A A A A A

Chọọchị: [Ọrụ Ndị Nwanyị]


GALETIA 3:28
Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n'ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus.

1 TIMỌTI 2:9-15
[9] Otú ahu, ezuberem ka ndinyom were ihe-ichọ-nma kwesiri ekwesi chọ onwe-ha nma, ya na nsọpuru na uche zuru okè; ọ bughi isi akpara akpa, na ọla-edo ma-ọbu pearl ma-ọbu uwe di oké ọnu-ahia;[10] kama (nke kwesiri ndinyom nēkwuputa egwu Chineke) ka ha site n'ezi ọlu chọ onwe-ha nma.[11] Ka nwanyi were nwayọ muta n'ido onwe-ya n'okpuru n'uzọ nile.[12] Ma ekweghm nwanyi ka o zí ihe, ma-ọbu ka ọ buru onye-isi n'ebe nwoke nọ, kama ka ọ nọ n'ọnọdu nwayọ.[13] N'ihi na Adam ka eburu uzọ kpu, mb͕e ahu ewe kpu Iv;[14] ọ bughi kwa Adam ka aghọrọ aghughọ, ma ebe aghọb͕uru nwanyi ọ bu nwanyi ahu ka ahuworo na ọ nọ nime njehie:[15] ma agēsite n'ọmumu-nwa-ya zọputa ya, ma ọ buru na ha anọgide nime okwukwe na ihu-n'anya na odido-nsọ, ya na uche zuru okè.

1 TIMỌTI 2:12
Ma ekweghm nwanyi ka o zí ihe, ma-ọbu ka ọ buru onye-isi n'ebe nwoke nọ, kama ka ọ nọ n'ọnọdu nwayọ.

JENESIS 3:16
Nwayi ahu ka Ọ siri, M'gēme ka ihe-nb͕u-gi na itu-ime-gi ba uba nke-uku; n'ihe-nb͕u ka i gāmu umu; n'ebe di-gi nọ ka ọchichọ-gi gādi, ya onwe-ya gāchi kwa gi.

1 KỌRINT 11:3
Ma anamachọ ka unu mata na Kraist bu isi nke nwoke ọ bula; nwoke bu kwa isi nke nwanyi; Chineke bu kwa isi nke Kraist.

LUK 8:1-3
[1] O we rue mb͕e nwa oge gasiri, na Ya onwe-ya nāgaghari n'obodo na obodo ntà di iche iche, nēkwusa nēzikwa ozi ọma ala-eze Chineke, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu,[2] na ndinyom ufọdu ndi emereri ka aru-ha di ike site n'ichupu ndi-mọ ọjọ na igwọ nriaria, Meri nke akpọrọ Magdalini, onye mọ ọjọ asa siwori nime ya puta,[3] na Joana nwunye Kuza onye Herod tiyere ihe-ya n'aka, na Susana, na ọtutu ndi ọzọ, ndi nēweputa ihe ha nwere ime ezi ha.

JENESIS 2:18
Jehova, bú Chineke, we si, Ọ dighi nma ka madu ahu nọ nání ya; M'gēmere ya onye-iye-aka kwesiri ya.

EFESỌS 5:22-33
[22] Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu, dika n'okpuru Onye-nwe-ayi.[23] N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru.[24] Ma dika anēdo nzukọ ahu n'okpuru Kraist-ayi, otú a ka ndi bu nwunye do kwa onwe-ha n'okpuru di-ha n'ihe nile ọ bula.[25] Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ya;[26] ka O we do ya nsọ, mb͕e O mesiri ka ọ di ọcha site n'ọsisa miri n'okwu Chineke,[27] ka Ya onwe-ya we che nzukọ ahu n'iru Onwe-ya dika ihe di ebube, nēnweghi ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n'ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kwa ihe anāpughi ita uta.[28] Otú a ndi bu di ji kwa ugwọ ihu nwunye nke aka ha n'anya dika ha huru aru nke onwe-ha n'anya. Onye nāhu nwunye nke aka ya n'anya nāhu onwe-ya n'anya:[29] n'ihi na ọ dighi onye ọ bula kpọrọ aru onwe-ya asì mb͕e ọ bula; kama ọ nāzù ya nēlezi kwa ya anya nke-ọma, dika Kraist nēme kwa nzukọ-Ya;[30] n'ihi na ayi bu ihe di n'aru-Ya.[31] N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru.[32] Ihe-omimi a di uku: ma mu onwem nēkwu okwu bayere Kraist baye-kwa-ra nzukọ-Ya.[33] Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.

