A A A A A

Chọọchị: [Na-eto Chineke]


HIBRU 13:15
Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya.

DANIEL 2:20
Daniel zara, si, Ka aha nke Chineke buru ihe agọziri agọzi site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na amam-ihe na idi-ike, nke Ya ka ha bu:

ABÙ ỌMA 22:3
Ma Gi onwe-gi di nsọ, Gi Onye nānọkwasi n'otuto nile nke Israel dika oche-eze.

ABÙ ỌMA 34:1
M'gāgọzi Jehova na mb͕e nile: Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n'ọnum.

2 SAMUEL 22:50
N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba ọzọ, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.

ABÙ ỌMA 100:4
Werenu ekele ba n'ọnu-uzọ-ama-Ya nile, Werenu otuto ba n'ogige-Ya nile: Kelenu Ya, gọzi-kwa-nu aha-Ya.

EFESỌS 1:6
ka ewe to ebube nke amara-Ya, bú nke O were amara me ka ayi nara n'aka-Ya nime Onye ahu Ọ huru n'anya:

EFESỌS 5:19
nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi;

ABÙ ỌMA 150:6
Ka ihe ọ bula nke nēku ume to Ja. Tonu Ja.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006