A A A A A

Chineke: [Atụmatụ]


ILU 19:21
Ọtutu èchìchè di n'obi madu; Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.

JEREMAIA 29:11
N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.

ILU 15:22
Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh: Ma n'ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike.

ABÙ ỌMA 33:11
Ndum-ọdu Jehova nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi, Èchìchè nile nke obi-Ya rue ọb͕ọ nile.

ILU 16:3
Turu ọlu-gi nile rue Jehova aru, Èchìchè-gi nile ewe guzosie ike.

ILU 21:5
Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù: Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ.

ABÙ ỌMA 20:4
Ya nye gi dika obi-gi si acho, Mezu kwa ndum-ọdu-gi nile.

ABÙ ỌMA 33:10
Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile: Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è.

LUK 14:28
N'ihi na ònye nime unu, nke nāchọ íwu ulo-elu, nēbughi uzọ nọdu ala gu ego ọ gēwe, ma o nwere ego ọ gēji lusia ya?

ILU 16:9
Obi madu nēchè uzọ-ya: Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.

ROM 8:28
Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di.

FILIPAI 1:6
ebe m'tukwasiworo obim n'otù ihe nka, na Onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisus Kraist:

AISAIA 14:26-27
[26] Nka bu nzube ahu nke anēzube n'elu uwa nile: nka bu kwa aka ahu nke anēseti n'aru mba nile.[27] N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo; ònye gēmebi kwa ya? aka-Ya esetiwo kwa; ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu.

JỌN 6:44
Ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na Nna Nke ziterem adọghi ya: Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.

ABÙ ỌMA 143:8
Mem ka m'nuru ebere-Gi n'ututu; N'ihi na Gi ka m'tukwasiworo obi: Mem ka m'mara uzọ nke m'gēje ije nime ya; N'ihi na Gi ka m'buliworo nkpuru-obim nye.

ILU 23:4
Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya; Site na nghọta-gi ra ya aka.

ABÙ ỌMA 90:12
Si otú a me ka ayi mara iguta ubọchi-ayi, Ka ayi we me ka obi amam-ihe bia.

ABÙ ỌMA 3:31-32
[31] Nkpuru-obim nāma kwa jijiji nke-uku: Ma Gi onwe-gi, Jehova, rùe ole mb͕e?[32] Lata, Jehova, dọputa nkpuru-obim: Zọputam n'ihi ebere-Gi.

AISAIA 46:3-11
[3] Genum nti, unu uio Jekob, na ulo Israel nile fọduru afọdu, unu ndi bu ibu eboro ebo site n'afọ nne-unu, ndi eburu ebu site n'àkpà-nwa:[4] ọzọ, rue agadi Mu onwem bu Onye ahu, ru kwa isi-awọ Mu onwem gēku unu n'aka: Mu onwem emewo, Mu onwem gēbu kwa; e, Mu onwem gēku n'aka me kwa ka unu wepuga onwe-unu.[5] Ònye ka unu gasi na M'yiri ya, na Mu na ya rara nrata, na Mu di ka ya, ka ayi we yie?[6] Ndi ahu ndi nāwufu ọla-edo n'akpa, ndi nātù kwa ọla-ọcha n'ihe-ọtùtù, ha nēgota onye-nnucha-ọla, o we me ya ka ọ buru chi: ha nāda kpu iru n'ala, e, ha nākpọ isi ala.[7] Ha nēbuli ya n'ubu, n'ebu ya, we dọba ya n'ọnọdu-ya, o we guzo; ọ gaghi-esi n'ebe-ya pua: e, madu gētiku ya nkpu, ma ọ gaghi-aza, ọ gaghi-azọputa ya n'ahuhu-ya.[8] Chetanu nka, jisi-kwa-nu ike: menu ka ọ biaghachi n'obi, unu ndi-njehie.[9] Chetanu ihe mbu nile site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: n'ihi na Mu onwem bu Chineke, ọ dighi kwa Chineke ọzọ di; abum Chineke, ọ dighi kwa otù efu di ka Mu onwem;[10] nēgosi ikpe-azu site na mbu, nēgosi kwa ihe nke anēmeghi eme site na mb͕e ochie; nāsi, Ndum-ọdum gēguzosi ike, ọ bu kwa ihe nile nke nātọm utọ ka M'gēme:[11] nēsi n'ọwuwa-anyanwu kpọ udele, nēsi kwa n'ala di anya kpọ onye gēme ndum-ọdum: e, ekwuwom, M'gēme kwa ka o me; ezubewom, M'gēme kwa ya.

