A A A A A

Chọọchị: [Ofufe]


2 IHE EMERE 16:23-31
[23] Ha we zí ihe na Juda, nēji akwukwọ iwu Jehova n'aka-ha; ha we nēje obodo nile nke Juda buruburu, we nēzí ihe n'etiti ndi Juda.[24] Oké egwu Jehova we dikwasi ala-eze nile nke ala nile nke di Juda buruburu, ha ebusoghi kwa Jehoshafat agha.[25] Ufọdu nime ndi Filistia weta-kwa-ra Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma, na ọla-ọcha òfùfè; ndi Arebia nēweta-kwa-ra ya ìgwè ewu na aturu, nnù ebulu iri-na-iteghete na ọgu ise, na nnù nkpi iri-na-iteghete na ọgu ise.[26] Jehoshafat we nāga n'iru we di ike ri nne; o we wue nime Juda ulo uku na obodo nchikọbata-ihe.[27] O nwe-kwa-ra ije-ozi bara uba n'obodo Juda nile, na ndikom agha nime Jerusalem, ha bu ndi-dike bu dìnkpà.[28] Ma ndia bu ngukọta-ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di: nke Juda, ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri; Adna, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnu iri, ndi-dike bu dìnkpà:[29] onye so ya bu Jehohanan, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise:[30] onye so ya bu Amasaia nwa Zikri, onye were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ya; ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi-dike bu dìnkpà:[31] ndi sitere na Benjamin; otù dike bu dìnkpà, bú Elaiada, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi nāchi uta na ọta:

DANIEL 2:20
Daniel zara, si, Ka aha nke Chineke buru ihe agọziri agọzi site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na amam-ihe na idi-ike, nke Ya ka ha bu:

DEUTERONOMI 10:21
Ya Onwe-ya bu otuto-gi, Ya Onwe-ya bu kwa Chineke-gi, Onye meworo gi ihe uku ndia di egwu, nke anya-gi huworo.

JEREMAIA 20:13
Bùkuenu Jehova abù, tonu Jehova: n'ihi na Ọ naputawo nkpuru-obi nke ob͕eye n'aka ndi nēme ihe ọjọ.

ABÙ ỌMA 75:1
Ayi ekelewo Gi, Chineke; Ayi ekelewo ekele, aha-Gi di kwa nso: Ha akọwọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.

ỌPUPU 20:2-6
[2] Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta.[3] Gi enwela Chi ọzọ tiyerem.[4] Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-ọbu oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa:[5] gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;[6] ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu.

JỌN 4:21-24
[21] Jisus si ya, Nwanyi, kwerem, oge hour nābia, mb͕e unu nāgaghi-akpọ isi ala nye Nnam, ma ọ bu n'ugwu a, ma-ọbu na Jerusalem.[22] Unu onwe-unu nākpọ isi ala nye ihe unu nāmatagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi ala nye ihe ayi matara: n'ihi na nzọputa si n'etiti ndi-Ju puta.[23] Ma oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nākpọ isi ala n'ezie gākpọ isi ala nye Nnam nime mọ na ezi-okwu: n'ihi na ndi di otú ahu ka Nnam nāchọ kwa ka ha buru ndi nākpọ isi ala nye Ya.[24] Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghaghi ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu.

ABÙ ỌMA 99:1-9
[1] Jehova bu eze; ka ndi nile di iche iche ma jijiji: Ọ nēbi n'etiti cherubim; ka uwa me nkpatu.[2] Jehova di uku nime Zaion; Onye di elu ka Ọ bu kwa n'elu ndi nile di iche iche.[3] Ka ha kele aha-Gi nke di uku, nke anātu kwa egwu ya: Onye nsọ ka Ọ bu.[4] Ike nke eze nāhu kwa ezi ikpé n'anya; Gi onwe-gi emewo ka izi-ezi guzosie ike, Ezi ikpé na ezi omume ka Gi onwe-gi meworo nime Jekob.[5] Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, elu, Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di: Onye nsọ ka Ọ bu.[6] Moses na Eron n'etiti ndi-nchu-àjà-Ya, Samuel kwa n'etiti ndi nākpọku aha-Ya; Ha nākpọku Jehova, Ya onwe-ya we za ha.[7] N'ogidi igwe-oji ka Ọ nāgwa ha okwu: Ha debere ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru O nyere ha.[8] Jehova, bú Chineke-ayi, Gi onwe-gi zara ha: Chineke Nke nēbupu nmehie ka I buru ha, Ma I bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ omume nile ha,[9] Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ugwu nsọ Ya di; N'ihi na onye nsọ ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu.

DEUTERONOMI 29:18
ka nwoke, ma-ọbu nwayi, ma-ọbu ab͕uru, ma-ọbu ebo, we ghara idi n'etiti unu, nke obi-ya nēchigharí pua ta n'ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ije ifè chi nile nke mba ahu nile òfùfè; ka nkpọrọgwu nke nāmi ńsí na wormwood we ghara idi n'etiti unu;

ROM 12:1-2
[1] Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n'iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di.[2] Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè.

