A A A A A

Chineke: [Ọrụ ebube]


ỌLU OZI 3:16
Site kwa n'okwukwe ekwere n'aha-Ya ka aha-Ya nyere nwoke a ume, onye unu nēle anya mata kwa: e, okwukwe ahu nke sitere n'aka-Ya mere ka aru-ya dizu nma n'iru unu nile.

DEUTERONOMI 10:21
Ya Onwe-ya bu otuto-gi, Ya Onwe-ya bu kwa Chineke-gi, Onye meworo gi ihe uku ndia di egwu, nke anya-gi huworo.

ỌPUPU 15:26
si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.

JEREMAIA 32:27
Le, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke anu-aru nile, bú madu: ọ̀ di ihe ọ bula karirim ime?

JỌN 2:11
Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya.

LUK 18:27
Ma Ọ siri, Ihe anāpughi ime n'ebe madu nọ apuru ime n'ebe Chineke nọ.

MAK 9:23
Ma Jisus siri ya, Ọ buru na I puru! Onye nke kwere puru ime ihe nile.

MATIU 17:20
O we si ha, N'ihi okwukwe ntà unu: n'ihi na n'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi ugwu a, Si n'ebe a gabiga n'ebe ahu; ọ gāgabiga kwa; ihe ọ bula agaghi-adi kwa nke unu nāpughi ime.

MATIU 19:26
Ma Jisus lere ha anya, si ha, N'ebe madu nọ nka bu ihe anāpughi ime; ma apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ.

MATIU 21:21
Jisus we za, si ha, N'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe, ghara inwe obi abua, ọ bughi nání ihe emere osisi fig nka ka unu gēme, ma ọ buru na unu gāsi ọbuná ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri, agēme ihe ahu.

ROM 15:18-19
[18] N'ihi na m'gaghi-enwe anya-ike ikwu ihe o bula ma-ọbughi n'ihe nile Kraist lutara site n'akam, ime ka ndi mba ọzọ ṅa nti, n'okwu na ọlu,[19] n'ike nke ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, n'ike nke Mọ Nsọ; ya mere site na Jerusalem, na ala nke di ya gburugburu rue Ilirikọm, ezìzuwom ozi ọma Kraist;

ỌLU OZI 19:11-12
[11] Chineke nālu kwa ọlu di ike site n'aka Pọl dika anāhughi mb͕e ọ bula:[12] ya mere anēsi n'aru-ya wetara ndi aru-ha nādighi ike ichafọ ma-ọbu ákwà apron, ọria-ha we la n'aru-ha, ajọ mọ nile aputa kwa.

JOB 5:8-9
[8] Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke, Chineke ka m'gēbo kwa okwum:[9] Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi; Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:

EFESỌS 3:20-21
[20] Ma otuto diri Onye ahu Onye puru imebiga ókè nke-uku ri nne kari ihe nile nke ayi nāriọ ma-ọbu nke ayi nātughari uche, dika ike nke nālusi ike nime ayi si di,[21] otuto diri Ya nime nzukọ-Ya na nime Kraist Jisus rue ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

ỌLU OZI 4:29-31
[29] Ub͕u a, Onye-nwe-ayi, le kwa iba-nba-ha anya: nye kwa ndi-orù-Gi ike ka ha were nkwuwa-okwu nile kwue okwu-Gi,[30] n'iseti aka-Gi ime ka aru madu di ike; ka ewe me kwa ihe-iriba-ama na ọlu-ebube site n'aha Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus.[31] Mb͕e ha riọsiri aririọ, ewe me ka ebe ha nọ na nzukọ me nkpatu; ha nile we juputa na Mọ Nsọ, we were nkwuwa-okwu nēkwu okwu Chineke.

