JỌN 14:2-3 |
[2] N'ulo Nnam ọtutu ebe-obibi di; ọ buru na ọ bughi otú a, M'gāgwawori unu; n'ihi na anamaga idoziri unu ebe.[3] Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M'gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ. |
|
FILIPAI 3:20-21 |
[20] N'ihi na ala-ayi di n'elu-igwe ub͕u a; site n'ebe ayi nēchesi kwa Onye-nzọputa ike, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist:[21] Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n'okpuru Onwe-ya. |
|
ỌLU OZI 1:11 |
ndi si-kwa-ara, Ndikom nke Galili, gini mere unu nēguzo nēle anya n'elu-igwe? Jisus nka, Onye anapuru n'ebe unu nọ rigo n'elu-igwe, gābia n'otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n'elu-igwe. |
|
HIBRU 11:16 |
Ma otú ọ di ub͕u a ha nāb͕aso ala ka nma, nke ahu bu, ala di n'elu-igwe: n'ihi nka ihere ha adighi-eme Chineke, ka akpọ Ya Chineke-ha: n'ihi na O doziworo ha otù obodo. |
|
JỌN 14:1-3 |
[1] Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu.[2] N'ulo Nnam ọtutu ebe-obibi di; ọ buru na ọ bughi otú a, M'gāgwawori unu; n'ihi na anamaga idoziri unu ebe.[3] Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M'gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ. |
|
MATIU 18:15-18 |
[15] Ọzọ, ọ buru na nwa-nna-gi emehie megide gi, je, tua ya nmehie-ya n'anya n'etiti nání gi na ya abua: ọ buru na ọ nuru olu-gi, i ritara nwa-nna-gi n'urù.[16] Ma ọ buru na ọ nughi, kuru otù madu ma-ọbu madu abua ọzọ tiyere onwe-gi, ka ewe me okwu ọ bula ekwuru ka o guzo n'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ.[17] Ma ọ buru na ọ ṅaghi ha nti, gwa nzukọm: ma ọ buru na ọ ṅaghi kwa nzukọm nti, ka ọ diri gi ka onye mba ozọ na onye-ọna-utu.[18] N'ezie asim unu, Ka ha ra, bú ihe unu gēke ab͕u n'elu uwa, agēke ha n'elu-igwe: ka ha ra kwa, bú ihe unu gātọpu n'elu uwa, agātọpu ha n'elu-igwe. |
|
JỌN 14:28 |
Unu nuru na Mu onwem siri unu, Anamala, biakute kwa unu. Ọ buru na unu hurum n'anya, unu gāṅuwori ọṅu, n'ihi na anamagakuru Nnam: n'ihi na Nnam ka Mu onwem uku. |
|
ỌLU OZI 4:12 |
Nzọputa adighi kwa n'onye ọ bula ọzọ: n'ihi na aha ọzọ di iche adighi kwa n'okpuru elu-igwe, nke enyeworo n'etiti madu, nke anāghaghi izọputa ayi nime ya. |
|
JỌN 3:13 |
Ọ dighi kwa onye ọ bula rigoworo n'elu-igwe, ma-ọbughi Onye siri n'elu-igwe ridata, bú Nwa nke madu. |
|
NKPUGHE 21:1-4 |
[1] M'we hu elu-igwe ọhu na uwa ọhu: n'ihi na elu-igwe mbu ahu na uwa mbu ahu gabigarari; oké osimiri adighi kwa ọzọ.[2] M'we hu obodo nsọ ahu, bú Jesusalem ọhu, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, site n'ebe Chineke nọ, edoziwo ya dika nwanyi anālu ọhu nke achọworo ya nma nye di-ya.[3] M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'oche-eze ahu dà, si, Le, ūlọ-ikwū nke Chineke diyere madu, Ọ gēbiye-kwa-ra ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nke Ya, Chineke Onwe-ya gānọye-kwa-ra ha, buru kwa Chineke-ha:[4] Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo. |
|
1 TIMỌTI 3:15 |
ma ọ buru na m'nānọ ọdù, ka i we mata otú anāghaghi ibi obi n'èzí-na-ulo Chineke, ebe ọ bu nzukọ nke Chineke di ndu, bú ide na ntọ-ala nke ezi-okwu. |
|
JỌN 14:6 |
Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu. |
|
MAK 6:3 |