1 TIMỌTI 2:11-15
[11] Ka nwanyi were nwayọ muta n'ido onwe-ya n'okpuru n'uzọ nile.[12] Ma ekweghm nwanyi ka o zí ihe, ma-ọbu ka ọ buru onye-isi n'ebe nwoke nọ, kama ka ọ nọ n'ọnọdu nwayọ.[13] N'ihi na Adam ka eburu uzọ kpu, mb͕e ahu ewe kpu Iv;[14] ọ bughi kwa Adam ka aghọrọ aghughọ, ma ebe aghọb͕uru nwanyi ọ bu nwanyi ahu ka ahuworo na ọ nọ nime njehie:[15] ma agēsite n'ọmumu-nwa-ya zọputa ya, ma ọ buru na ha anọgide nime okwukwe na ihu-n'anya na odido-nsọ, ya na uche zuru okè.

LUK 10:38-42
[38] Ma mb͕e ha nāga, Ya onwe-ya batara n'otù obodo ntà: otù nwanyi, aha-ya bu Mata, we kpọbata Ya n'ulo-ya.[39] O nwekwara nwa-nne-nwanyi anākpọ Meri, onye nānọdu kwa ala n'ukwu ala Onye-nwe-ayi, we nu okwu-Ya.[40] Ma uche Mata nābasasi n'ije-ozi nke-uku; o we biakute Ya ọsọsọ, si, Onye-nwe-ayi, ò metughi Gi n'obi na nwa-nnem nwanyi nārapum ka nání mu nēje ozi? ya mere, gwa ya ka o yerem aka.[41] Ma Onye-nwe-ayi zara, si ya, Mata, Mata, i nēcheb͕u onwe-gi nēsob͕u kwa onwe-gi n'ihi ọtutu ihe:[42] ma otu ihe bu ihe di nkpà: n'ihi na Meri rọputara ezi òkè ahu, nke anāgaghi-anapu ya.

TAITỌS 2:3-5
[3] otú ahu ka agadi-ndinyom di nsọ n'omume-ha, ghara ibu ndi nēbo ebubo ugha, ghara kwa ibu orù nke iṅubiga manya ókè, ka ha buru ndi nēzí ihe ọma;[4] ka ha we me ka ndi bu umu-ab͕ọghọ nwe uche zuru okè ibu ndi nāhu di-ha n'anya, ndi nāhu umu-ha n'anya,[5] ndi uche-ha zuru okè, ndi di ọcha, ndi nālu ọlu n'ulo, ezi madu, ndi nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha, ka ewe ghara ikwulu okwu Chineke:

1 KỌRINT 11:2-16
[2] Ma anamaja unu na unu nēchetam n'ihe nile, jisi kwa ozizí ahu enyere n'aka-unu idebe ike, dika m'nyere ha n'aka-unu idebe.[3] Ma anamachọ ka unu mata na Kraist bu isi nke nwoke ọ bula; nwoke bu kwa isi nke nwanyi; Chineke bu kwa isi nke Kraist.[4] Nwoke ọ bula, mb͕e ọ nēkpe ekpere ma-ọbu mb͕e ọ nēbu amuma, ọ buru na o kpu ihe-nkpudo n'isi-ya, ọ nēme ka ihere me isi-ya.[5] Ma nwanyi ọ bula, mb͕e ọ dighi-ekpudo ihe n'isi-ya n'ikpe ekpere ma-ọbu n'ibu amuma, ọ nēme ka ihere me isi-ya: n'ihi na ya na nwanyi nke akọpuworo isi-ya bu otù ihe ahu.[6] N'ihi na asi na nwanyi ekpudoghi onwe-ya ihe n'isi, ka akpacha kwa agiri-isi-ya: ma asi na ọ buru nwanyi ihe-ihere ka akpacha agiri-isi-ya ma-ọbu ka akọpu isi-ya, ka ekpudo ya ihe n'isi.[7] N'ihi na nwoke ekwesighi n'ezie ka ekpudo ya ihe n'isi, ebe ọ bu onyinyo na otuto nke Chineke: ma nwanyi bu otuto nke nwoke.[8] N'ihi na nwoke esighi na nwanyi puta; kama nwanyi siri na nwoke puta:[9] n'ihi na ekèghi kwa nwoke n'ihi nwanyi; kama ekère nwanyi n'ihi nwoke:[10] n'ihi nka ka nwanyi kwesiri ikpu ihe-iriba-ama nke ike n'isi-ya, n'ihi ndi-mọ-ozi.[11] Otú ọ di, nwanyi adighi ma nwoke anọghi ya, nwoke adighi kwa ma nwanyi anọghi ya, nime Onye-nwe-ayi.[12] N'ihi na dika nwanyi siri na nwoke puta, otú a ka nwoke site-kwa-ra n'aka nwanyi; ma ihe nile si na Chineke puta.[13] Tulenu nime onwe-unu: ọ̀ kwesiri ka nwanyi kpere Chineke ma ekpudoghi ya ihe n'isi?[14] Ọbuná uzọ ekère madu, yà onwe-ya adighi-ezí unu, na, asi na nwoke nwere ogologo agiri-isi, na ọ buru ya ihe-ihere?[15] Ma ọ buru na nwanyi nwere ogologo agiri-isi, ọ buru ya ihe otuto: n'ihi na enyewo ya agiri-isi-ya n'ọnọdu ihe ib͕okwasi n'aru.[16] Ma ọ buru na unu nēchè na onye ọ bula bu onye nēse okwu, ayi onwe-ayi, ma-ọbu nzukọ Chineke, enweghi ọme-n'ala di otú a.