MAK 16:17-20
[17] Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n'aham ka ha gāchupu ndi-mọ ọjọ; ha gēkwu okwu n'asusu ọhu di iche iche;[18] ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha aṅua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gaghi emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike.[19] Ya mere, otú a, mb͕e Ọ gwasiri ha okwu, ewe kuru Onye-nwe-ayi Jisus rigo n'elu-igwe, O we nọdu n'aka-nri nke Chineke.[20] Ndi ahu we pua, kwusa ebe nile, Onye-nwe-ayi nēso kwa ha n'ilu ọlu, nēme okwu-ha ka o guzosie ike site n'ihe-iriba-ama di iche iche nke nēso. Amen.

LUK 9:13-17
[13] Ma Ọ siri ha, Unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si, Ayi enweghi kari ob͕e achicha ise na azù abua; ma-ọbughi na ayi onwe-ayi gāga zuta nri nye ndi nka nile.[14] N'ihi na ha ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri. O we si ndi nēso uzọ-Ya, Menu ka ha nọdu ala n'òtù di iche iche, ihe dika ọgu madu abua na iri n'otù òtù.[15] Ha we me otú ahu, me ka ha nile nọdu ala.[16] O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawa; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n'iru ìgwè madu ahu.[17] Ha we rie, afọ ju-kwa-ra ha nile: ewe tutukọ iberibe fọduru ha, nkata iri na abua.

LUK 8:43-48
[43] Otù nwanyi nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, nke mefusiri ihe dum o ji biri n'aru ndi-dibia, ma ọ dighi onye ọ bula nwere ike ime ka aru-ya di ike,[44] nwanyi ahu we bia n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ngwa ngwa orùrù-ọbara-ya we guzo.[45] Jisus we si, Ònye bu onye ahu nke meturum aka? Ma mb͕e madu nile di nāgo, Pita na ndi ya na ha yikọ si, Nna-ayi, ìgwè madu ndia nādagide Gi nākpab͕u kwa Gi.[46] Ma Jisus siri, Madu meturum aka: n'ihi na Mu onwem mara na ike esiwori n'arum puta.[47] Ma mb͕e nwanyi ahu huru na o zoghi ezo, o were ima-aru-jijiji bia, we da n'iru Ya, kọ n'iru ndi-Ju ahu nile ihe mere o ji metu Ya aka, na otú esi me ka aru di ya ike ngwa ngwa.[48] Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.

JỌN 4:46-54
[46] Ya mere Ọ biaruru Kena nke Galili ozọ, ebe O mere miri ka ọ ghọ manya-vine, Ma otù nwoke nke nējere eze ozi di, nke aru nādighi nwa-ya nwoke ike na Kapanaum.[47] Mb͕e onye ahu nuru na Jisus esiwo na Judia puta ba na Galili, o jekuru Ya, riọ Ya ka Ọ ridata, me ka aru di nwa-ya ike; n'ihi na ọ nọ n'ọnu ọnwu.[48] Ya mere Jisus siri ya, Ọ buru na unu ahughi ihe-iriba-ama na ọlu-ebube, unu agaghi-ekwe ma-ọli.[49] Nwoke ahu nke nējere eze ozi si Ya, Onye-nwe-ayi, ridata mb͕e nwatakirim akānwughi.[50] Jisus si ya, Ga nke gi; nwa-gi nwoke di ndu. Nwoke ahu kwere okwu Jisus gwara ya, o we ga nke ya.[51] Ma mb͕e ọ nọ nārida ub͕u a, ndi-orù-ya zutere ya, si, na nwa-ya di ndu.[52] Ya mere ọ juru ha oge hour nke aru-ya malitere idi ya nma. Ya mere ha siri ya, Nnyahuru n'oge hour nke-asa ka aru-ọku rapuru ya.[53] Ya mere nna-ya mara na ọ bu n'oge hour ahu mb͕e Jisus siri ya, Nwa-gi nwoke di ndu: ya onwe-ya we kwere na èzí-na-ulo-ya dum.[54] Nka bu ihe-iriba-ama ọzọ nke mere ha abua nke Jisus mere, mb͕e O siri na Judia puta ba na Galili.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006