JỌN 1:12-13
[12] Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n'aha-Ya:[13] ndi amuru, ọ bughi site n'ọbara, ọ bughi kwa site n'ọchichọ anu-aru, ọ bughi kwa site n'ọchichọ nwoke, kama site na Chineke.

NKPUGHE 17:8
Anu-ọhia ahu nke i huru diri, ọ dighi kwa ub͕u a; ọ gaje kwa isi n'abyss ahu rigoputa, na ila n'iyì. Ọ gēju kwa ndi bi n'elu uwa anya, bú ndi anēdeghi aha-ha n'akwukwọ nke ndu ahu site n'oge itọ ntọ-ala uwa, mb͕e ha nēle anu-ọhia ahu anya, na ọ diri, ọ dighi kwa ub͕u a, ọ gābia kwa.

EMOS 3:7
N'ezie Onye-nwe-ayi Jehova agaghi-eme ihe, ma ọ buru na O kpugheghi ìzù nzuzo Ya nye ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma-Ya.

JEMES 4:1-17
[1] Òle ebe ibu-agha si bia, òle ebe kwa ilu-ọ̀gù si bia, bú nke di n'etiti unu? ọ̀ bughi n'ebe ahu, bú ihe-utọ nile unu nke nēbu agha n'ihe nile di unu n'aru, ka ha si bia?[2] Agu nāgu unu, ma unu enwegh: unu nēb͕u madu, nēkwo kwa ekworo, unu apughi kwa ihu ihe unu chọrọ: unu nālu ọ̀gù, nēbu kwa agha; unu enweghi, n'ihi na unu ariọghi.[3] Unu nāriọ, ma unu adighi-anata ihe, n'ihi na unu nāriọ n'obi ọjọ, ka unu we mefu ya n'ihe-utọ nile unu.[4] Unu ndi nākwa iko, ùnu amataghi na ibu eyì nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyì nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke.[5] Ma-ọbu ùnu nēchè na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu okwu n'efu? Àgu ayi nāgusi Mọ ahu ike n'uzọ ekworo, bú Mọ Nke O mere ka O biri nime ayi?[6] Ma Ọ nēnye kari amara. N'ihi nka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si, Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.[7] Ya mere donu onwe-unu n'okpuru Chineke; ma guzogidenu ekwesu, ọ gāb͕apu kwa n'ebe unu nọ.[8] Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso. Menu ka aka-unu di ọcha, unu ndi-nmehie; me-kwa-nu ka obi-unu di ọcha, unu ndi nwere uche abua.[9] Hujunu anya, ru-kwa-nu újú, kwa-kwa-nu ákwá: ka ọchì-unu ghọ iru-újú, ka ọṅù-unu ghọ kwa nb͕aru-iru.[10] Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu.[11] Umu-nnam, unu ekwutọritala ibe-unu. Onye nēkwutọ nwa-nna-ya, ma-ọbu nēkpe nwa-nna-ya ikpé, o nēkwutọ iwu, nēkpe kwa iwu ikpé: ma ọ buru na i nēkpe iwu ikpé, i bughi onye nēdebe iwu, kama i bu onye-ikpé-ya.[12] Nání otù Onye bu onye nēnye iwu, buru kwa onye-ikpé, bú Onye ahu Nke puru izọputa na ila ihe n'iyì: ma gì onwe-gi bu onye, gi onye nēkpe onye-ab͕ata-obi-gi ikpé?[13] Genu nti, unu ndi nāsi, Ta ma-ọbu echi ka ayi gāga obodo a, nọ kwa n'ebe ahu otù arọ, zu kwa ahia, rita kwa urù:[14] ma unu bu ndi nāmataghi ihe gēme echi. Ǹdu-unu bu gini? N'ihi na unu bu alulu, nke nāputa ìhè nwa oge, emesia ọ we pua n'anya.[15] Ma nke kwesiri unu ka unu kwue bu, Asi na Onye-nwe-ayi chọrọ, ayi gādi ndu, me kwa ihe a ma-ọbu ihe ahu.[16] Ma otú ọ di, unu nānya isi n'oké okwu-unu: inya-isi nile di otú a bu ajọ ihe.[17] Ya mere onye matara ime ihe ọma, ma ọ meghi ya, ọ buru onye ahu nmehie.

ILU 3:5-6
[5] Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi:[6] N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.

2 PITA 3:9
Onye-nwe-ayi anọghi ọdù n'ime nkwa-Ya, dika ufọdu nāgu ya na ọ bu inọ-ọdù; kama Ọ nātachiri unu ogologo-ntachi-obi, n'ihi na O zubeghi ka ndi ọ bula la n'iyì, kama ka madu nile bia rue nchèghari.