ỌLU OZI 18:26
onye ahu we malite ikwuwa okwu n'ulo-nzukọ. Ma mb͕e Prisila na Akwila nuru okwu-ya, ha kutara ya n'ebe ha nọ, we kọrọ ya uzọ Chineke nke-ọma kari.

1 KỌRINT 14:33-35
[33] n'ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ.[34] Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n'ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n'okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa.[35] Ọ buru kwa na ha nāchọ imuta ihe ọ bula, ka ha jua di nke aka ha n'ulo: n'ihi na ọ bu ihe-ihere ka nwanyi kwue okwu nime nzukọ Kraist.

1 TIMỌTI 2:11
Ka nwanyi were nwayọ muta n'ido onwe-ya n'okpuru n'uzọ nile.

EFESỌS 5:22-24
[22] Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu, dika n'okpuru Onye-nwe-ayi.[23] N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru.[24] Ma dika anēdo nzukọ ahu n'okpuru Kraist-ayi, otú a ka ndi bu nwunye do kwa onwe-ha n'okpuru di-ha n'ihe nile ọ bula.

ROM 16:1
Ma anameme ka unu mara Fibi nwa-nna-ayi nwanyi, onye nējere nzukọ Kraist nke di na Kenkrii ozi:

TAITỌS 2:4-5
[4] ka ha we me ka ndi bu umu-ab͕ọghọ nwe uche zuru okè ibu ndi nāhu di-ha n'anya, ndi nāhu umu-ha n'anya,[5] ndi uche-ha zuru okè, ndi di ọcha, ndi nālu ọlu n'ulo, ezi madu, ndi nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha, ka ewe ghara ikwulu okwu Chineke:

EFESỌS 5:22
Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu, dika n'okpuru Onye-nwe-ayi.

1 TIMỌTI 5:14
Ya mere anamezube ka umu-ab͕ọghọ ndi di-ha nwuru luru di, mu kwa umu, nāchi kwa èzí-na-ulo-ha, ghara kwa inye onye nēmegide ayi ihe o gēji kwutọ:

MATIU 27:55-56
[55] Ọtutu ndinyom nọ kwa n'ebe ahu ndi nọ n'ebe di anya nēkiri, ndi si na Galili soro Jisus, nējere Ya ozi:[56] n'etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes na Joses, na nne umu Zebedi, nọ.

1 KỌRINT 14:34-35
[34] Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n'ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n'okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa.[35] Ọ buru kwa na ha nāchọ imuta ihe ọ bula, ka ha jua di nke aka ha n'ulo: n'ihi na ọ bu ihe-ihere ka nwanyi kwue okwu nime nzukọ Kraist.

IKPE 4:4
Ma Debora, bú nwayi nke bu onye-amuma, bú nwunye Lapidot, ya onwe-ya nēkpe Israel ikpe na mb͕e ahu.

ROM 16:7
Kelenu Andrọnaikọs na Junias, ndi-ikwum, ndi adọkọ-kwa-ra mu na ha n'agha, madu ndi amara aha-ha n'etiti ndi-ozi, ndi bu-kwa-ram uzọ bia nọ nime Kraist.

EFESỌS 5:21
nēdorita onwe-unu n'okpuru ibe-unu nime egwu Kraist.