1 SAMUEL 15:22
Samuel we si, Àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ, hà nātọ Jehova utọ dika ige nti olu Jehova? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iṅa nti di nma kari abuba ebulu.

NKPUGHE 4:8-11
[8] Ihe anọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra nkù isi n'otù n'otù, ha juputa-kwa-ra n'anya anya gburugburu, ya na nime: ha adighi-ezu ike ehihie na abali, nāsi, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahu di, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye diri, Onye nādi kwa adi, Onye nābia kwa.[9] Mb͕e ọ bula ihe anọ ahu nke di ndu gēnye Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu otuto na nsọpuru na ekele, bú Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi,[10] orú ndi-okenye na anọ ahu gāda n'ala n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, ha gākpọ kwa isi ala nye Ya, bú Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, ha gātudà kwa okpu-eze-ha n'iru oche-eze ahu, nāsi,[11] Gi, Onye-nwe-ayi na Chineke-ayi, I kwesiri inara otuto nile na nsọpuru nile na ike nile: n'ihi na Gi onwe-gi kère ihe nile, ọ bu kwa n'ihi ọchichọ-Gi ka ha diri, ka ekè-kwa-ra ha èkè.

AISAIA 29:13
Onye-nwe-ayi we si, N'ihi na ndi nka abiaruwo nso n'ọnu-ha, were kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ha sọpurum, ma ha emewo ka obi-ha di anya n'ebe M'nọ, egwu ha nāturum ewe buru ihe madu nyere n'iwu nke emere ka ha muta:

ABÙ ỌMA 29:1-11
[1] Nyenu Jehova, unu umu Chineke, Nyenu Jehova nsọpuru na ike.[2] Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya; Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.[3] Olu Jehova di n'elu miri: Chineke nke ebube nāma éb͕è-elu-igwe, Jehova nọ n'elu ọtutu miri.[4] Olu Jehova nāda n'ike; Olu Jehova nāda n'ima-nma.[5] Olu Jehova nētiwa osisi cedar; Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon.[6] Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi; Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu.[7] Olu Jehova nāwaputa ire ọku.[8] Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu; Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu.[9] Olu Jehova nēme ka ime nēme nne-ele, Ọ nāb͕uchapu kwa akwukwọ osisi oké ọhia: Ọzọ n'ulo uku Ya ihe hile nāsi, Ebube.[10] Jehova nọduru n'oche-eze n'Iju-miri ahu; Jehova we nọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi.[11] Jehova gēnye ndi-Ya ike; Jehova gēji udo gọzie ndi-Ya.

HIBRU 12:28-29
[28] N'ihi nka, ebe ayi nānata ala-eze nke anāpughi ime ka o me nkpatu, ka ayi nwe amara, ka ayi we site na ya were egwu Chineke na ujọ kpe ekpere n'uzọ nke gātọ Chineke utọ:[29] n'ihi na Chineke-ayi bu ọku nērechapu.

NEHEMAIA 9:5-6
[5] Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile.[6] Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe nile, na usu-ha nile, na uwa na ihe nile nke di n'elu ya, na oké osimiri nile na ihe nile nke di nime ha, Gi onwe-gi nēdebe kwa ha nile ndu; usu ihe elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi.

ABÙ ỌMA 86:9-10
[9] Mba nile ndi I meworo gābia kpọ isí ala n'iru Gi, Onye-nwe-ayi; Ha gāsọpuru kwa aha-Gi.[10] N'ihi na onye uku ka I bu, I nālu kwa oké ọlu di iche iche: Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi.

2 EZE 17:38-39
[38] ma ọb͕ub͕a-ndu Mu na unu b͕ara, unu echezọla ya; unu atu-kwa-la egwu chi di iche iche ọzọ:[39] kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gātu egwu; Ya onwe-ya gānaputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu nile.

ABÙ ỌMA 100:1-5
[1] Tikusienu Johova nkpu ọṅù ike, uwa nile.[2] Werenu ọṅù fè Jehova òfùfè: Werenu iti-nkpu ọṅù bia n'iru Ya.[3] Maranu na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke: Ya onwe-ya emewo ayi, ọ bu kwa Ya nwe ayi; Ayi bu ndi-Ya, na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Ya.[4] Werenu ekele ba n'ọnu-uzọ-ama-Ya nile, Werenu otuto ba n'ogige-Ya nile: Kelenu Ya, gọzi-kwa-nu aha-Ya.[5] N'ihi na Jehova di nma; rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di; Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Ya di kwa.

DANIEL 3:16-18
[16] Shedrak na Mishak na Abed-nego zara, si eze, Nebukadneza, ọ dighi ayi onwe-ayi nkpà izaghachi gi okwu bayere nka.[17] Asi na ọ di uzọ ọ bula Chineke ahu Onye ayi onwe-ayi nēfè puru inaputa ayi, ọ bu n'oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu na n'aka-gi, eze, ka Ọ gānaputa ayi.[18] Ma asi na Ọ pughi inaputa ayi, ka i mara, eze, na chi-gi nile ka ayi nāgaghi-adi nēfè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo ahu nke i guzobeworo ọtọ ka ayi nāgaghi-akpọ isi ala nye.

NKPUGHE 14:7
ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n'ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006