A A A A A

Chineke: [Atọ n'Ime Otu]


1 KỌRINT 8:6
ma n'ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n'aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n'aka-Ya.

2 KỌRINT 3:17
Ma Onye-nwe-ayi bu Mọ ahu: ma ebe Mọ nke Onye-nwe-ayi nọ, n'ebe ahu ka madu nwere onwe-ha.

2 KỌRINT 13:14
Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile.

KỌLỌSI 2:9
n'ihi na nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu,

AISAIA 9:6
N'ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n'ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo.

AISAIA 44:6
Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem.

JỌN 1:14
Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.

JỌN 10:30
Mu onwem na Nnam bu otù.

LUK 1:35
Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke.

MATIU 1:23
Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.

MATIU 28:19
Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ:

MATIU 3:16-17
[16] Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya;[17] ma le, olu sitere n'elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.

ROM 14:17-18
[17] n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ.[18] N'ihi na onye nābu orù Kraist n'uzọ nka, ọ di Chineke ezi utọ, buru kwa onye anwaputara n'iru madu.

LUK 3:21-22
[21] Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe,[22] Mọ Nsọ we fedakwasi Ya n'oyiyi aru, dika nduru, olu we site n'elu-igwe, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya; ihe-Gi dim ezi mma.

JENESIS 1:1-2
[1] Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa.[2] Uwa we buru ihe tọb͕ọrọ n'efu na ihe tọb͕ọrọ nkití; ọchichiri di kwa n'elu ob͕u-miri: Mọ Chineke nērughari kwa n'elu miri.

JỌN 5:7-8
[7] Onye ahu aru nādighi ike zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, enweghm madu, ka ọ tubàm n'ọdọ-miri ntà nka, mb͕e ọ bula akpasuru miri: ma mb͕e mu onwem nọ nābia, onye ọzọ eburum uzọ rida.[8] Jisus si ya, Bilie, chiri ute-gi, nējeghari.

1 PITA 1:1-2
[1] Pita, onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi arọputaworo ndi bi dika ọbìa n'etiti Nb͕asa ahu nime Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia,[2] ndi arọputaworo dika ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara si di, nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ, ka unu we ṅa Jisus Kraist nti, ka ewe fesa kwa unu ọbara-Ya: Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo.

2 KỌRINT 1:21-22
[21] Ma Onye ahu Nke nēme ka ayi na unu guzosie ike nime Kraist, Onye te-kwa-ra-ayi manu n'isi, bu Chineke;[22] Onye ka-kwa-ra ayi akàrà, nye kwa ayi Mọ Nsọ n'obi-ayi, bú ihe ayi ji mara na ayi gēnwezu nkwa ahu nile.

1 KỌRINT 12:4-6
[4] Ma òkìkè nke onyinye-amara di, ma ọ bu otù Mọ Nsọ ahu.[5] Òkìkè nke ije-ozi di kwa, otù Onye-nwe-ayi ahu di kwa.[6] Òkìkè ihe alutaworo n'ọlu di kwa, ma ọ bu otù Chineke ahu, Onye nālusi ihe nile ike nime ayi nile.

EFESỌS 4:4-6
[4] Otù aru di, otù Mọ di kwa, dika akpọ-kwa-ra unu nime otù olile-anya nke ọkpukpọ-unu;[5] otù Onye-nwe-ayi di, otù okwukwe di, otù baptism di,[6] otù Chineke na Nna nke ayi nile di, Onye bu isi ayi nile, Onye site-kwa-ra n'aka ayi nile nālu ọlu, Onye nānọ kwa nime ayi nile.

KỌLỌSI 1:15-17
[15] Onye bu onyinyo nke Chineke ahu Nke anāpughi ihu anya, buru kwa onye eburu uzọ mu n'ihe nile ekère èkè;[16] n'ihi na nime Ya ka ekère ihe nile, nke di nime elu-igwe na nke di n'elu uwa, ihe apuru ihu anya na ihe anāpughi ihu anya, ma ọ bu oche-eze, ma-ọbu ibu-ndi-nwe-madu, ma-ọbu ibu-ndi-isi, ma-ọbu ichi-isi; esitewo n'aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile;[17] Ya onwe-ya bū kwa ihe nile uzọ, ọ bu kwa nime Ya ka ihe nile nēguzokọ n'otù.

JỌN 14:9-11
[9] Jisus si ya, Ogologo oge di otú a ka Mu na gi nọ, ma ì mataghm, Filip? onye huworom anya ahuwo Nnam anya; gì onwe-gi si aṅa si, Gosi ayi Nnam ahu?[10] Ì kweghi na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem? okwu Mu onwem nāgwa unu ekwughi m n'Onwem: ma Nnam Nke nēbi nimem nālu ọlu-Ya.[11] Kwerenum na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem: ma ọ bughi, kwerenum n'ihi ọlum onwe-ha.

FILIPAI 2:5-8
[5] Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus:[6] Onye, ọ bu ezie na Ọ diri n'udi nke Chineke na mbu, ma Ọ gughi ya n'ihe O gējidesi ike, bú ira ka Chineke,[7] kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n'inara udi nke orù, ewe me Ya n'oyiyi nke madu;[8] ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n'oyiyi-Ya, O wedakwara Onwe-ya, we buru Onye nāṅa nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe.

JỌN 10:30-36
[30] Mu onwem na Nnam bu otù.[31] Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya.[32] Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M'gosiri unu site na Nnam; n'ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume?[33] Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke.[34] Jisus zara ha, si, Èdeghi ya n'iwu-unu, si, Mu onwem siri, Chi ka unu bu?[35] Ọ buru na Ọ kpọrọ ndi ahu chi, ndi okwu Chineke biaruru (apughi kwa imebi ihe edere n'akwukwọ nso),[36] ùnu onwe-unu nēkwu okwu bayere Onye ahu Nnam doro nsọ zite kwa n'uwa, si, I nēkwulu Chineke; n'ihi na asim, Abum Ọkpara Chineke?

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006