Nwoke a, Ọ̀ bughi onye-ọ̀kà ahu, nwa Meri, na nwa-nne Jemes, na Joses, na Judas, na Saimon? umu-nne-Ya ndinyom, hà anọghi kwa n'ebe a n'etiti ayi? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya. |
|
FILIPAI 3:21 |
Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n'okpuru Onwe-ya. |
|
JỌN 1:12 |
Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n'aha-Ya: |
|
1 KỌRINT 13:12 |
N'ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m'mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m'gāmazu dika amazu-kwa-ram. |
|
JỌN 3:3-5 |
[3] Jisus zara, si ya, N'ezie, n'ezie, asi mi, Ọ buru na amughi madu ọzọ, ọ pughi ihu ala-eze Chineke anya.[4] Nikọdimọs we si ya, Èsi aṅa pu imu madu mb͕e ọ kara nká? ọ̀ puru ibà n'afọ nne-ya nke ub͕ò abua, ewe mua ya?[5] Jisus zara, N'ezie, n'ezie, asim i, Ọ buru na amughi madu site na miri na Mọ Nsọ, ọ pughi ibà n'ala-eze Chineke. |
|
HIBRU 12:14 |
Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya: |
|
NKPUGHE 21:1-2 |
[1] M'we hu elu-igwe ọhu na uwa ọhu: n'ihi na elu-igwe mbu ahu na uwa mbu ahu gabigarari; oké osimiri adighi kwa ọzọ.[2] M'we hu obodo nsọ ahu, bú Jesusalem ọhu, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, site n'ebe Chineke nọ, edoziwo ya dika nwanyi anālu ọhu nke achọworo ya nma nye di-ya. |
|
1 KỌRINT 15:40-49 |
[40] Aru nke elu-igwe na aru nke uwa di kwa: ma ebube nke aru nke elu-igwe bu otù, ebube nke aru nke uwa di kwa iche.[41] Otù ebube nke anyanwu di, ebube ọzọ nke ọnwa di kwa, ebube ọzọ nke kpakpando di kwa; n'ihi na otù kpakpando di iche n'aru kpakpando ọzọ n'ebube.[42] Otú a ka nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu di kwa. Anāgha ya n'ire-uré; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ereghi-uré:[43] anāgha ya n'ihe-ihere; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ebube: anāgha ya n'adighi-ike; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ike:[44] anāgha ya aru nke nkpuru-obi nāchi; anēme ka o si n'ọnwu bilie aru nke Mọ di nime ya nāchi. Ọ buru na aru nke nkpuru-obi nāchi di, aru nke Mọ nāchi di kwa.[45] Otú a ka edewo-kwa-ra ya n'akwukwọ, si, Madu mbu, bú Adam, ghọrọ nkpuru-obi di ndu. Adam ikpe-azu ghọrọ mọ nke nēnye ndu.[46] Otú ọ di, nke Mọ nāchi ebughi uzọ, kama ọ bu nke nkpuru-obi nāchi; emesia nke Mọ nāchi soro.[47] Madu mbu sitere n'ala, eji-kwa-ra ájá kpu ya: Madu nke-abua sitere n'elu-igwe.[48] Aha madu onye ahu ejiri ájá kpu di, madu di otú a ka ndi eji ájá kpu di kwa: ọzọ, aha madu Onye elu-igwe ahu di, madu di otú a ka ndi elu-igwe di kwa.[49] Dika ayi yiri kwa onyinyo nke onye ahu eji ájá kpu, ayi gēyiri kwa onyinyo nke Onye elu-igwe ahu. |
|
LUK 24:39 |
Lenu akam na ukwum, na ọ bu Mu onwem: datunum aka, le-kwa-nu; n'ihi na mọ enweghi anu-aru na ọkpukpu, otú unu huru na Mu onwem nwere. |
|
AISAIA 65:17-25 |
