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ, ha na ndi nile nākpọku aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'ebe nile, bú Onye-nwe ayi na ha:[3] Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.[4] Anamekelere unu Chinekem mb͕e nile, n'ihi amara nke Chineke nke enyere unu nime Kraist Jisus;[5] na n'ihe nile ọ bula emere unu ndi-ọgaranya nime Ya, n'okwu nile na ọmuma nile;[6] dika emere ka àmà nke Kraist guzosie ike nime unu:[7] nke mere na ọ dighi onyinye-amara fọduru nke unu nēnweghi; unu nēche kwa nkpughe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;[8] Onye gēme kwa ka unu guzosie ike rue ọgwugwu ihe nile, buru ndi anāpughi ibo ebubo n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.[9] Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye esitere n'aka Ya kpọbata unu na nnwekọ nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.[10] Ma, umu-nnam, esiterem n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist riọ unu, ka unu nile nēkwu otù ihe, ka nkewa ghara kwa idi n'etiti unu; kama ka eme unu ka unu zue okè n'otù uche ahu na n'otù ìzù ahu.[11] N'ihi na ndi èzí-na-ulo Kloi gosirim ihe bayere unu, umu-nnam, na esem-okwu di n'etiti unu.[12] Ihe m'nēkwu bu nka, na unu nile n'otù n'otù nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mu onwem bu kwa nke Apọlos; mu onwem bu kwa nke Kifas; mu onwem bu kwa nke Kraist.[13] Èkèwo Kraist èkè? ọ̀ gābu na akpọgidere Pọl n'obe n'ihi unu? mà-ọbu na emere unu baptism ibà n'aha Pọl?

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006