TAITỌS 2:1
Ma gi onwe-gi, nēkwu ihe nile kwesiri ozizí ahu nke nēnye ezi ndu:

1 KỌRINT 11:7
N'ihi na nwoke ekwesighi n'ezie ka ekpudo ya ihe n'isi, ebe ọ bu onyinyo na otuto nke Chineke: ma nwanyi bu otuto nke nwoke.

ILU 31:10-31
[10] Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya? N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku.[11] Obi di-ya atukwasiwo ya obi, Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu.[12] Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ, Ubọchi nile nke ndu-ya.[13] Ọ chọwo aji-anu na flax, We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.[14] Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia; Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya.[15] O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa, We nye ulo-ya nri, Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha.[16] O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya: Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine.[17] O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké, Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.[18] Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma: Oriọna-ya adighi-anyu n'abali.[19] Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho, Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike.[20] Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala; E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru.[21] Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe; N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.[22] Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya; Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu.[23] Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu, Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala.[24] Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya; Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.[25] Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya; Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì.[26] Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe; Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya.[27] Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma, Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri.[28] Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma; Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si:[29] Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma, Ma gi onwe-gi kachasi ha nile.[30] Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu: Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto[31] Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara; Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile.

1 TIMỌTI 2:13-14
[13] N'ihi na Adam ka eburu uzọ kpu, mb͕e ahu ewe kpu Iv;[14] ọ bughi kwa Adam ka aghọrọ aghughọ, ma ebe aghọb͕uru nwanyi ọ bu nwanyi ahu ka ahuworo na ọ nọ nime njehie:

1 TIMỌTI 3:2
Ya mere onye nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anādighi-akalu, di nke otù nwunye, onye-anya-udo, onye uche-ya zuru okè, onye omume-ya kwesiri ekwesi, onye nēle ndi-ọbìa anya nke-ọma, onye nwere ike izí ihe;

1 TIMỌTI ௩:௧௧
Otú ahu ndinyom aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nādighi-ebo madu ebubo ugha, ndi nwere anya-udo, ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ihe nile.

JENESIS 1:27
Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha.

EFESỌS 5:23
N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru.

TAITỌS 2:3
otú ahu ka agadi-ndinyom di nsọ n'omume-ha, ghara ibu ndi nēbo ebubo ugha, ghara kwa ibu orù nke iṅubiga manya ókè, ka ha buru ndi nēzí ihe ọma;

1 PITA 3:7
Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.

KỌLỌSI 3:18-19
[18] Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di-unu, dika ọ nēkwesi unu nime Onye-nwe-ayi.[19] Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, unu enwe-kwa-la obi ilu n'ebe ha nọ.

JENESIS 1:26-28
[26] Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa.[27] Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha.[28] Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n'okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n'elu uwa.

1 PITA 3:1-7
[1] Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n'ibi-obi nwunye-ha rita ha n'urù n'ebe anēkwughi okwu;[2] mb͕e ha nēle ibi-obi-unu di ọcha, ya na egwu.[3] Ndi ichọ-nma-ha ka ọ ghara ibu ichọ-nma ahu nke aru nke bu ikpa isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, ma-ọbu iyikwasi ọtutu uwe;[4] kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n'uwe anāpughi imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n'anya Chineke.[5] N'ihi na otú a ka ndinyom ahu ndi di nsọ, ndi nēle anya Chineke, nāchọ kwa onwe-ha nma n'oge gara aga, nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha:[6] dika Sera ṅara Abraham nti, nākpọ ya onye-nwe-ya: onye emere unu ka unu buru umu-ya, ma ọ buru na unu eme ezi ihe, ghara kwa itu egwu site n'ujọ ọ bula.[7] Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.

ILU 12:4
Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya: Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.

1 KỌRINT 14:34
Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n'ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n'okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa.

KỌLỌSI 4:15
Kelenu umu-nna-ayi ndi nọ na Leọdisia, na Nimfas, na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha.

FILIPAI 4:2-3
[2] Ariọm Yuodia, ariọkwam Sintiki, ka ha tukwasi uche n'otù ihe ahu nime Onye-nwe-ayi.[3] E, ariọkwam gi, onye ekekọtaworo mu na gi n'ezie n'ọlu Chineke, yere ndinyom ahu aka, n'ihi na mu na ha b͕akọsiri nb͕a ike n'ozi oma, gi na Klement, na ndi fọduru mu na ha nālukọ ọlu, ndi aha-ha di n'akwukwọ nke ndu.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006