[17] N'ihi na, le, M'gaje ikè elu-igwe ọhu na uwa ọhu: agaghi-echeta kwa ihe mbu nile, ha agaghi-abata kwa n'obi.[18] Ma otú ọ di, ka obi tọ unu utọ, teghari-kwa-nu egwú ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi n'ihi ihe nke Mu onwem nēkè: n'ihi na, le, M'nēkè Jerusalem ibu ihe nteghari-egwú-ọṅù, ndi-ya kwa, ibu ihe obi-utọ.[19] M'gēteghari kwa egwú ọṅù n'aru Jerusalem, obi gātọkwam utọ n'aru ndim: agaghi-anu kwa olu ikwa-ákwá nime ya ọzọ, ma-ọbu olu iti-nkpu.[20] Ọ dighi nwa ọhu nwuchuru anwuchu gēsite kwa n'ebe ahu ọzọ, ma-ọbu agadi nke nānọzughi ubọchi ndu-ya: n'ihi na nwata gānwu mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise, agākọcha kwa onye-nmehie mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise.[21] Ha gēwu kwa ulo, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, rie nkpuru-ha.[22] Ha agaghi-ewu ulo, onye ọzọ ebichie; ha agaghi-aku, onye ọzọ erie: n'ihi na dika ubọchi nile nke osisi si di, otú a ka ubọchi nile nke ndim gādi, ndi M'rọputaworo gēnwe kwa ihe aka-ha lutara mb͕e di anya nke-uku.[23] Ha agaghi-adọb͕u onwe-ha n'ọlu n'efu, ha agaghi-amu umu nye obi-ọlulọ-miri: n'ihi na nkpuru nke ndi Jehova gọziworo ka ha bu, ha na umu gēsi n'aru-ha puta.[24] O gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mb͕e ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu.[25] Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gātakọ nri n'otù, ọdum gāta kwa ahihia dika ehi: ma agwọ, ájá gābu nri-ya. Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile, ka Jehova siri. |
|
HIBRU 9:27 |
Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya; |
|
FILIPAI 1:21-23 |
[21] N'ihi na n'ebe m'nọ idi ndu bu Kraist, inwu anwu bu kwa urù.[22] Ma ọ buru na idi ndu n'anu-aru bu òkèm, nka bu nkpuru nke ọlum: ihe m'gārọputa kwa amaghi m.[23] Ma anọm n'ebe di nkpà n'etiti ihe abua ndia, ebe agu ila na inọ n'ebe Kraist nọ nāgum; n'ihi na ọ kachasi nma nke-uku: |
|
EFESỌS 1:22-23 |
[22] O do-kwa-ra ihe nile n'okpuru ukwu-Ya abua, ọ bu kwa Ya onwe-ya ka O mere ka Ọ buru isi n'elu ihe nile n'ebe nzukọ-Ya nọ,[23] nke bu aru-Ya, ozuzù nke Onye ahu Nke nāluzu ihe nile nime madu nile. |
|
1 KỌRINT 1:10 |
Ma, umu-nnam, esiterem n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist riọ unu, ka unu nile nēkwu otù ihe, ka nkewa ghara kwa idi n'etiti unu; kama ka eme unu ka unu zue okè n'otù uche ahu na n'otù ìzù ahu. |
|
JỌN 8:12 |
Ya mere Jisus gwara ha okwu ọzọ, si, Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agaghi-ejeghari n'ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu. |
|
1 PITA 3:15 |
kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu: |
|
LUK 5:10 |
otú ahu ka ibobo nwu-kwa-ra Jemes na Jọn, umu Zebedi, n'aru, ndi ha na Saimon bu ndi-nnweko. Jisus we si Saimon, Atula egwu; site n'ub͕u a i ganānwuta madu na ndu. |
|
JEMES 5:16 |
Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya. |
|
2 TIMỌTI 2:2 |
Ihe nile i nukwara n'ọnum site n'etiti ọtutu ndi-àmà, nye ihe ndia n'aka madu ndi kwesiri ntukwasi-obi idebe, bú madu ndi ọ gēkwe kwa izí madu-ibe-ha ihe ndia. |
|
NKPUGHE 12:1 |
Ewe hu oké ihe-iriba-ama n'elu-igwe; nwanyi nke egbokwasiworo ya anyanwu dika uwe, ọnwa di kwa n'okpuru ukwu-ya abua, ọ nēkpu kwa okpu-eze nke kpakpando iri na abua n'isi-ya; |
|
JỌN 6:51 |
Mu onwem bu nri di ndu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ buru na madu erie ufọdu nime nri a, ọ gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: ma nri nke Mu onwem gēnye kwa bu anu-arum, n'ihi ndu nke uwa. |
|
2 KỌRINT 5:8 |