1 TIMỌTI 2:4
Onye nāchọ ka azọputa madu nile, ka ha biaru kwa nmazu nke ezi-okwu.

JENESIS 1:26
Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa.

MATIU 28:18-20
[18] Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n'elu-igwe na n'elu uwa nyem.[19] Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ:[20] nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.

ILU 6:6-8
[6] Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu; Le uzọ-ya nile, we mara ihe:[7] Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi,[8] Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku, Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi.

JEREMAIA 1:5
Tutu akpua m gi n'afọ amaram gi, ọ bu kwa tutu i si n'àkpà-nwa puta ka M'doro gi nsọ; ewerewom gi nye ka gi buru onye-amuma diri mba nile.

EFESỌS 1:4
dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa, ka ayi we di nsọ buru kwa ndi anāpughi ita uta n'iru Ya n'ihu-n'anya:

HIBRU 4:3
N'ihi na ayi, bú ndi kwere ekwe, nābà n'izu-ike ahu; dika O kwuworo, si, Dika M'ṅuru iyi n'iwem, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli: ọ bu ezie na alusiri ọlu nile site na ntọ-ala nke uwa.

ROM 3:10-18
[10] dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli;[11] Ọ dighi onye nāghọta, Ọ dighi onye nāchọ Chineke;[12] Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n'ihe n'otù; Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye:[13] Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ: Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha:[14] Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:[15] Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;[16] Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha;[17] Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa:[18] Egwù Chineke adighi n'anya-ha.

AISAIA 55:10-11
[10] N'ihi na dika oké miri-ozuzọ na snow si esi n'elu-igwe ezo, ma ọ bughi n'ebe ahu ka ọ nālaghachi, ma ọ buru na o bughi uzọ desia ala, we me ka o me ihe-omume, ka o pu kwa ihe-opupú; o we were nkpuru nye ọgha-nkpuru, were kwa nri nye onye nēri ihe;[11] otú a ka okwum di nke nēsi n'ọnum puta: ọ gaghi-alaghachikutem n'efu, ma ọ buru na o bughi uzọ mezu ihe tọrọm utọ, we ga nke-ọma n'ihe M'zigara ya.

AISAIA 9:6-7
[6] N'ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n'ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo.[7] Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.

DEUTERONOMI 29:29
Ihe nile ezoro ezo diri Jehova, bú Chineke-ayi: ma ihe nile ekpughere ekpughe diri ayi, di-kwa-ra umu-ayi rue mb͕e ebighi-ebi, ka ayi we me okwu nile nke iwu a.

ROM 9:22-24
[22] Gini kwa, ma ọ buru na Chineke, ọ bu ezie na Ọ nāchọ igosi iwe-Ya, na ime ka amara ike-Ya, ma O were ogologo-ntachi-obi ri nne nagide ihe iwe edoziworo ka ha bà n'ila-n'iyì:[23] ka O we me kwa ka amara àkù nke ebube-Ya n'aru ihe diri ebere, nke O buru uzọ dozie ka ha ba n'ebube,[24] bú ayi onwe-ayi, ndi Ọ kpọ-kwa-ra, ọ bughi site na nání ndi-Ju, kama site kwa na ndi mba ọzọ?

1 PITA 2:9-10
[9] Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:[10] ndi nābughi ndi n'oge gara aga, ma ub͕u a unu bu ndi nke Chineke: ndi anēmereghri ebere, ma ub͕u a unu bu ndi emeworo ebere.

ROM 8:18-25
[18] N'ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ub͕u a ekwesighi ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n'ebe ayi nọ.[19] N'ihi na olile-anya siri ike nke ihe nile ekère èkè nēchesi nkpughe nke umu-ndikom Chineke ike.[20] N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya;[21] n'ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n'ibu-orù nmebi ba n'ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke.[22] N'ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a.[23] Ma ọ bughi nání nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mb͕e ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú nb͕aputa nke aru-ayi.[24] N'ihi na ọ bu n'olile-anya ka azọputara ayi: ma olile-anya nke anāhu anya abughi olile-anya: n'ihi na ihe madu nāhu anya, gini mere o ji nēle anya ya?[25] Ma ọ buru na ayi nēle anya ihe ayi nāhughi anya, ayi ji ntachi-obi nēchesi ya ike.

ỌPUPU 20:1-17
[1] Chineke we kwue okwu ndia nile, si,[2] Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta.[3] Gi enwela Chi ọzọ tiyerem.[4] Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-ọbu oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa:[5] gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;[6] ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu.[7] Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.[8] Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ.[9] Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile:[10] ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula:[11] n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ.[12] Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.[13] Gi eb͕ula madu.[14] Gi akwala iko.[15] Gi ezula ori.[16] Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi.[17] Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n'ebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006