ayi nēnwe obi-ike, ka m'kwuru, ọ di kwa ayi ezi nma kari ka ayi ghara inọ n'ulo n'aru-ayi, ka ayi nọ kwa n'ulo n'ebe Onye-nwe-ayi nọ. |
|
LUK 10:16 |
Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem. |
|
JỌN 16:13 |
Ma mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēdubà unu n'ezi-okwu nile: n'ihi na Ọ gaghi-ekwu n'Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia. |
|
1 JỌN 4:6 |
Ayi onwe-ayi bu ndi siri na Chineke puta: onye mara Chineke nānu olu-ayi; onye nēsighi na Chineke puta adighi-anu olu-ayi. Ayi sitere na nka mara mọ ezi-okwu ahu, na mọ nduhie ahu. |
|
JỌN 21:15-19 |
[15] Ya mere mb͕e ha risiri nri-ututu-ha, Jisus si Saimon Pita, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya kari ndia? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nēnye umu-aturum nri.[16] Ọ si ya ọzọ nke ub͕ò abua, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nāzù aturum.[17] Ọ si ya nke ub͕ò atọ, Saimon, nwa Jọn, àbum eyì-gi? O wutara Pita na Ọ siri ya nke ub͕ò atọ, Àbum eyì-gi? O we si Ya, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara ihe nile; Gi onwe-gi mara na I bu eyìm. Jisus si ya, Nēnye aturum nri.[18] N'ezie, n'ezie, asim i, Mb͕e i di n'okorọbia, i nēke onwe-gi ihe-ọkiké n'úkwù, nējeghari kwa ebe i nāchọ: ma mb͕e i gēme agadi, i gēseti aka-gi abua, onye ọzọ gēke gi ihe-ọkiké n'úkwù, būru kwa gi ga ebe i nāchọghi.[19] Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu ọ gēji nye Chineke otuto. Mb͕e O kwusiri nka, Ọ si ya, Som. |
|
MATIU 6:14 |
N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu. |
|
MATIU 24:37-41 |
[37] Ọ bu kwa dika ubọchi Noa diri, otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.[38] N'ihi na dika ha nọ na mb͕e ahu nke bū oké iju-miri ahu uzọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nālu nwunye, nēnye kwa n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya,[39] ha amaghi kwa rue mb͕e oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.[40] Mb͕e ahu madu abua gānọ n'ubì; ewere otù, rapu kwa otù:[41] ndinyom abua ganēgwe nri na nkume-igwe-nri; ewere otù, rapu kwa otù. |
|
1 TIMỌTI 2:4 |
Onye nāchọ ka azọputa madu nile, ka ha biaru kwa nmazu nke ezi-okwu. |
|
1 TESALỌNAIKA 4:17 |
mb͕e ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n'igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mb͕e nile. |
|
1 JỌN 5:13 |
Ihe ndia ka m'degara unu n'akwukwọ, bú ndi kwere n'aha Ọkpara Chineke, ka unu we mata na unu nwere ndu ebighi-ebi. |
|
ROM 8:28 |
Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di. |
|
JỌN 5:24 |
N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n'ikpé, kama o sitewo n'ọnwu ba na ndu. |
|
1 KỌRINT 10:13 |
Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya. |
|
MATIU 25:46 |
Ndia gāpu je ba n'ahuhu-nmehie ebighi-ebi: ma ndi ezi omume gābà na ndu ebighi-ebi. |
|
LUK 23:43 |
Ọ we si ya, N'ezie asim i, Ta ka Mu na gi gānọ na Paradais. |
|
AISAIA 35:5-6 |
[5] Mb͕e ahu ka agēmeghe anya ndi-ìsì, ọ bu kwa nti nke ndi nti chiri ka agēmeghe.[6] Mb͕e ahu ka onye-ngwurọ gāmali dika ele, ire onye-ob͕i gēti kwa nkpu ọṅù: n'ihi na n'ọzara ka miri nāb͕awaputa, miri-iyi kwa n'ala ihe nādighi. |
|
MALAKAI 1:11 |
N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |